Bible Explorer

Baịbụl › Abụ Ọma › 142

IGCB · Isi 142 / 150

Abụ Ọma 142

1Abụ maskil nke Devid. Mgbe ọ nọ nʼọgba nkume. Ekpere. Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa; ewelitara m olu m rịọ Onyenwe anyị ka o meere m ebere.

2Ekwupụtara m ihe na-esogbu m nʼihu ya, gwakwa ya ahụhụ nke m nọ nʼime ya.

3Mgbe mmụọ m dara mba nʼime m, ọ bụ gị maara ụzọ m. Nʼụzọ ebe m na-esi aga ka ndị mmadụ siiri m ọnya.

4Lee anya nʼaka nri m ma hụ na ọ dịghị onye ọbụla na-eche ihe banyere m. Enweghị m ebe mgbaba. Ọ dịghị onye ọbụla ihe banyere m na-emetụta nʼobi.

5Ana m etiku gị mkpu akwa, o Onyenwe anyị, na-asị, “Gị bụ ebe mgbaba m, oke m nʼala ndị dị ndụ.”

6Gee ntị na mkpu akwa m, nʼihi na anọ m nʼọnọdụ ihe isiike; gbapụta m site nʼaka ndị na-achụ m ọsọ, nʼihi na ha siri ike karịa m.

7Mee ka m nwere onwe m site nʼụlọ mkpọrọ, ka m nwee ike too aha gị. Mgbe ahụ ndị ezi omume ga-agba m gburugburu nʼihi ịdị mma gị nʼebe m nọ.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org