IGCB · Isi 116 / 150
Abụ Ọma 116
1Ahụrụ m Onyenwe anyị nʼanya, nʼihi na ọ nụrụ olu m; ọ nụrụ mkpu akwa m maka ebere.
2Nʼihi na o gere m ntị, aga m akpọku ya oge ndụ m niile.
3Agbụ nke ọnwụ kekọrọ m, oke ihe mgbu nke ili bịakwasịrị m; nsogbu na iru ụjụ dakwasịrị m.
4Mgbe ahụ, akpọkuru m aha Onyenwe anyị: “O Onyenwe anyị, zọpụta m!”
5Onyenwe anyị bụ onye na-eme ebere na onye ezi omume. Chineke anyị jupụtakwara nʼọmịiko.
6Onyenwe anyị na-echebe ndị na-enweghị uche; mgbe m nọ nʼọnọdụ mkpa, ọ zọpụtara m.
7Laghachi azụ zuru ike, gị mkpụrụobi m, nʼihi na Onyenwe anyị emesola gị mmeso ọma.
8Nʼihi na gị, o Onyenwe anyị, napụtara mkpụrụobi m site nʼọnwụ, anya m site na anya mmiri akwa, napụtakwa ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ,
9ka m nwee ike jegharịa nʼihu Onyenwe anyị nʼime ala ebe ndị dị ndụ bi.
10Ekwenyere m na Onyenwe anyị mgbe m kwuru sị, “Abụ m onye nọ nʼoke nsogbu,”
11nʼime ịda mba m, ekwuru m sị, “Mmadụ niile bụ ndị ụgha.”
12Gịnị ka m ga-enyeghachi Onyenwe anyị nʼihi mmeso ọma niile o mesoro m?
13Aga m eweli iko nke nzọpụta m elu kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.
14Nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ mezuo nkwa m kwere Onyenwe anyị.
15Ọnwụ nke ndị nsọ ya dị oke ọnụahịa nʼanya Onyenwe anyị.
16O Onyenwe anyị, nʼezie, abụ m ohu gị; abụ m ohu gị, nwa nwoke nke ohu gị nwanyị; ị zọpụtala m site na agbụ e kere m.
17Aga m achụrụ gị aja ekele kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.
18Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ kwụghachi Onyenwe anyị nkwa m kwere,
19nʼime ogige ụlọ Onyenwe anyị, nʼetiti gị, O Jerusalem. Toonu Onyenwe anyị.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org