Bible Explorer

Baịbụl › Abụ Ọma › 101

IGCB · Isi 101 / 150

Abụ Ọma 101

1Abụ Ọma Devid. Aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị na ikpe gị ziri ezi; o Onyenwe anyị, ọ bụ gị ka m ga-abụku abụ otuto.

2Aga m enwe uche ị hụ na m biri ndụ na-enweghị ịta ụta ọbụla, olee mgbe ị ga-abịakwute m? Aga m ejikwa obi nke a na-agaghị ata ụta ọbụla jegharịa nʼime ụlọ m.

3Agaghị m edo ihe jọgburu onwe ya nʼihu m. Ana m akpọ ọrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi asị. Agaghị m enwekwa oke nʼime ya.

4Ndị obi ha gbagọrọ agbagọ agaghị anọ m nso. Agakwaghị m etinye aka nʼọrụ ọjọọ ọbụla.

5Onye ọbụla na-ekwulu onye agbataobi ya na nzuzo, onye ahụ ka m ga-emechi ọnụ; agaghị m anabata onye ọbụla dị mpako ma nwee obi nganga.

6Aga m elekwasị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼala a anya, ka mụ na ha biri; onye ahụ na-eje ije na-enweghị ịta ụta ọbụla ga-ejere m ozi.

7Onye ọbụla na-aghọ aghụghọ agaghị ebi nʼụlọ m; onye ọbụla na-ekwu okwu ụgha agaghị eguzokwa nʼihu m.

8Ụtụtụ niile ka m na-eme ka ha dere duu bụ ndị ajọ omume niile nọ nʼala a; Aga m ebipụ ndị niile na-eme ajọ ihe site nʼobodo Onyenwe anyị.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org