IGCB · Isi 93 / 150
Abụ Ọma 93
1Onyenwe anyị bụ eze, ọ na-eyikwasị ịma mma dịka uwe; Onyenwe anyị na-eyikwasị ịma mma dịka uwe, ọ dịkwa ike nke ukwuu; nʼezie, ụwa niile na-eguzosikwa ike; apụghịkwa iwezuga ya nʼọnọdụ ya.
2Ocheeze gị eguzosiela ike siterị na mgbe ochie; ị na-adịkwa site nʼebighị ebi ruo ebighị.
3Oke osimiri niile amaliela elu, O Onyenwe anyị; oke osimiri niile eweliela olu ha elu; ebili mmiri niile nke oke osimiri na-amali elu na-eme mkpọtụ.
4Onyenwe anyị onye nọ nʼelu, dị ukwuu karịa mkpọtụ nke oke osimiri niile na-eme, ma karịakwa ụda nke ebili mmiri nke oke osimiri.
5Ụkpụrụ gị niile, Onyenwe anyị na-eguzosi ike; ịdị nsọ bụ ihe e ji chọọ ụlọ gị mma ruo ụbọchị na-enweghị ọgwụgwụ.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org