IGCB · Isi 70 / 150
Abụ Ọma 70
1Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke Devid. Arịrịọ. O Chineke, gbata ọsọ bịa zọpụta m, O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka.
2Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m, bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara. Ka ndị ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m laghachi azụ nʼihere.
3Ka ndị ahụ na-asị m, “Ehee! Ehee!” laghachi azụ nʼihi ihere ha.
4Ma ka ndị niile na-achọ gị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị, ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile, “ Onyenwe anyị dị ukwuu.”
5Ma mụ onwe m bụ ogbenye na onye nọ na mkpa; O Chineke, mee ngwangwa bịakwute m. Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m; O Onyenwe anyị, anọla ọdụ ịbịa.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org