Bible Explorer

Baịbụl › Abụ Ọma › 43

IGCB · Isi 43 / 150

Abụ Ọma 43

1O Chineke, kpepụta m, kpechitere m ikpe m nʼebe mba na-amaghị Chineke nọ; gbapụta m site nʼaka ndị ajọ omume na ndị aghụghọ.

2Ị bụ Chineke, ebe m e wusiri ike. Gịnị mere i ji jụ m? Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ, nʼihi mmegbu nke onye iro?

3Zipụ ìhè gị na eziokwu gị, ka ha duo m; ka ha kpọbata m nʼugwu nsọ gị, bụ ebe i bi.

4Mgbe ahụ, aga m aga nʼebe ịchụ aja Chineke, gakwuru Chineke, bụ ọṅụ m na obi ụtọ m. Aga m eji ụbọ akwara too gị, O Chineke, bụ Chineke m.

5O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? Nwee olileanya na Chineke, nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ, onye Nzọpụta m na Chineke m.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org