Bible Explorer

Baịbụl › Abụ Ọma › 141

IGCB · Isi 141 / 150

Abụ Ọma 141

1Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị; bịakwute m ọsịịsọ. Nụrụ olu m mgbe m na-akpọku gị.

2Ka ekpere m bịa nʼihu gị dịka ihe na-esi isi ụtọ; ka nchili elu nke m chịlịri aka m abụọ dịrị ka aja a na-achụ nʼanyasị.

3Nyere m aka ka m mechie ọnụ m, o Onyenwe anyị; na-echekwa egbugbere ọnụ m nche.

4Ekwela ka obi m nwee mmasị nʼihe ọjọọ, isonye ndị na-eme ihe ọjọọ rụọ ọrụ ajọ omume niile dị iche iche; ekwela ka m soro ha rikọọ ihe ụtọ ha niile.

5Ka onye ezi omume tie m ihe, nke a na-egosi obi ebere; ka ọ baara m mba, nke a bụ mmanụ nʼelu isi m. Isi m agaghị ajụ ya. Otu ọ dị, ekpere m na-emegide ọrụ niile nke ndị na-eme ihe ọjọọ.

6A ga-esite nʼelu nkume dị elu tụda ndị na-achị ha, mgbe ahụ, ndị ajọ omume ga-amata na okwu m niile bụ eziokwu.

7Ha ga-ekwu sị, “Dịka mmadụ na-egburi, na-akọgharị ala, otu a ka a ghasasịrị ọkpụkpụ anyị nʼọnụ ili.”

8Ma olileanya m dị na gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nʼime gị ka m gbabara izere ndụ, ararala m nyefee nʼaka ọnwụ.

9Napụta m ka m ghara ịdaba nʼime ọnya igbudu niile nke ndị na-eme ajọ ihe siiri, sitekwa nʼọnya niile ha siiri m.

10Ka ndị ajọ omume daba nʼime ụgbụ ha, ma mụ onwe m ga-agabiga na-emerụghị ahụ ọbụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org