IGCB · Isi 76 / 150
Abụ Ọma 76
1Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke eji ụbọ akwara akpọ. Abụ Ọma Asaf. Otu Abụ. A maara Chineke nʼobodo Juda; aha ya dị ukwuu nʼobodo Izrel.
2Ụlọ ikwu ya dị na Salem, ebe obibi ya dị na Zayọn
3Ebe ahụ ka o tijisịrị àkụ niile na-egbu amụma, na ọta niile, na mma agha niile, na ngwa agha niile. Sela
4Ị jupụtara nʼìhè, ị dị oke ebube karịa ọtụtụ ugwu nke anụmanụ jupụtara.
5A pụnarịla ndị nwere obi ike ihe ha, ha na-arahụkwa ụra ikpeazụ ha; o nweghị otu onye nʼime ndị dike nʼagha ndị a pụrụ iweli aka ya abụọ elu.
6Nʼihi ịba mba gị, O Chineke nke Jekọb, ịnyịnya na ụgbọ agha na-anọ juu.
7Ọ bụ naanị gị ka e kwesiri ịtụ egwu. Onye pụrụ iguzo nʼihu gị mgbe i na-ewe iwe?
8I sitere nʼeluigwe mee ka a nụ olu ikpe ikpe gị. Ụwa tụkwara egwu, dere duu,
9mgbe gị, O Chineke, biliri ikpe ikpe, ịzọpụta ndị niile a na-akpagbu nʼala a. Sela
10Nʼezie, oke iwe gị megide ụmụ mmadụ na-ewetara gị otuto, ndị fọdụrụ mgbe oke iwe gị gabigasịrị, na-anọ juu.
11Kwenụ Onyenwe anyị Chineke nkwa ma mezuokwa ha; ka ndị ala niile bụ agbataobi unu wetara onye ahụ e kwesiri ịtụ egwu onyinye dị iche iche.
12Ọ na-eweda ndị na-achị achị nʼala; ndị eze niile nke ụwa na-atụ ya egwu.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org