Bible Explorer

Baịbụl › Abụ Ọma › 77

IGCB · Isi 77 / 150

Abụ Ọma 77

1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Maka Jedutun. Abụ nke Asaf. Abụ Ọma. Etikuru m Chineke nʼoke olu maka enyemaka; etikuru m Chineke mkpu ka ọ nụrụ olu m.

2Mgbe m nọ nʼihe mgbu, ọ bụ Onyenwe anyị ka m chọrọ. Nʼanyasị, esetipụrụ m aka m abụọ, ike na-agwụghị, mmụọ m jụkwara ka a akasịe ya obi.

3O Chineke, echetara m gị, sụkwaa ude; echere m echiche, mkpụrụobi m dakwara mba. Sela

4I kweghị ka anya m abụọ mechie; nʼihi oke mwute m, enweghị m ike kwuo okwu.

5Echere m echiche banyere ụbọchị niile gara aga, na afọ niile ndị gara aga.

6Echetara m abụ niile m na-abụ nʼime anyasị. Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ntụgharị uche, mmụọ m jụkwara ajụjụ.

7“Onyenwe anyị ọ ga-agbakụta m azụ ruo mgbe ebighị ebi? Ọ pụtara na ọ gaghị egosi ihuọma ya ọzọ?

8Ọ pụtara na ịhụnanya ya nke na-adịgide ruo ebighị ebi agwụla? Ọ pụtara na nkwa ya agaghị emezu ruo ebighị ebi?

9Chineke, o chefuola i mere anyị ebere? O jichiela ọmịiko ya nʼihi iwe?” Sela

10Mgbe ahụ, ekwuru m, “Lee ọnọdụ ọjọọ m, afọ niile mgbe Onye kachasị ihe niile elu setịpụrụ aka nri ya.

11Aga m echeta ọrụ niile Onyenwe anyị rụrụ; e, aga m echeta ihe ịrịbama niile i mere nʼoge gara aga.

12Aga m atụgharịa uche m nʼọrụ gị niile, tuleekwa ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche.”

13O Chineke, ụzọ gị niile dị nsọ. Olee chi dị ukwuu dịka Chineke anyị?

14Ị bụ Chineke onye na-arụ ọrụ ebube dị iche iche; ị na-egosipụta ike gị nʼetiti ụmụ mmadụ.

15I ji aka gị dị ike gbapụta ndị gị, bụ ụmụ ụmụ Jekọb na Josef. Sela

16Osimiri hụrụ gị, O Chineke, osimiri hụrụ gị, taa; ogbu mmiri mere mkpọtụ.

17Igwe ojii wụpụrụ mmiri, mkpọtụ egbe eluigwe jupụtara mbara eluigwe; àkụ gị gburu amụma ebe niile.

18A nụrụ ụda egbe eluigwe gị nʼoke ifufe, amụma gị nyere ụwa niile ihe; elu ụwa niile mara jijiji, tụkwaa oke egwu.

19Ọ bụ nʼosimiri ka nzọ ụkwụ gị gara, ụzọ gị gara nʼetiti oke osimiri, ọ bụ ezie na ahụghị m nzọ ụkwụ gị anya.

20I sitere nʼaka Mosis na Erọn duo ndị gị dịka igwe atụrụ.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org