Bible Explorer

Baịbụl › Abụ Ọma › 129

IGCB · Isi 129 / 150

Abụ Ọma 129

1Abụ nrigo. Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge, ka Izrel kwuo.

2“Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge, ma ha enweghị ike merie m.

3Ndị ikom na-akọ ubi akọgharịala azụ m dịka ala ubi, mee ebe ha kọrọ akọ ka ọ dị ogologo.

4Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume; ọ tọpụla m site nʼagbụ niile nke ndị ajọ omume.”

5Ka ndị niile kpọrọ Zayọn asị bụrụ ndị ga-alaghachi azụ nʼihere.

6Ka ha niile dịrị ka ahịhịa na-epu nʼelu ụlọ nke na-akpọnwụ tupu o pupụta;

7nke onye na-ewe ihe ubi na-adịghị eji ha kpojuo aka ya abụọ, maọbụ onye mkpokọta e nwee ike kpojuo aka ya.

8Ka ndị si nʼụzọ na-agafe hapụ ị sị ha, “Ngọzị Onyenwe anyị dịrị unu. Anyị na-agọzi unu nʼaha Onyenwe anyị.”

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org