Bible Explorer

Baịbụl › Abụ Ọma › 108

IGCB · Isi 108 / 150

Abụ Ọma 108

1Abụ, Abụ Ọma Devid. Obi m dị njikere, o Chineke; aga m eji mkpụrụobi m niile bụọ abụ ma kụkwaa egwu.

2Teta! Ụbọ akwara na une! Aga m akpọte chi ọbụbọ.

3Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼetiti mba niile; aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche.

4Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu karịa eluigwe; ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe.

5Ka e bulie gị elu, o Chineke, karịa eluigwe niile, ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.

6Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka, ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya.

7Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị, “Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem, tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ, nyepụ ya.

8Gilead bụ nke m, Manase bụkwa nke m; Ifrem bụ okpu igwe m, Juda bụ mkpara eze m.

9Moab bụ efere ịkwọ aka m, aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.”

10Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike? Onye ga-edu m gaa Edọm?

11Ọ bụghị gị, o Chineke? Gị onye jụrụ anyị, onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?

12Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro, nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu.

13Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri, ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org