Bible Explorer

Baịbụl › Abụ Ọma › 11

IGCB · Isi 11 / 150

Abụ Ọma 11

1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Nʼime Onyenwe anyị ka m mere ebe mgbaba m. Gịnị mere i ji na-agwa m okwu sị, “Felagaa nʼelu ugwu gị dịka nnụnụ.”

2Nʼihi na ndị ajọ omume ekweela ụta ha; ha edoziela àkụ nʼelu eriri ụta ha, zoo onwe ha nʼakụkụ ụzọ, ịnọ nʼọchịchịrị, gbaa ndị obi ha ziri ezi ụta.

3Mgbe a na-ebibi ntọala niile, gịnị ka ndị ezi omume pụrụ ime?

4Onyenwe anyị nọ nʼụlọnsọ ukwuu ya; Onyenwe anyị nọkwa nʼelu ocheeze ya dị nʼeluigwe. Ọ na-ahụzu ihe niile ụmụ mmadụ na-eme; anya ya na-anwalekwa ụzọ ha.

5Onyenwe anyị na-ele onye ezi omume ule, ma onye ajọ omume na ndị niile hụrụ imebi iwu nʼanya, ka ọ na-akpọ asị nke ukwuu.

6Ọ ga-eme ka nkume ọkụ zokwasị ndị ajọ omume dịka mmiri ozuzo; oke ifufe dị ọkụ ga-abụ ihe nketa ha.

7Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ezi omume, ọ hụkwara ikpe ziri ezi nʼanya; ndị ezi omume niile ga-ahụkwa ihu ya anya.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org