Bible Explorer

Baịbụl › Abụ Ọma › 94

IGCB · Isi 94 / 150

Abụ Ọma 94

1O Onyenwe anyị, Chineke onye na-abọ ọbọ, o Chineke, onye na-abọ ọbọ, zipụta onwe gị.

2Bilie, o Onye Ikpe nke ụwa; kwụghachi ndị nganga ụgwọ ọrụ ruuru ha.

3Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe? Ọ bụ ruo ole mgbe ka ndị na-eme ajọ omume ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ?

4Ha na-ekwuwapụ okwu mpako; ndị niile na-eme ajọ ihe jupụtara nʼitu ọnụ.

5Ha na-azọpịa ndị gị, O Onyenwe anyị; ha na-emegbu ihe nketa gị.

6Ha na-egbu ndị di ha nwụrụ na ndị ọbịa; ha na-egbu ndị na-enweghị nna.

7Ha na-asị, “ Onyenwe anyị anaghị ahụ ihe ndị a; Chineke Jekọb na-agba nkịtị.”

8Lezienụ anya, unu ndị amamihe kọrọ nʼetiti ndị m; unu ndị nzuzu, olee mgbe unu ga-amụta ihe?

9Ọ pụtara na onye kpụrụ ntị anaghị anụ ihe? Ọ pụtara na onye kere anya anaghị ahụ ụzọ?

10Ọ pụtara na onye na-adọ mba niile aka na ntị agaghị ata ha ahụhụ? Ọ pụtara na onye na-ezi mmadụ ihe enweghị ihe ọmụma?

11Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ; ọ maara na ihe mmadụ na-eche nʼobi ya bụ naanị ihe na-enweghị isi.

12Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye ị na-adọ aka na ntị, O Onyenwe anyị, onye ahụ ị na-akụziri ihe site nʼiwu gị;

13ị na-enye ya izuike site nʼụbọchị nsogbu; tutu ruo mgbe a ga-egwuru ndị ajọ omume olulu.

14Nʼihi na Onyenwe anyị agaghị ajụ ndị ya; ọ gaghị agbakụta ihe nketa ya azụ.

15Ezi omume ga-abụ ntọala ikpe ikpe niile; ndị niile ndị ziri ezi nʼobi ga-agbasokwa ya.

16Onye ga-ebiliri m imegide ndị ajọ omume? Onye ga-eguzo nʼọnọdụ m imegide ndị na-eme ajọ ihe?

17A sị na Onyenwe anyị abịaghị nyere m aka, agaara m rịị abụ onye nwụrụ anwụ.

18Mgbe m kwuru sị, “Ụkwụ m na-agbuchapụ,” ọ bụ ịhụnanya gị, O Onyenwe anyị, kwagidere m.

19Mgbe oke nchekasị obi batara nʼime m, nkasiobi gị wetara mkpụrụobi m ọṅụ.

20A ga-ejikọta gị na ocheeze ọchịchị ya rụrụ arụ, nke na-eweta mmekpa ahụ site nʼiwu ya?

21Ndị ajọ omume na-ejikọta onwe ha imegide ndị ezi omume na-amakwa ndị aka ha dị ọcha ikpe ọnwụ.

22Ma Onyenwe anyị a bụrụla ebe mgbaba e wusiri ike nye m, na Chineke m na oke nkume ebe m na-ezere ndụ.

23Ọ ga-akwụghachi ha ụgwọ ọrụ kwesiri mmehie ha, lakwaa ha nʼiyi nʼihi ajọ omume ha; Onyenwe anyị Chineke anyị ga-ala ha nʼiyi.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org