Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Okoko lili na ahịhịa

Okike

Okoko lili na ahịhịa nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (35), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

Okoko lili

  • Isi ogidi nke mgbe ụlọnsọ yiri okoko lili1Ez 7:19, 1Ez 7:22
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 7:19Ihe ọkpụkpụ ọla ndị dị nʼelu ogidi dị na mgbe ụlọ ka o mere ka ha yie okoko osisi lili. Ịdị elu ha ruru otu mita na ụma asatọ.
    1Ez 7:22Ihe ọkpụkpụ ọla dị nʼelu ogidi ndị a bụ nke yiri okoko osisi lili. Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka e si rụzuo ọrụ niile metụtara ogidi ndị ahụ.
  • Ọnụ Oke Osimiri bronz ahụ dị ka okoko lili1Ez 7:26, 2Ih 4:5
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 7:26Ịdị arọ ya ha ka otu ọtụtụ ntu-aka dimkpa. E mere ọnụ ya ka ọ dị ka ọnụ iko mmiri, dịkwa ka okoko lili na-awapụta awapụta. Ọ na-erite puku galọọnụ iri na abụọ.
    2Ih 4:5Ịdị arọ ya ha ka otu ọtụtụ ntu-aka dimkpa. E mere ọnụ ya ka ọ dị ka ọnụ iko mmiri, dịkwa ka okoko lili na-awapụta awapụta. Ọ na-erite puku galọọnụ iri na asatọ.
  • “Tuleenụ otu okoko ọhịa lili si eto. Ha adịghị arụ ọrụ ọbụla maọbụ tụọ ogho”Mat 6:28, Luk 12:27
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 6:28“Gịnị mekwaranụ unu ji na-anọ nʼechiche oge niile maka uwe? Leenụ okoko osisi nke ọhịa. Ha adịghị arụ ọrụ maọbụ dọgbuo onwe ha nʼọrụ.
    Luk 12:27“Tuleenụ otu okoko ọhịa lili si eto. Ha adịghị arụ ọrụ ọbụla maọbụ tụọ ogho. Ma asị m unu, ọ bụladị Solomọn nʼebube nke ịbụ eze ya niile, eyighị uwe ọbụla mara mma dị ka otu nʼime okoko osisi nke ọhịa ndị a.
  • Ọ bụladị Solomọn nʼebube ya niile eyighị uwe mara mma dị ka otu nʼime haMat 6:29
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 6:29Ma asị m unu, ọ bụladị Solomọn nʼebube nke ịbụ eze ya niile, eyighị uwe ọbụla mara mma dị ka otu nʼime okoko osisi nke ọhịa ndị a.
  • Onye ọzụzụ atụrụ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodiAbụk 2:16, Abụk 6:3
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụk 2:16Onye m hụrụ nʼanya bụ nke m, mụ onwe m bụkwa nke ya. Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi,
    Abụk 6:3Abụ m nke onye m hụrụ nʼanya, onye m hụrụ nʼanya bụkwa nke m. Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi.
  • Onye a hụrụ nʼanya gara nʼubi ya ịchịkọta okoko liliAbụk 6:2
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụk 6:2Ọ gara nʼubi ya a gbara ogige, nʼebe ihe ndina ya nke e fesara ụda na-esi isi ụtọ, ijegharị nʼetiti okoko urodi, na ịchịkọta okoko lili.
  • “okoko lili nke na-epu na ndagwurugwu … dịka okoko lili nke na-epu nʼetiti ogwu”Abụk 2:1–2
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụk 2:1–2Abụ m okoko osisi ọhịa nke Sharọn, na okoko lili nke na-epu na ndagwurugwu. E, dịka okoko lili nke na-epu nʼetiti ogwu, otu a ka ọmasịrị m dị nʼetiti ụmụ agbọghọ ndị ọzọ.
  • “Egbugbere ọnụ ya dị ka okoko urodi, nke na-agbụsị mmanụ máá”Abụk 5:13
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụk 5:13Nti ya abụọ dị ka ihe ndina ụda nke jupụtara na mmanụ isi ụtọ. Egbugbere ọnụ ya dị ka okoko urodi, nke na-agbụsị mmanụ máá.
  • Ụmụ mgbada abụọ, nke otu nne mụrụ nʼotu oge, na-ata nri nʼetiti okoko urodiAbụk 4:5
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụk 4:5Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ, nke otu nne mụrụ nʼotu oge, ndị na-ata nri nʼetiti okoko urodi.

Ahịhịa

  • Ahịhịa na-eto maka anụ ụlọ na nʼelu ugwuAbụ 104:14, Abụ 147:8, Dit 11:15
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 104:14Ọ na-eme ka ahịhịa puputara anụ ụlọ, na-emekwa ka ihe a kụrụ nʼala puoro mmadụ nʼubi ya, ime ka nri site nʼala pupụta;
    Abụ 147:8Ọ na-eji igwe ojii na-ekpuchi mbara eluigwe; ọ na-ewetara elu ụwa mmiri ozuzo na-eme ka ahịhịa puo nʼelu ugwu niile.
    Dit 11:15Ọ ga-eme ka anụ ụlọ gị nwee ahịhịa ha ga-ata, gị onwe gị ga-enwekwa ihe oriri dị ukwuu. Afọ ga-ejukwa gị nʼihe i nwere.
  • Mmiri ozuzo nʼelu ala ubi a sụrụ asụAbụ 72:6
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 72:6Ọ ga-adị ka mmiri na-ezokwasị ala ubi a sụrụ asụ, dịka mmiri ozuzo na-ede elu ala.
  • Ahịhịa nʼelu ụlọ na-akpọnwụ tupu o tooAbụ 129:6–7, 2Ez 19:26
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 129:6–7Ka ha niile dịrị ka ahịhịa na-epu nʼelu ụlọ nke na-akpọnwụ tupu o pupụta; nke onye na-ewe ihe ubi na-adịghị eji ha kpojuo aka ya abụọ, maọbụ onye mkpokọta e nwee ike kpojuo aka ya.
    2Ez 19:26Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere bụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere. Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubi na ome na-epupụta epupụta nakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọ nke anwụ na-achakpọ tupu o tolite.
  • Ahịhịa ubi: ọ dị taa, echi a tụba ya nʼite ọkụMat 6:30, Luk 12:28
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 6:30Ma ọ bụrụ na Chineke si otu a chọọ ahịhịa efu nke ubi mma, nke pụrụ ịdị ndụ taa ma echi atụba ha nʼite ọkụ, ọ bụ na ọ gaghị a chọọ unu mma karịa. Unu ndị okwukwe nta?
    Luk 12:28Ma ọ bụrụ na Chineke si otu a chọọ ahịhịa efu nke ubi mma, nke pụrụ ịdị ndụ taa ma echi atụba ha nʼite ọkụ, ọ bụ na ọ pụghị i si otu a chọọ unu mma karịa? Unu ndị okwukwe nta.
  • Mgbe e gbupụchara ahịhịa ochie, nke ọhụrụ na-epupụtaIlu 27:25
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 27:25Mgbe e gbupụchara ahịhịa ochie, nke ọhụrụ na-epupụta, mgbe ahụ ka a na-achịkọbata ahịhịa sị nʼugwu.
  • Anwụ na-ekpo ọkụ na-eme ka ahịhịa kpọnwụọ, okoko ya adaaJem 1:11
    Amaokwu ndị ahụ
    Jem 1:11Nʼihi na mgbe ọbụla anwụ waliri chasie ike, wepụta okpomọkụ, ọ na-eme ka ahịhịa kpọnwụọ, ka okoko osisi daa nʼala, mma ya agwụsịakwa. Nʼotu aka ahụ, onye ahụ bara ụba ga-akpọnwụ ọ bụladị mgbe ọ na-ejegharị nʼime ije ozi ya.
  • Nʼoge ụkọ mmiri, Ehab chọgharịrị isi iyi na ndagwurugwu niile maka ahịhịa ịnyịnya1Ez 18:5
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 18:5Ehab kpọrọ Ọbadaya sị ya, “Jegharịa nʼala a niile nyochapụta na ndagwurugwu na isi iyi niile, ebe ahịhịa ndụ dị. Gbutere ịnyịnya na ịnyịnya muul m ahịhịa ahụ ka ha taa ghara ịnwụ, ka anyị gharakwa igbu ha.”
  • Mmiri Nimrim tachara, ahịhịa kpọnwụọAịz 15:6
    Amaokwu ndị ahụ
    Aịz 15:6Mmiri Nimrim atachaala! Ahịhịa akpọnwụọkwala; ahịhịa ndụ niile agwụkwala o nwekwaghị akwụkwọ ndụ nke fọrọ.
  • Enyi mmiri na-ata ahịhịa dịka ehiJob 40:15
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 40:15“Lee enyi mmiri anya, bụ nke m kere dịka m si kee gị, ma ihe ọ na-eri bụ ahịhịa dịka ehi.
  • Nebukadneza tara ahịhịa dịka oke ehiDan 4:33
    Amaokwu ndị ahụ
    Dan 4:33Nʼotu oge ahụ kwa, okwu ndị a e kwuru banyere Nebukadneza mezuru. E sitere nʼetiti ụmụ mmadụ chụpụ ya, ọ gakwara nʼọhịa taa ahịhịa dịka oke ehi, igirigi nke eluigwe dekwara ahụ ya ruo mgbe ajị dị ya nʼahụ toro ogologo dịka nku ugo, mbọ ụkwụ na aka ya dịkwa ka mbọ ụmụ nnụnụ.
  • “Ịnyịnya ibu ọhịa ọ na-akwa akwa mgbe o nwere ahịhịa ọ na-ata”Job 6:5
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 6:5Ịnyịnya ibu ọhịa ọ na-akwa akwa mgbe o nwere ahịhịa ọ na-ata, ka oke ehi ọ na-akwa akwa mgbe ihe oriri ya dị?
  • Puku mmadụ ise ahụ nọdụrụ ala nʼelu ahịhịa ndụJọn 6:10, Mak 6:39
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 6:10Jisọs sịrị, “Meenụ ka ndị mmadụ ndị a nọdụ ala.” E nwere ọtụtụ ahịhịa nʼebe ahụ, ụmụ nwoke nọdụrụ ala, ha dị ihe ruru puku mmadụ ise.
    Mak 6:39Mgbe ahụ o nyere ha iwu ka ha mee igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼotu nʼotu nʼelu ahịhịa ndụ.

Okwu

  • “Mmadụ niile dị ka ahịhịa … ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ”Aịz 40:6–8, 1Pt 1:24
    Amaokwu ndị ahụ
    Aịz 40:6–8Olu ahụ sịrị, “Tie mkpu!” Ma ajụrụ m sị, “Gịnị ka m ga-eti?” “Mmadụ niile dị ka ahịhịa, ikwesi ntụkwasị obi ha niile dịkwa ka okoko osisi ọhịa. Ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ, nʼihi nʼokuku ume nke Onyenwe anyị na-ekukwasị ya. Nʼezie, ahịhịa ka ndị mmadụ bụ. E, ahịhịa na-akpọnwụ, okoko na-achanwụkwa, ma okwu Chineke anyị na-eguzogide ruo mgbe ebighị ebi.”
    1Pt 1:24Nʼihi na, “Mmadụ niile dị ka ahịhịa, ma ebube ha niile dị ka okoko osisi nke ọhịa, ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ,
  • Ahịhịa ọhụrụ na-epupụta nʼisi ụtụtụ, kpọnwụọ nʼanyasịAbụ 90:5–6
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 90:5–6Nʼime ụra nke ọnwụ ka ị na-ekpochapụ mmadụ; ha dịka ahịhịa ọhụrụ nke na-epupụta nʼisi ụtụtụ, ọ bụ ezie na ọ na-agbawa ụzarị na-etokwa eto nʼụtụtụ, ma nʼanyasị, ọ na-akpọnwụ ma-achanwụkwaa.
  • Ụbọchị mmadụ dị ka ahịhịa; ifufe gafere ya, ọ dịkwaghịAbụ 103:15–16
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 103:15–16Ebe mmadụ nọ, ụbọchị ya niile dị ka ahịhịa, ọ na-etopụta, na-awasa dịka okoko osisi ọhịa, ifufe na-efesi ya ike, ọ na-adakwa, adịghị echetakwa ya nʼọnọdụ mbụ ya.
  • Okwu na-ada dịka igirigi, dịka nshansha mmiri nʼelu ahịhịa ọhụrụDit 32:2
    Amaokwu ndị ahụ
    Dit 32:2Ka okwu m daa dịka mmiri ozuzo ka okwu m daa dịka igirigi, ka ọ daa dịka nshansha mmiri nʼelu ahịhịa, dịka oke mmiri ozuzo nʼahịhịa na-epupụta epupụta.

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.