IGCB · Isi 21 / 31
Ilu 21
1Iyi dị iche iche nke jupụtara na mmiri ka obi eze bụ nʼaka Onyenwe anyị, nke ọ na-ahazi nʼụzọ ọbụla dị ya mma.
2Ọrụ niile bụ ihe ziri ezi nʼanya onye na-arụ ya, ma Onyenwe anyị bụ onye na-eleba anya nʼechiche obi anyị niile.
3Ime ezi omume na ihe ziri ezi ka Onyenwe anyị na-anabata karịa ịchụ aja.
4Nganga na mpako na agụụ ihe ọjọọ nke bụ ọrụ ndị ajọ omume, bụ mmehie.
5Echiche niile nke onye na-arụsị ọrụ ike na-eweta uru, dịka echiche onye ome ngwangwa na-enweta naanị ụkọ.
6Uru niile enwetara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị adịgide, ha bụ nkuume ifufe na-efesa, ndị na-achọ ya na-achọ ọnwụ.
7Nʼihi na ndị na-emebi iwu anaghị eme ihe ọma, ihe ọjọọ ha na-eme na-alaghachi laa ha nʼiyi.
8Ụzọ onye na-emebi iwu bụ ihe gbagọrọ agbagọ, ma omume onye aka ya dị ọcha ziri ezi.
9Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ karịa ibinyere nwanyị na-ese okwu.
10Ihe na-atọ onye ọjọọ ụtọ bụ imerụ ndị ọzọ ahụ; ọ maghị imere mmadụ ibe ya ebere.
11Mgbe a na-ata onye na-akwa emo ahụhụ, onye na-enweghị uche na-enweta amamihe, ma mgbe a na-akụziri onye maara ihe ihe ọ na-enweta ihe ọmụma.
12Onye ezi omume na-amụta ihe site nʼile ụlọ onye ajọ omume anya na-emekwa ka ndị ajọ omume laa nʼiyi.
13Onye na-adịghị ege ntị na mkpu onye ogbenye, ya onwe ya ga-akpọkwa mkpu ma agaghị aza ya.
14Onyinye enyere na nzuzo na-eme ka iwe dajụọ, otu a kwa, ngarị ezonyere nʼime uwe na-eme ka oke ọnụma dajụọ.
15Onye ezi omume na-aṅụrị ọṅụ mgbe e kpere ikpe ziri ezi, ma bụrụ ihe oke egwu dịrị ndị na-eme ajọ ihe.
16Onye ọbụla si nʼụzọ nghọta wezuga onwe ya ga-eso nʼotu ndị nwụrụ anwụ.
17Nwoke hụrụ ibi ndụ nganga nʼanya na-ada ụkpa; ịṅụ mmanya na oke oriri abụghị ụzọ esi akpata akụ.
18Onye ajọ omume ga-abụ ihe mgbapụta maka onye ezi omume, onye aghụghọ ga-abụkwa ihe mgbapụta maka onye ndụ ya ziri ezi.
19Ọ ka mma ibi nʼọzara karịa ibinyere nwanyị na-atamu ntamu na-esekwa okwu.
20Onye maara ihe na-edebe ezi ihe oriri na mmanụ oliv nʼụlọ ya, ma onye nzuzu na-eloda ihe niile nʼọnụ ya.
21Onye na-achụso ezi omume na ịhụnanya ga-achọta ndụ, na ugwu na ọganihu.
22Onye maara ihe nwere ike megide obodo ndị dike, kwatuokwa ebe ewusiri ike nke ha tụkwasịrị obi ha.
23Onye na-echekwa ire ya na ọnụ ya na-egbochiri onwe ya ọdachi.
24Onye nganga na onye mpako, onye na-akwa emo bụ aha ya. Ọ na-eji oke nganga eme ihe niile.
25Oke ọchịchọ nke onye umengwụ na-ewetara ya ọnwụ nʼihi na ọ jụrụ ịrụ ọrụ.
26Kwa ụbọchị ka ọ na-achọ inwe karịa, ma onye ezi omume na-enye na-akpaghị oke.
27Chineke kpọrọ aja ndị na-emebi iwu asị, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ha na-enye onyinye a site na nzube ọjọọ.
28Onyeama ụgha ga-ala nʼiyi, ma onye ọbụla na-ege ya ntị ka a ga-ebibi ruo ebighị ebi.
29Ndị ajọ omume na-ebi ndụ atụghị egwu, ma ndị omume ha ziri ezi na-atụgharị uche nʼụzọ ha niile.
30O nweghị amamihe dị, o nweghị nghọta dị, o nwekwaghị atụmatụ ọbụla, nke pụrụ iguzosi ike megide Onyenwe anyị.
31E nwere ike jikere ịnyịnya, kwadokwaa maka agha, maọbụ naanị Onyenwe anyị na-enye mmeri.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org