Bible Explorer

Baịbụl › Job › 18

IGCB · Isi 18 / 42

Job 18

1Mgbe ahụ Bildad onye Shua zara sị:

2“Ruo ole mgbe ka ị ga-ekwubi okwu ndị a ị na-ekwu? Nwee ezi uche ka anyị kparịtaa ụka.

3Gịnị mere i ji were anyị dịka anụ ọhịa, gụọ anyị dịka ndị na-enweghị uche nʼanya gị?

4Gị onye na-eji iwe adọkasị onwe gị, a ga-ahapụ ụwa nʼihi gị? Ka a ga-enupu oke nkume nʼọnọdụ ha?

5“A na-afụnyụ oriọna nke onye na-emebi iwu; ire ọkụ ya ga-akwụsịkwa inwu enwu,

6ìhè nke dị nʼime ụlọ ikwu ya na-abụ ọchịchịrị, oriọna nke dị nʼakụkụ ya na-anyụkwa.

7Ike agakwaghị adị na nzọ ukwu ya; atụmatụ ya onwe ya ga-atụda ya nʼala.

8Ụkwụ ya na-eduba ya nʼọnya; ọ na-akpagharị na-adaba nʼime oghere.

9Ọnya na-ejide ikiri ụkwụ ya, ọnya ahụ na-ejidesi ya ike.

10E zobere ya ụdọ ọnya igbudu nʼala, ihe e ji ejide ya na-echere ya nʼụzọ ya.

11Ihe egwu na-emenye ya ụjọ nʼakụkụ niile, na-agbasokwa nzọ ụkwụ ya niile.

12Ịla nʼiyi na-achọsi ya ike; mbibi nọkwa na njikere na-eche mgbe ọ ga-ada.

13Mbibi na-eripịa akụkụ anụ ahụ ya; ọkpara ọnwụ na-eripịa ahụ ya niile.

14Esi na nchekwa nke ụlọ ikwu ya dọpụta ya duru ya jekwuru eze nke ihe egwu niile.

15Ọkụ na-ebi nʼime ụlọ ikwu ya; a ga-efesasị nkume na-enwu ọkụ nʼebe obibi ya.

16Mgbọrọgwụ ya na-akpọ nkụ nʼime ala, alaka ya ga-akpọnwụ nʼelu.

17A gaghị echeta echiche ya nʼụwa ọzọ, o nweghị onye ọbụla na-echetakwa aha ya.

18A na-esite nʼìhè chụba ya nʼọchịchịrị, otu a kwa, a na-achụpụkwa ya site nʼụwa.

19O nweghị ụmụ, o nwekwaghị ụmụ ụmụ nʼetiti ndị ya, ọ dịghị onye fọdụrụ nʼebe o bi na mbụ.

20Ọnọdụ ya na-eju ndị si nʼọdịda anyanwụ anya; oke egwu na-ejidekwa ndị si nʼọwụwa anyanwụ nʼihi ya.

21Nʼezie, otu a ka ebe obibi nke onye ajọ omume dị, ee, bụ onye ahụ nke na-amaghị Chineke.”

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org