Ụlọ › Ihe Baịbụl kwuru › Inwe obi ekele
Mmetụta
Ihe Baịbụl kwuru banyere Inwe obi ekele
Amaokwu ndị na-agụ ya na-elekarị anya maka isiokwu a (15), e hotara ha nʼuju site na Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a.
1Te 5:18
Na-enyenụ ekele mgbe niile banyere ihe niile, nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs.Efe 5:20
Na-enyenụ Chineke bụ Nna ekele mgbe niile na nʼihe niile, nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.Kọl 3:15
Ka udo Kraịst na-achị achị nʼime obi unu, ebe unu bụ akụkụ nke otu anụ ahụ ahụ, a kpọrọ unu ka unu nọdụ nʼudo. Mgbe niile, nọọnụ na-ekele.Abụ 107:1
Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma; ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.Abụ 106:1
Toonu Onyenwe anyị. Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma; Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.Jem 1:17
Onyinye ọbụla dị mma, na nke zuruoke na-esite nʼeluigwe abịa. Ọ na-esite nʼebe Nna nke ìhè niile onye na-adịghị agbanwe agbanwe, ọ naghị ezonarị ụmụ mmadụ ihu ya.Abụ 100:4
Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya jiri otuto baa nʼogige ya; keleenụ ya, tookwa aha ya.Fil 4:6
Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke.Kọl 3:17
Ka ihe niile unu na-eme, nʼokwu maọbụ nʼomume bụrụ nke e mere na nke e kwuru site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs, na-enyekwanụ Chineke Nna ekele site na ya.Kọl 4:2
Na-anọgidenụ nʼekpere, nọọkwanụ na nche na-enyekwanụ ekele.Abụ 118:24
Nke a bụ ụbọchị Onyenwe anyị anyị mere, ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime ya.Abụ 136:1
Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.1Ih 16:34
Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.Abụ 69:30
Aga m eji ịbụ abụ too aha Chineke, jirikwa ekele bulie ya elu.Abụ 28:7
Onyenwe anyị bụ ike m na ọta m; ana m atụkwasị ya obi m, si otu a bụrụ onye a na-enyere aka. Obi m na-awuli elu nʼihi ọṅụ, aga m ejikwa abụ m na-eto ya.Ndị a bụ amaokwu ndị na-agụ na-achọkarị maka isiokwu a — ọ bụghị nkuzi banyere ya. Gụọ nke ọ bụla n'isiakwụkwọ ya.
Isi mmalite
Amaokwu nke isiokwu ọ bụla na usoro ha: data isiokwu nke OpenBible.info, dịka votu ndị na-agụ ya si dị: OpenBible.info · CC BY 4.0
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.