Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Ọgba nkume

Okike

Ọgba nkume nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (30), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

Ebe mgbaba na ebe nzuzo

  • Lọt na ụmụ ya ndị inyom abụọ biri nʼọgba nkume nʼugwuJen 19:30
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 19:30Emesịa, Lọt na ụmụ ya ndị inyom abụọ hapụrụ obodo Zoa, nʼihi na ọ tụrụ egwu ibi nʼime Zoa. Ọ gara biri nʼime ọgba nkume ya na ụmụ ya ndị inyom abụọ.
  • Ịlaịja nọrọ abalị nʼọgba nkume na Horeb1Ez 19:8–9
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 19:8–9Ịlaịja biliri rie ihe, ṅụọkwa mmiri. Nri ahụ nyere ya ike ije ije iri ụbọchị anọ ọzọ, ehihie na abalị, tutu ruo mgbe ọ bịaruru nʼugwu Horeb nke bụ ugwu Chineke. Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼotu ọgba nkume rahụ ụra abalị nʼime ya. Ma okwu Onyenwe anyị rutere ya sị, “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme nʼebe a?”
  • O ji uwe mwụda ya kpuchie ihu ya, guzo nʼọnụ ọgba nkume ahụ1Ez 19:13
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 19:13Mgbe Ịlaịja nụrụ ya, o ji uwe mwụda ya kpuchie ihu ya, pụọ gaa guzo nʼọnụ ụzọ ọgba nkume ahụ. Mgbe ahụ, ọ nụrụ olu jụrụ ya sị, “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme nʼebe a?”
  • Ndị eze ise zoro nʼọgba nkume dị na MakedaJos 10:16–17
    Amaokwu ndị ahụ
    Jos 10:16–17Ma nʼoge ahụ a na-alụ agha ahụ, ndị eze ise ahụ si nʼọgbọ agha gbapụ, zoo onwe ha nʼime ọgba nkume dị na Makeda. Mgbe ozi ruru Joshua ntị, na a chọtala eze ise ndị ahụ, ebe ha zoro onwe ha nʼime ọgba nkume dị na Makeda,
  • Joshua mere ka a kpụgharịa nkume buru ibu mechie ọnụ yaJos 10:18
    Amaokwu ndị ahụ
    Jos 10:18Joshua nyere iwu sị, “Werenụ nkume buru ibu mechie ọnụ ọgba nkume ahụ. Debekwanụ ndị nche nʼebe ahụ, ka ha chee ndị eze ahụ nche.
  • E mesịa, nkume ndị ahụ nọgidere nʼọnụ ọgba ahụ “ruo taa”Jos 10:27
    Amaokwu ndị ahụ
    Jos 10:27Ma mgbe anwụ bidoro ịda, Joshua nyere iwu ka e site nʼosisi wedata ozu ndị eze ise ahụ, tụba ha nʼime ọgba nkume ahụ, ebe ha zoro onwe ha. Ha ji nkume dị ukwuu mechie ọnụ ọgba nkume ahụ. Nkume ukwuu ahụ dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.
  • Ndị Izrel zoro nʼọgba nkume, nʼoke ọhịa, nʼetiti nkume, nʼolulu na nʼime ala1Sa 13:6
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 13:6Mgbe ndị agha Izrel hụrụ na ọnọdụ ha dị njọ nke ukwuu, hụkwa na ndị iro na-emegide ha, ha zoro onwe ha nʼọgba nkume, nʼime oke ọhịa, nʼetiti nkume, nʼime olulu na nʼime oghere ọbụla.
  • Ndị Filistia: “Lee, ndị Hibru esitela nʼọnụ ebe ha zoro na-arịpụta”1Sa 14:11
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 14:11Ya mere, ha abụọ guzoro ebe ndị Filistia ga-ahụ ha. Mgbe ndị Filistia hụrụ ha, ha tiri mkpu sị, “Lee, ndị Hibru esitela nʼọnụ ebe ha zoro na-arịpụta.”
  • Ọbadaya zoro narị ndị amụma, iri ise nʼotu ọgba, nye ha nri na mmiri1Ez 18:4, 1Ez 18:13
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 18:4Mgbe eze nwanyị bụ Jezebel na-egbu ndị amụma Onyenwe anyị chọọ igbuchapụ ha, ọ bụ Ọbadaya zoro narị ndị amụma nʼime ha nʼime ọgba nkume. O zoro iri ndị amụma ise nʼotu ọgba nkume, zookwa iri ndị amụma ise fọdụrụ nʼime ọgba nkume ọzọ. Emesịa, ọ na-ewegara ha nri na mmiri nʼebe ahụ.)
    1Ez 18:13Ọ bụ na onyenwe m anụghị ihe m mere mgbe Jezebel nọ na-egbu ndị amụma Onyenwe anyị? E zoro narị ndị amụma Onyenwe anyị nʼime ọgba nkume abụọ, iri ise nʼime otu ọgba nkume, iri ise nʼime otu ọgba nkume ka m zoro ha, jirikwa nri na mmiri ọṅụṅụ zụọ ha.
  • Samsin biri nʼọgba nkume nke EtamNkp 15:8, Nkp 15:11
    Amaokwu ndị ahụ
    Nkp 15:8Ya mere, ọ pụkwuru ha ọzọ, site nʼoke iwe, gbuo ọtụtụ mmadụ nʼime ha. Mgbe nke a gasịrị, ọ gara biri nʼime otu ọgba nkume nke Etam.
    Nkp 15:11Nʼihi nke a, ndị Juda zipụrụ puku ndị agha ka ha gaa jide Samsin nʼọgba nkume ahụ nke Etam. Ndị a bịara jụọ Samsin ajụjụ sị ya, “Gịnị bụ ihe a i mere anyị? Ọ bụ na ị maghị na ndị Filistia na-achị obodo anyị?” Samsin zara sị ha, “Ihe m mere bụ imegwata ha ihe ha mere m.”
  • Devid gbabara nʼọgba nkume Adulam; ihe dị ka ndị ikom 400 sonyere ya1Sa 22:1–2
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 22:1–2Devid hapụrụ Gat gbaba nʼọgba nkume Adulam. Mgbe ụmụnne ya ndị ikom na ndị ezinaụlọ nna ya nụrụ nke a, ha jekwuru ya nʼebe ahụ. Ndị ọzọ malitekwara ịbịakwute ya nʼebe ahụ, ndị niile nọ na mkpagbu dị iche iche, ndị ji ụgwọ, na ndị ọchịchị Sọl na-adịghị mma. Ha niile jekwuru ya. Ọ dịghị anya Devid ghọọrọ onyendu ha. Ihe ruru narị mmadụ anọ so ya.
  • Ndịisi atọ jekwuru Devid nʼọgba nkume Adulam nʼoge owuwe ihe ubi2Sa 23:13, 1Ih 11:15
    Amaokwu ndị ahụ
    2Sa 23:13Nʼoge owuwe ihe ubi, mmadụ atọ nʼime iri ndị dike atọ ahụ, jekwuru Devid nʼọgba nkume Adulam, mgbe otù ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Refaim.
    1Ih 11:15Mmadụ atọ nʼime iri ndịisi agha atọ ahụ jekwuru Devid na nkume dị nʼọgba Adulam, na mgbe otù ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Refaim.
  • Sọl banyere nʼọgba nkume ebe Devid zoro; Devid bipụrụ nsọtụ uwe ya1Sa 24:3–4
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 24:3–4Mgbe ọ bịaruru nso nʼọgba atụrụ nke dị nʼụzọ ahụ, otu ọgba nkume dị nʼebe ahụ, Sọl banyere nʼime ya, ịga mposi. Devid na ndị ikom ya nọ nʼime ime ọgba nkume ahụ. Ndị ikom Devid sịrị ya, “Ahaa ugbu a bụ oge gị! Taa bụ ụbọchị ahụ Onyenwe anyị kwuru okwu ya, mgbe ọ sịrị, ‘Aghaghị m inyefe gị onye iro gị nʼaka, ka i mee ya dịka o si masị gị.’ ” Ma Devid ji nwayọọ gaa nso ebe Sọl nọ bipụ ọnụ ọnụ uwe mwụda ya.
  • Devid si nʼọgba nkume pụta, kpọọ Sọl oku1Sa 24:8
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 24:8Mgbe Sọl si nʼọgba nkume ahụ pụọ ịga nʼihu nʼije ya, Devid sitere nʼime ọgba nkume ahụ pụta, kpọọ Sọl oku sị ya, “Onyenwe m, eze!” Sọl tụgharịrị ma Devid kpọrọ isiala nye ya, daa nʼala kpuo ihu ya nʼala.
  • Okwu mmalite abụ ọma abụọ: Devid “nʼọgba nkume”Abụ 57:1, Abụ 142:1
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 57:1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala” Devid. Abụ miktam. Mgbe ọ gbapụrụ ga biri nʼime ọgba nkume nʼihi Sọl. Meere m ebere, O Chineke, meere m ebere, nʼihi na ọ bụ gị ka mkpụrụobi m ji mere ebe mgbaba. Ọ bụ na ndo nke nku gị abụọ ka m ga-agbaba tutuu ihe mbibi ndị a agafesịa.
    Abụ 142:1Abụ maskil nke Devid. Mgbe ọ nọ nʼọgba nkume. Ekpere. Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa; ewelitara m olu m rịọ Onyenwe anyị ka o meere m ebere.
  • Ndị a chụpụrụ achụpụ biri nʼetiti ọgba nkume na ọnụ alaJob 30:6
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 30:6A chụpụrụ ha ka ha gaa biri nʼala iyi mmiri na-adịghị. Ha bi nʼetiti ọgba nkume na ọnụ a tụrụ nʼime ala.
  • Ụfọdụ zoro nʼọgba nkume na nʼọnụ alaHib 11:38
    Amaokwu ndị ahụ
    Hib 11:38Ha wagharịrị nʼọzara na nʼugwu, nʼọgba nkume na nʼọnụ ala. Nʼanya ụwa, a gụrụ ha nʼihe efu.

Ọgba e ji eli ozu

  • Ebraham zụtara ọgba Makipela site nʼaka Efrọn onye HetJen 23:9, Jen 23:17–20
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 23:9ka o resi m ọgba Makipela, nke bụ nke ya, nke dị na ngwụsị ọhịa ya. Gwa ya ka o resi m ya nʼọnụ ahịa o ruru ka ọ bụrụ ebe olili m nwere nʼetiti unu.”
    Jen 23:17–20Site nʼoge ahụ, ala ahụ Efrọn nwere na Makipela, nke dị nso na Mamre, ala ahụ na ọgba dị nʼime ya, na osisi niile dị nʼime ala ahụ niile gburugburu, ghọrọ nke Ebraham dịka ihe nzụta ya nʼihu ụmụ Het, nʼihu ndị niile ndị bịara nʼọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ. Emesịa, Ebraham liri Sera nwunye ya nʼime ọgba ahụ dị nʼala dị na Makipela na nso Mamre (nke dị na Hebrọn) nʼala ndị Kenan. Ya mere, ala ahụ na ọgba dị nʼime ya ka ndị Het resiri Ebraham ka ọ bụrụ nke ya, ebe a na-eli ozu.
  • Aịzik na Ishmel liri Ebraham nʼebe ahụJen 25:9–10
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 25:9–10Ụmụ ya, Aịzik na Ishmel, liri ya nʼọgba Makipela nʼakụkụ Mamre, nʼala ubi Efrọn nwa Zoha onye Het, ala ahụ Ebraham zụrụ site nʼaka ndị Het. Ebe ahụ ka e liri Ebraham ya na Sera nwunye ya.
  • Jekọb: Ebraham, Sera, Aịzik, Ribeka na Lịa dina nʼọgba ahụJen 49:29–32
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 49:29–32Emesịa, o nyere ha ndụmọdụ sị ha, “Nʼoge na-adịghị anya site ugbu a, aga m anwụ. Unu aghaghị ili m nʼebe e liri nna m ha, nʼala Kenan, nʼime ọgba ahụ dị nʼọhịa Efrọn, onye Het. Nʼime ọgba dị nʼọhịa Makipela, nke dị nso na Mamre, nʼala Kenan, ọhịa Ebraham zụtara site nʼaka Efrọn onye Het, maka ili ozu. Nʼebe ahụ ka e liri Ebraham na Sera nwunye ya. Nʼebe ahụ kwa ka e liri Aịzik na Ribeka nwunye ya. Nʼebe ahụ ka m liri Lịa. Ebraham nna nna m zụrụ ala ahụ na ọgba dị nʼime ya site nʼaka ụmụ Het.”
  • Ụmụ Jekọb buuru ya site nʼIjipt gaa MakipelaJen 50:13
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 50:13Nʼihi na ha buuru ozu ya laa nʼala Kenan, lie ya nʼọgba ahụ dị nʼọhịa Makipela, nke bụ ala ubi Ebraham zụrụ dịka ala olili ozu, site nʼaka Efrọn, onye Het; nʼakụkụ Mamre.
  • Ili Lazarọs bụ ọgba e ji nkume mechie ọnụ yaJọn 11:38
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 11:38Ọzọkwa, Jisọs sụrụ ude nʼime onwe ya nke ukwuu, bịarute nʼili ahụ nso. Ili ahụ bụ ọgba e jiri nkume dị ukwuu mechie ọnụ ya.
  • E gwuru ili Jisọs nʼime nkume, kpụgharịa nkume mechie yaMat 27:60, Mak 15:46
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 27:60ma gaa lie ya nʼili ọhụrụ nke o gwuuru onwe ya, nʼetiti nkume. O jikwa otu nkume buru ibu kpuchie ọnụ ụzọ ili ahụ, hapụ ya laa.
    Mak 15:46Josef zụtara akwa ọcha linin, wedata ahụ ya jiri akwa ahụ fụchie ya. O buuru ya buba ya nʼime ili nke o gwuru nʼime nkume. Emesịa o nuketara otu nkume buru ibu, jiri ya mechie ọnụ ụzọ ili ahụ.

Okwu

  • “Dịrịnụ ka nduru nke na-ewu akwụ ya nʼakụkụ ọnụ ọgba nkume”Jer 48:28
    Amaokwu ndị ahụ
    Jer 48:28Sitenụ nʼobodo unu niile gbapụ ọsọ; jeenụ biri nʼetiti nkume, unu ndị bi nʼala Moab. Dịrịnụ ka nduru nke na-ewu akwụ ya nʼakụkụ ọnụ ọgba nkume.

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.