Bible Explorer

Ụlọ › Ihe Baịbụl kwuru › Okwu ọnụ

Mmekọrịta

Ihe Baịbụl kwuru banyere Okwu ọnụ

Amaokwu ndị na-agụ ya na-elekarị anya maka isiokwu a (15), e hotara ha nʼuju site na Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a.

Efe 4:29Ka okwu rere ure ọbụla hapụ isite nʼọnụ unu pụta. Kama kwuonụ naanị ezi ihe nke ga-aba uru iwuli ndị ọzọ elu dịka mkpa ha si dị na iwetara ndị nụrụ ya ngọzị.
Ilu 18:21Ike ọnwụ na ndụ dị ire nʼaka. Ndị hụrụ ya nʼanya ga-eri mkpụrụ ya.
Jem 1:26Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla echee na ya bụ onye na-ekpere Chineke ma hapụ ijide ire ya aka maọbụ ịkwa ire ya nga, onye dị otu a na-arafu onwe ya, okpukpe Chineke ya bụkwa ihe na-abaghị uru.
Ilu 15:1Ọsịsa okwu dị nro na-eme ka iwe na ọnụma laa azụ; ma okwu ike na-akpali iwe.
Ilu 21:23Onye na-echekwa ire ya na ọnụ ya na-egbochiri onwe ya ọdachi.
Ilu 12:18Okwu ọjọọ na-agbawa obi dịka mma agha, ma ire onye maara ihe na-eweta ọgwụgwọ.
Ilu 15:4Okwu dị nwayọọ na-eweta ndụ na ume; ma nkwutọ na-eweta ịda mba.
1Pt 3:10Nʼihi na, “Onye ọbụla nke na-achọ ndụ, nke chọrọ ịhụ ụbọchị ndị ahụ dị mma, ya mee ka ire ya ghara ikwu okwu ọjọọ meekwa ka egbugbere ọnụ ya ghara ikwu okwu aghụghọ.
Abụ 141:3Nyere m aka ka m mechie ọnụ m, o Onyenwe anyị; na-echekwa egbugbere ọnụ m nche.
Ilu 10:19Nʼọtụtụ okwu mmehie adịghị akwụsị ma ndị nwere uche na-ejide ire ha.
Jem 3:8ma mmadụ ọbụla adịghị nke nwere ike ịzụ ire. Ọ bụ ihe dị oke njọ na-adịghị ekwe nchịkọta, ma jupụtakwa na nsi na-ebute ọnwụ.
Abụ 19:14Kwere Onyenwe anyị, Onye mgbapụta m, na Oke nkume nchebe m, ka okwu ọnụ m niile, na echiche obi m niile, bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, na nke ị na-anabata.
Abụ 34:13chezie ire gị ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ, chezikwaa egbugbere ọnụ gị ka ọ gharakwa ịgha ụgha.
Mat 15:11Ọ bụghị ihe banyere mmadụ nʼọnụ na-emerụ ya, kama ọ bụ ihe sị nʼọnụ onye ahụ pụta na-emerụ ya.”
Ilu 16:24Okwu dị nro na-atọ ụtọ ka mmanụ aṅụ, ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, na-enyekwa ọkpụkpụ ahụ ike.

Ndị a bụ amaokwu ndị na-agụ na-achọkarị maka isiokwu a — ọ bụghị nkuzi banyere ya. Gụọ nke ọ bụla n'isiakwụkwọ ya.

Isi mmalite

Amaokwu nke isiokwu ọ bụla na usoro ha: data isiokwu nke OpenBible.info, dịka votu ndị na-agụ ya si dị: OpenBible.info · CC BY 4.0

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.