Bible Explorer

Baịbụl › Abụ nke Abụ › 6

IGCB · Isi 6 / 8

Abụ nke Abụ 6

1Gị onye mara mma nʼetiti ndị inyom, ebee ka onye ị hụrụ nʼanya jere? Olee ụzọ o sitere? Ka anyị soro gị chọọ ya.

2Ọ gara nʼubi ya a gbara ogige, nʼebe ihe ndina ya nke e fesara ụda na-esi isi ụtọ, ijegharị nʼetiti okoko urodi, na ịchịkọta okoko lili.

3Abụ m nke onye m hụrụ nʼanya, onye m hụrụ nʼanya bụkwa nke m. Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi.

4Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma dịka Tịaza, ị mara mma nke ukwu dịka Jerusalem, ị dị ebube ka usuu ndị agha ji ọkọlọtọ. Ị dị mma ile anya dịka Jerusalem; Ị dị ka ndị agha bu ọkọlọtọ.

5Wepụ anya gị nʼebe m nọ, nʼihi na i jirila anya gị dọta m. Agịrị isi gị dị ka igwe ewu nke na-arịdata site nʼugwu Gilead.

6Eze gị dị ka igwe atụrụ nke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta. Nke ọbụla chi ụmụ abụọ, ọ dịghịkwa nke nwa ya furu efu nʼetiti ha.

7Agba ntị gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị dị ka pomegranet e kere abụọ.

8E nwere ike nwee iri eze nwanyị isii, na iri ndị iko nwanyị asatọ, na ọtụtụ ụmụ agbọghọ a na-apụghị ịgụta ọnụ,

9ma gị onwe gị, nduru m, ezigbo m zuruoke, pụrụ iche nʼetiti ha niile. Naanị otu nwanyị nne ya nwere, ọ masịrị onye mụrụ ya. Ụmụ agbọghọ hụrụ ya kpọọ ya onye a gọziri agọzi, ndị eze nwanyị na ndị iko nwanyị tooro ya.

10Onye bụ onye a, pụtara ihe dịka chi ọbụbọ, nke mara mma dịka ọnwa, na-enwu dịka anyanwụ, dị ebube ka dị usuu kpakpando na-aga nʼahịrị nʼahịrị?

11Agara m nʼubi a gbara ogige ebe a kụrụ mkpụrụ osisi, ile ihe na-etopụta ọhụrụ na ndagwurugwu, ilekwa akwụkwọ ndụ ọhụrụ ndị na-epupụta nʼosisi vaịnị, na ị mata ma nʼosisi pomegranet ọ mara ifuru.

12Tupu m mata ebe m nọ, agụ nke mkpụrụobi m adọtala m tinye nʼetiti ụgbọ agha nke ndị eze ala m.

13Laghachi azụ, gị onye Shulam, laghachi azụ; laghachi azụ, e, laghachi azụ ka anyị lee gị anya. Maka gịnị ka unu ga-eji lee onye Shulam anya dịka ọ bụ ite egwu ndị Mahanaim?

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org