Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Ịnyịnya

Okike

Ịnyịnya nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (37), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

  • Job: ịnyịnya na-eripịa ala ndagwurugwu, na-aṅụrị nʼike ya, na-agbaba nʼaghaJob 39:19–21
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 39:19–21“Ọ bụ gị na-enye ịnyịnya ike ya, ka ọ bụ gị mere ka ajị ogologo ahụ o nwere dịrị nʼolu ya? Ị na-eme ya ka ọ wụgharịa dịka igurube, were ebube nke ịmapụ imi ya na-eyinye ihe oke egwu? Ọ na-azọ ụkwụ gam gam nʼala, ọ na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ike ya, ọ na-apụ izute agha na-atụghị egwu.
  • Ọ na-achị egwu ọchị, ọ naghị esi nʼihu mma agha laghachiJob 39:22–23
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 39:22–23Ọ na-achị ihe egwu ọchị, ụjọ ọbụla anaghị atụ ya; ọ naghị esi na mma agha wezuga onwe ya. Akpa àkụ na-ayọgharị nʼakụkụ ya, ya na ùbe na arụa na-egbu maramara.
  • Mgbe opi mpi ebule dara, ọ naghị eguzo otu ebe; ọ na-anụ isi aghaJob 39:24–25
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 39:24–25Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eripịa ala. Mgbe ọ nụrụ ụda opi ike, ọ naghị eguzo otu ebe. Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eti mkpu sị, ‘Ahaa!’ Site nʼebe dị anya ka ọ na-anụ isisi agha. Ọ na-aṅụrịkwa ọṅụ maka iti mkpu nke ndị ọchịagha nʼoge agha.
  • A nụrụ ịma imi na akwa ịnyịnya agha site nʼebe dị anyaJer 8:16
    Amaokwu ndị ahụ
    Jer 8:16E sitere na Dan nụ ụda ịma imi ịnyịnya ndị iro. Ala a niile mara jijiji mgbe ha nụrụ akwa nke ịnyịnya ndị ahụ dị ike. Ha na-abịa ịla ala a na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi. Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha na-abịa ime obodo a na ndị bi nʼime ya.
  • Mkpụmkpụ igwe nʼọnụ ha na-eme ka ndị na-agba ha duzie anụ ahụ niileJem 3:3
    Amaokwu ndị ahụ
    Jem 3:3Ọ bụrụ na anyị e tinye mkpụmkpụ igwe e ji ekechi ọnụ ịnyịnya ibu nʼọnụ ya, ka o rubere anyị isi, anyị na-eduru ya gaa ebe anyị chọrọ.
  • A ghaghị iji mkpụmkpụ igwe na eriri jide ịnyịnya na ịnyịnya muulAbụ 32:9
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 32:9Adịkwala ka ịnyịnya maọbụ ịnyịnya ibu nke na-enweghị akọnuche, nke a na-aghaghị iji mkpụmkpụ igwe na eriri kechie ọnụ ya, ijide ya, ma emeghị otu a, ọ gaghị abịakwute gị.
  • E wetara ọka balị na ahịhịa ọka maka ịnyịnya na-adọkpụ ụgbọ agha1Ez 4:28
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 4:28Ha na-ewetakwa ọka balị na ahịhịa ọka nʼebe o kwesiri, maka ịnyịnya na-adọkpụ ụgbọ agha na ịnyịnya ụkwụ ọsọ ndị ọzọ dịka ihe ha ketara nʼụtụ si dị.
  • Ụkwụ ụgbọ na ịnyịnya na-agafe nʼelu ọka na-egweghị yaAịz 28:28
    Amaokwu ndị ahụ
    Aịz 28:28A na-akwọ ọka e ji eme achịcha akwọ, ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a na-anọgide na-etichapụta ya. E nwere ike jiri ụkwụ igwe ụgbọala ịnyịnya na-adọkpụ zọchaa ha, ma ọ bụghị ka a kwọpịasịa mkpụrụ ha.

Nʼagha

  • Ịnyịnya na ụgbọ agha Fero chụsoro Izrel ruo nʼosimiriỌpụ 14:9, Ọpụ 15:19
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 14:9Ndị Ijipt chụsoro ha ọsọ, ịnyịnya Fero na ụgbọ agha, na ndị na-agba ịnyịnya na ndị agha ndị ọzọ chụsoro ndị Izrel ọsọ chụkwute ha nʼebe ha na-ezu ike nʼakụkụ osimiri dị nso na Pi Hahirot na ncherita ihu Baal-Zefọn.
    Ọpụ 15:19Mgbe ịnyịnya Fero, na ụgbọ agha ya, na ndị na-agba ịnyịnya, gbabanyere nʼosimiri, Onyenwe anyị mere ka mgbidi mmiri ahụ dagbuo ha. Ma ụmụ Izrel sitere nʼala mmiri kọrọ gafee.
  • Joshua bipụrụ nkwonkwo ụkwụ ịnyịnya ndị iro, sure ụgbọ agha ha ọkụJos 11:6, Jos 11:9
    Amaokwu ndị ahụ
    Jos 11:6Ma Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Atụla ha egwu, nʼihi na echi, nʼoge dịka ugbu a, aga m ewere ha niile nʼọnọdụ ndị egburu egbu nyefee ha nʼaka Izrel. Ị ga-ebipụ nkwonkwo ụkwụ ịnyịnya ha niile, kpọọkwa ụgbọ agha ha niile ọkụ.”
    Jos 11:9Joshua na ndị agha ya mere ha ihe Onyenwe anyị kwuru na a ga-eme ha. Ha gbupụrụ nkwonkwo ụkwụ ịnyịnya ha niile, surekwaa ụgbọ agha ha niile nʼọkụ.
  • Devid bipụrụ akwara ụkwụ ịnyịnya ụgbọ agha niile, ma ọ bụghị otu narị2Sa 8:4
    Amaokwu ndị ahụ
    2Sa 8:4Devid nwudere otu puku ịnyịnya ya na-adọkpụ ụgbọ agha, puku ndị agha asaa ndị na-agba ụgbọ agha, tinyere ndị agha ji ụkwụ eje dị iri puku abụọ. O bipụrụ akwara ụkwụ ịnyịnya ndị ahụ niile ọ dọtara nʼagha, ma hapụ naanị narị ịnyịnya.
  • Eze Jehoshafat gwara Ehab: “ịnyịnya m bụkwa nke gị”1Ez 22:4
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 22:4Ya mere, ọ jụrụ Jehoshafat, “Ị ga-eso m gaa buso Ramọt Gilead agha?” Jehoshafat zaghachiri eze Izrel, sị, “Otu m dị ka gị onwe gị dị, ndị m bụkwa ndị gị, ịnyịnya m bụkwa nke gị.”
  • Mkparị ndị Asịrịa: puku ịnyịnya abụọ, ma ọ bụrụ na ị chọta ndị ga-agba ha2Ez 18:23
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 18:23“ ‘Ma ugbu a, bịa kwee nna m ukwu, bụ eze Asịrịa nkwa. Aga m enye gị puku ịnyịnya abụọ ma ọ bụrụ na i nwere ike ịchọta ndị ga-agba ha.
  • Ndị nnyopụta na Sameria duuru ụgbọ agha abụọ na ịnyịnya ka ha chụso ndị Aram2Ez 7:13–14
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 7:13–14Ma otu onye nʼime ndịisi agha ya zara sị ya, “Ka ụfọdụ mmadụ duru ịnyịnya ise ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo. Ọ bụrụ na ndị a alọtaghị ọnọdụ ha ga-adị ka nke ndị Izrel niile fọdụrụ nʼebe, e, ha ga-adị ka ndị Izrel niile a gụrụ dịka ndị nwụrụ anwụ. Ya mere, ka anyị zipụ ha ka ha gaa chọpụta ihe mere.” Ya mere, ha họpụtara ụgbọ agha abụọ na ịnyịnya ndị na-adọkpụ ha. Eze zipụrụ ha ịchụso ndị agha Aram, O nyere ndị na-agba ha iwu sị, “Gaanụ chọpụta ihe mere.”
  • “Kegidezienụ ịnyịnya unu, rịkwasịkwanụ nʼelu ha … kpukwasịkwanụ onwe unu okpu agha unu”Jer 46:4
    Amaokwu ndị ahụ
    Jer 46:4Kegidezienụ ịnyịnya unu, rịkwasịkwanụ nʼelu ha. Guzokwanụ nʼọnọdụ ibu agha unu, ma kpukwasịkwanụ onwe unu okpu agha unu. Mụọnụ ùbe unu ka ọ dị nkọ, yikwasịkwanụ uwe agha unu.
  • Ụzụ ikiri ụkwụ ịnyịnya na-agba ọsọ na mkpọtụ ụgbọ aghaJer 47:3
    Amaokwu ndị ahụ
    Jer 47:3Mgbe ha ga-anụ ụzụ ikiri ụkwụ nke ọtụtụ ịnyịnya, nke na-agbata ọsọ na-abịa nʼebe ha nọ, mgbe ha ga-anụkwa ụzụ ụgbọ agha ndị iro, na ụzụ nzọ ụkwụ igwe ha. Nʼoge ahụ, ndị bụ nna agaghị enwe ike nyere ụmụ ha aka, nʼihi na aka ha ga-akụda nʼakụkụ ha.

Ndị eze na ahịa

  • Iwu: eze agaghị inwe ọtụtụ ịnyịnyaDit 17:16
    Amaokwu ndị ahụ
    Dit 17:16Hụ na eze ahụ ị họpụtara enweghị ọtụtụ ịnyịnya. Eze ahụ ekwesịkwaghị izipụ ndị ga-aga Ijipt ịzụpụtara ya ọtụtụ ịnyịnya ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị agwala gị sị, “Ị gaghị alaghachi Ijipt ọzọ.”
  • Ụlọ ịnyịnya ụgbọ agha Solomọn, na ndị na-agba ịnyịnya ya1Ez 4:26, 2Ih 9:25
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 4:26Ọnụọgụgụ ụlọ a na-etinye ụgbọ agha ịnyịnya na-adọkpụ nke Solomọn nwere dị puku anọ. Ọnụọgụgụ ịnyịnya a na-agba agba o nwere dị puku iri na abụọ.
    2Ih 9:25Solomọn nwere ụlọ anụmanụ dị puku anọ maka ịnyịnya na ụgbọ agha, nwekwa puku ịnyịnya iri na abụọ ndị o dobere nʼobodo ụgbọ agha dị iche iche, na nʼebe eze nọ na Jerusalem.
  • Ịnyịnya si Ijipt dị shekel ọlaọcha 150, ụgbọ agha 6001Ez 10:28–29
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 10:28–29A na-esite nʼIjipt nakwa ala Kue atụbatara Solomọn ịnyịnya. Ndị ahịa eze na-azụta ha site na Kue nʼọnụ ahịa a na-ere ha nʼoge ahụ. Ha sitere nʼIjipt tụbata otu ụgbọ agha nʼọnụ ahịa narị shekel ọlaọcha isii, jirikwa otu narị shekel na iri shekel ise zụta otu ịnyịnya. Ha zipụkwara ha nye ndị eze niile nke ndị Het na ndị Aram.
  • Ịnyịnya Solomọn si Ijipt, Kue na ala ndị ọzọ1Ez 10:28, 2Ih 9:28
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 10:28A na-esite nʼIjipt nakwa ala Kue atụbatara Solomọn ịnyịnya. Ndị ahịa eze na-azụta ha site na Kue nʼọnụ ahịa a na-ere ha nʼoge ahụ.
    2Ih 9:28A na-esite nʼIjipt na nʼala ndị ọzọ dị iche iche atụbatara Solomọn ịnyịnya.
  • Bet Togama zụrụ ịnyịnya, ịnyịnya agha na ịnyịnya muul ahịa na TaịaIzk 27:14
    Amaokwu ndị ahụ
    Izk 27:14“ ‘Otu a kwa ndị ikom Bet Togama jikwa ịnyịnya ụgbọ, na ịnyịnya agha, na ịnyịnya ibu na-agbanwere ihe ha zụrụ.
  • Ndị si Babilọn lọta nwere ịnyịnya 736 na ịnyịnya muul 245Ezr 2:66
    Amaokwu ndị ahụ
    Ezr 2:66Ịnyịnya dị narị asaa na iri atọ na isii (736), ebe ịnyịnya muul dị narị abụọ na iri anọ na ise (245).
  • Ụfọdụ na Juda gara Ijipt ịtụkwasị obi nʼịnyịnya na ụgbọ agha yaAịz 31:1
    Amaokwu ndị ahụ
    Aịz 31:1Ahụhụ dịrị ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka, ndị nchekwube ha dị nʼike ndị ha na-agba ịnyịnya, ndị na-atụkwasị obi ha nʼụgbọala ha, nke dị ọtụtụ, ndị na-atụkwasịkwa obi ha nʼịdị ike nke ndị Ijipt na-agba ịnyịnya. Ma ha adịghị ele anya inyeaka site nʼaka Onye Nsọ Izrel; ha adịghị arịọkwa ya ka Onyenwe anyị nyere ha aka.
  • Josaya wepụrụ ịnyịnya ndị eze Juda doro nsọ nye anyanwụ2Ez 23:11
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 23:11O sitere nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị wepụ ịnyịnya ndị ahụ ndị eze Juda doro nsọ nye anyanwụ. Ịnyịnya ndị a dị nʼogige ụlọnsọ Onyenwe anyị nʼebe dị nso nʼụlọ onyeozi aha ya bụ Netan-Melek. Josaya kpọrọ ụgbọ agha ndị a niile e doro nsọ nye anyanwụ ọkụ.
  • E duuru Mọdekai gburugburu obodo nʼelu ịnyịnya eze nʼonwe yaEst 6:8–11
    Amaokwu ndị ahụ
    Est 6:8–11nye iwu ka e wepụta uwe gị, nke gị bụ eze yitụrụla, na ịnyịnya gị, nke eze gbaarala, nke e kpukwasịrị oyiyi okpueze nʼisi ya. Ka enye uwe ahụ na ịnyịnya ahụ nʼaka otu onye kachasị nwee ugwu nʼime ụmụ eze, ka ha yikwasị nwoke ahụ nke eze chọrọ ịsọpụrụ uwe ahụ, ka ịnyịnya buru ya dịka ha dọkpụ ya na-ejegharị nʼokporoụzọ niile nʼobodo, na-ekwusa nʼihu ya na-asị, ‘Otu a ka a na-emere nwoke ahụ ọ masịrị eze inye nsọpụrụ!’ ” Mgbe ahụ eze nyere Heman iwu, sị; “Ahaa! Ntụpụta gị dị mma nke ukwuu! Mee ngwangwa, were uwe ndị a, na ịnyịnya m, meekwara Mọdekai onye Juu ahụ na-anọdụ nʼọnụ ụzọ ama ụlọeze ihe niile ndị a i kwuru. Hụkwa na i mechasịrị ihe ndị a niile i kwuru.” Ya mere, Heman chịịrị uwe eze ahụ yikwasị ya Mọdekai nʼahụ. O mekwara ka ọ nọdụ nʼelu ịnyịnya eze. Emesịa, o duuru ya jegharịa nʼakụkụ obodo ahụ niile na-eti mkpu na-asị, “Otu a ka eze ga-esi sọpụrụ nwoke ahụ ihe ya dị ya mma.”
  • Ụgbọ ọkụ nke ịnyịnya ọkụ na-adọkpụ kewara Ịlaịja na Ịlaisha2Ez 2:11
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 2:11Mgbe ha na-aga nʼihu nʼije ha na-akparịta ụka, na mberede, ụgbọ ọkụ nke ịnyịnya ọkụ na-adọkpụ pụtara ihe kewaa ha abụọ. Mgbe ahụ kwa oke ifufe buuru Ịlaịja rigoro nʼeluigwe.

Okwu

  • “ịnyịnya ha niile na-agbasikwa ọsọ ike karịa ugo”Jer 4:13
    Amaokwu ndị ahụ
    Jer 4:13Lee anya, ha na-abịa dịka igwe ojii. Ụgbọala agha ya na-abịa dịka oke ifufe, ịnyịnya ha niile na-agbasikwa ọsọ ike karịa ugo. Ahụhụ dịrị anyị, anyị abụrụla ndị e bibiri ebibi! Anyị abụrụla ndị na-aga ịla nʼiyi!
  • “Ịnyịnya ha nwere ụkwụ nkọ karịa agụ. Ha na-akpa ike karịa nkịta ọhịa nke na-ejegharị nʼanyasị”Hab 1:8
    Amaokwu ndị ahụ
    Hab 1:8Ịnyịnya ha nwere ụkwụ nkọ karịa agụ. Ha na-akpa ike karịa nkịta ọhịa nke na-ejegharị nʼanyasị. Ndị ịnyịnya agha ha na-awụ ọsọ, ndị ha na-agba ịnyịnya na-esitekwa ebe dị anya na-abịa. Dịka ugo nke na-efedata i buru nri ọ ga-eri.
  • “E nwere ike jikere ịnyịnya, kwadokwaa maka agha”Ilu 21:31
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 21:31E nwere ike jikere ịnyịnya, kwadokwaa maka agha, maọbụ naanị Onyenwe anyị na-enye mmeri.
  • Abụ ọma: ọ bụladị oke ike ịnyịnya apụghị ịzọpụtaAbụ 33:17
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 33:17Ịnyịnya agha ezukwaghị iwetara ndị na-agba ha mmeri nʼagha. Ọ bụ ezie na ịnyịnya dị ike, ma ha apụghị ịzọpụta ndị nwe ha.
  • “Ụtarị dịrị ịnyịnya, ịnyịnya ibu ka a na-ekenye mkpụmkpụ igwe nʼọnụ”Ilu 26:3
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 26:3Ụtarị dịrị ịnyịnya, ịnyịnya ibu ka a na-ekenye mkpụmkpụ igwe nʼọnụ; otu a kwa ka apịpịa dị nye azụ ndị nzuzu.
  • “Ịnyịnya ọ na-agba ọsọ nʼelu nkume?”Ems 6:12
    Amaokwu ndị ahụ
    Ems 6:12Ịnyịnya ọ na-agba ọsọ nʼelu nkume? Mmadụ ọ na-eji ehi abụọ e jikọtara ọnụ akọ elu osimiri? Ma unu atụgharịala ikpe ziri ezi mee ya ka ọ ghọọ nsi, mkpụrụ nke ezi omume ka unu mekwara ka ọ ghọọ ihe ilu.
  • “Ọ bụrụ na ndị ji ụkwụ ha agba ọsọ emerie gị … gị na ndị ji ịnyịnya agba ọsọ nwere ike ịgbakọta ọsọ”Jer 12:5
    Amaokwu ndị ahụ
    Jer 12:5“Ọ bụrụ na ndị ji ụkwụ ha agba ọsọ emerie gị nʼọsọ nke gị na ha gbara, i si aṅaa chee na gị na ndị ji ịnyịnya agba ọsọ nwere ike ịgbakọta ọsọ ịsọ mpi? Ọ bụrụ na ị sọọ ngọngọ nʼala ebe udo dị, ị ga-esi aṅaa ghara ịsọ ngọngọ nʼọhịa dị nʼakụkụ osimiri Jọdan?

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.