Okike
Ugwu nʼime Baịbụl
Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (41), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.
- “Ugwu niile dị elu dịịrị ewu ọhịa”Abụ 104:18
Amaokwu ndị ahụ
Abụ 104:18Ugwu niile dị elu dịịrị ewu ọhịa; nʼọgba dị na nkume ka ewi nkume na-ezo onwe ha.
- Ugwu gbara Jerusalem gburugburuAbụ 125:2
Amaokwu ndị ahụ
Abụ 125:2Dịka ugwu niile si gbaa obodo Jerusalem gburugburu, otu a ka Onyenwe anyị na-agba ndị ya gburugburu ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi.
- Ala ebe e nwere ike igwupụta ọla kọpa nʼugwu yaDit 8:9
Amaokwu ndị ahụ
Dit 8:9Ọ bụkwa ala jupụtara nʼihe oriri, ebe a na-agaghị enwe ụkọ nri. Ọ bụ ala ebe igwe jupụtara nʼime ya dị ka ha bụ nkume, ala ebe ọla jupụtakwara nʼugwu ya niile.
- Onye na-egwu ala na-etiwa nkume, na-atụgharị ugwu site na mgbọrọgwụ haJob 28:9
Amaokwu ndị ahụ
Job 28:9Ndị mmadụ na-eji aka na-etiwasị nkume ahụ na-enwu ọkụ mee ka mgbọrọgwụ ugwu ahụ pụta ìhè.
- Ugwu na-erichasị, na-adaJob 14:18
Amaokwu ndị ahụ
Job 14:18“Ma dịka ugwu si erichasi daa, na dịka a na-enupu oke nkume nʼọnọdụ ya,
- Elu ugwu Lebanọn: Amana, Senia, Hemon, ọgba ọdụm na agụAbụk 4:8
Amaokwu ndị ahụ
Abụk 4:8Si na Lebanọn soro m, nwunye m lụrụ ọhụrụ. Si na Lebanọn bịa soro m; rịdata site nʼugwu Amana, nʼugwu Senia, na nʼugwu Hemon, site nʼọgba ọdụm nʼugwu niile ebe agụ bi.
- Solomọn nwere ndị na-awa nkume 80,000 nʼugwu1Ez 5:15
Amaokwu ndị ahụ
1Ez 5:15Solomọn nwere ndị ọrụ ọzọ ọnụọgụgụ ha dị iri puku asaa na-ebu ibu, nweekwa ndị na-awa nkume nʼugwu ọnụọgụgụ ha dị iri puku asatọ.
- Nʼihi ndị Midia, Izrel meere onwe ha ebe obibi nʼugwu na nʼọgbaNkp 6:2
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 6:2Nʼihi na ndị Midia mekpara ha ahụ nke ukwuu, ụmụ Izrel meere onwe ha ebe obibi nʼugwu, nʼime ọgba nkume, na nʼebe e wusiri ike dị iche iche.
- Ọkọlọtọ e weliri nʼelu ugwu tọgbọrọ nʼefu bụ ihe amaAịz 13:2, Aịz 18:3
Amaokwu ndị ahụ
Aịz 13:2Welienụ ọkọlọtọ agha nʼelu ugwu tọgbọrọ nʼefu. Kpọkuonụ ndị agha. Feerenụ ha aka, ka ha site nʼọnụ ụzọ ama nke ndị a maara aha ha bata nʼime obodo ukwu ahụ na-anya isi.
Aịz 18:3Unu niile bi nʼelu ụwa dum, na unu ndị nwere ebe obibi nʼụwa, geenụ m ntị. Mgbe e buliri ọkọlọtọ elu nʼelu ugwu niile, lee anya; mgbe a fụrụ opi ike, gee ntị.
- “ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu”Mat 24:16
Amaokwu ndị ahụ
Mat 24:16Mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu.
- Ebe arụsị nʼelu ugwu nʼokpuru osisi nwere ndoHos 4:13, Dit 12:2
Amaokwu ndị ahụ
Hos 4:13Ha na-achụ aja nʼelu ugwu niile, na-esure onyinye nsure ọkụ nʼelu ugwu nta niile, na nʼokpuru osisi ook, osisi pọpla na osisi terebint, ebe ndo ya dị ezi mma. Nʼihi nke a ka ụmụ unu ndị inyom na-agba akwụna, ndị nwunye ụmụ unu na-akwa iko.
Dit 12:2Tikpọọnụ ebe niile nke dị nʼelu ugwu niile dị elu na nʼelu ugwu niile dị nta, nakwa nʼokpuru osisi mgbasa ọbụla, bụ ebe mba niile unu na-anapụ ala ha fere chi niile ha ofufe.
Ugwu nʼime akụkọ ndị ahụ
- Ụgbọ mmiri ahụ nọkwasịrị nʼelu ugwu AraratJen 8:4
Amaokwu ndị ahụ
Jen 8:4Nʼụbọchị iri na asaa nke ọnwa asaa, ụgbọ mmiri ahụ gara nọkwasị nʼelu ugwu Ararat.
- Elu ugwu pụtara ìhè nʼụbọchị mbụ nke ọnwa nke iriJen 8:5
Amaokwu ndị ahụ
Jen 8:5Mmiri a gara nʼihu na-ata ruo ọnwa nke iri. Nʼụbọchị nke mbụ nke ọnwa iri, e bidoro ịhụ elu ugwu ndị ọzọ anya.
- E zigara Ebraham nʼotu ugwu nʼala MọrịaJen 22:2
Amaokwu ndị ahụ
Jen 22:2Chineke sịrị, “Duru nwa gị nwoke, naanị otu nwa gị nwoke, Aịzik onye ị hụrụ nʼanya, gaa nʼala Mọrịa. Jiri ya chụọrọ m aja nsure ọkụ nʼelu otu nʼime ugwu dị nʼebe m ga-egosi gị.”
- Mosis na igwe anụ ụlọ bịarutere Horeb, ugwu ChinekeỌpụ 3:1
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 3:1Nʼoge a, Mosis na-azụ igwe anụ ụlọ Jetro ọgọ ya nwoke, onye nchụaja na Midia. Otu ụbọchị, o duuru igwe anụ ụlọ ndị a gaa nʼakụkụ ọzara. Ọ batara Horeb, ugwu Chineke.
- Oke e kpara gbochiri ndị mmadụ imetụ ugwu Saịnaị akaỌpụ 19:12
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 19:12Ị ga-akpa oke nʼebe ha na-agaghị agafe. Nye ha iwu si ha, ‘Kpacharanụ anya ka unu ghara ịbịa ugwu ahụ nso, maọbụ metụ ala ugwu ahụ aka. Nʼihi na onye ọ bụla metụrụ ugwu ahụ aka aghaghị ịnwụ.’
- Saịnaị nwụrụ anwụrụ ọkụ dịka ọkụ ekwu, maa jijiji nke ukwuuỌpụ 19:18
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 19:18Mgbe ahụ, anwụrụ ọkụ kpuchiri ugwu Saịnaị. Ma lee! Onyenwe anyị rịdatara dịka ire ọkụ nʼelu ugwu ahụ. Anwụrụ ọkụ rigoro elu dịka anwụrụ ọkụ nke ọhịa na-ere ọkụ. Ala ọma jijiji dị ukwuu dakwasịkwara ugwu ahụ.
- Mosis nọrọ nʼelu ugwu iri ụbọchị anọ ehihie na abalịỌpụ 24:18
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 24:18Mosis banyere nʼime igwe ojii ahụ mgbe ọ na-arịgo ugwu ahụ. Ọ nọgidere nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị.
- Erọn nwụrụ nʼelu ugwu HorỌnụ 20:27–28
Amaokwu ndị ahụ
Ọnụ 20:27–28Ya mere Mosis mere dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu. Ha atọ rigoro nʼugwu Hor mgbe nzukọ Izrel niile nọ na-ele ha anya. Mgbe ha ruru nʼelu ugwu ahụ, Mosis yipụrụ Erọn uwe onye nchụaja ya yikwasị ha nwa ya nwoke Elieza. Erọn nọkwa nʼebe ahụ, nʼelu ugwu ahụ nwụọ. Emesịa, Mosis na Elieza tụgharịrị site nʼugwu ahụ lọghachi.
- Site nʼugwu Nebo, nʼelu Pisga, Mosis hụrụ ala ahụDit 34:1
Amaokwu ndị ahụ
Dit 34:1Mgbe ahụ, Mosis sitere na mbara ala Moab rigoruo nʼelu nʼugwu Nebo, ruo nʼelu Pisga, nke dị na ncherita ihu Jeriko. Nʼebe ahụ Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ala ahụ niile anya site na Gilead ruo Dan;
- Ebo isii guzoro nʼugwu Gerizim, isii nʼugwu EbalDit 27:12–13
Amaokwu ndị ahụ
Dit 27:12–13Mgbe unu gafere Jọdan, ebo ndị a: Simiọn, na Livayị na Juda na Isaka na Josef na Benjamin, ga-eguzo nʼelu ugwu Gerizim gọzie ụmụ Izrel Agbụrụ Ruben, Gad, Asha, Zebụlọn, Dan na Naftalị ga-eguzo nʼelu ugwu Ebal kwupụta ọbụbụ ọnụ.
- Jotam si nʼelu ugwu Gerizim tie mkpu kọọ akụkọ ifo yaNkp 9:7
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 9:7Mgbe Jotam nụrụ ya, o rigooro nʼugwu Gerizim guzo nʼebe ahụ tikuo ndị Shekem niile mkpu si ha, “Geenụ m ntị ka Chineke nwe ike gee unu ntị.
- Barak chịkọtara puku ndị ikom iri nʼugwu TaboaNkp 4:6
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 4:6O ziri ozi kpọọ Barak, nwa Abinoam, onye bi nʼobodo Kedesh, nke dị nʼime Naftalị, ọ sịrị ya, “ Onyenwe anyị Chineke ụmụ Izrel na-enye gị iwu, ‘Gaa chịkọtaa puku ndị agha iri bụ ndị sitere nʼebo Naftalị na Zebụlọn, duru ha jeruo ugwu Taboa.
- Sọl na Devid nọ nʼakụkụ abụọ nke otu ugwu1Sa 23:26
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 23:26Mgbe ha ruru nʼebe ahụ, Sọl na ndị agha ya nọ nʼotu akụkụ ugwu ahụ, Devid na ndị agha ya nọkwa nʼakụkụ nke ọzọ, na-eme ngwa ka ha gbanarị Sọl. Ma Sọl na ndị agha ya na-abịa nnọọ nso ijide Devid.
- Sọl na ụmụ ya ndị ikom atọ dara nʼugwu Gilboa1Sa 31:8
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 31:8Nʼechi ya, mgbe ndị Filistia bịara iyipụ ndị nwụrụ anwụ ihe ha ga-achịkọrọ, ha hụrụ ozu Sọl na nke ụmụ ya ndị ikom atọ ka ha tọgbọ nʼugwu Gilboa.
- Ịlaịja kpọkọtara Izrel na ndị amụma Baal nʼugwu Kamel1Ez 18:19–20
Amaokwu ndị ahụ
1Ez 18:19–20Ugbu a, kpọkọta ndị Izrel niile ka ha zute m nʼugwu Kamel. Kpọpụtakwa ndị amụma Baal ọnụọgụgụ ha dị narị anọ na iri mmadụ ise, na ndị amụma Ashera, ndị dị narị anọ, bụ ndị na-eso eze nwanyị Jezebel erikọ ihe na tebul ya.” Ehab zigara ozi kpọkọta ndị Izrel niile, na ndị amụma ahụ niile. Ha niile bịakwara nʼugwu Kamel.
- Nʼelu ugwu Kamel, Ịlaịja kpuru ihu ya nʼetiti ikpere ya1Ez 18:42
Amaokwu ndị ahụ
1Ez 18:42Nʼihi nke a, Ehab sitere nʼebe ahụ pụọ gaa iri nri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ ma Ịlaịja rigooro nʼelu ugwu Kamel gbuo ikpere nʼala, kpuokwa ihu ya nʼala nʼetiti ikpere ya abụọ ikpe ekpere.
- Nwanyị Sameria ahụ: “Nna nna anyị ha fere ofufe nʼugwu a”Jọn 4:20
Amaokwu ndị ahụ
Jọn 4:20Nna nna anyị ha fere ofufe nʼugwu a, ma unu na-ekwu nʼebe ndị mmadụ ga-eferịrị ofufe bụ naanị na Jerusalem.”
- Jisọs rigoro nʼelu ugwu, nọdụ ala izi iheMat 5:1
Amaokwu ndị ahụ
Mat 5:1Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ ahụ, ọ rigooro nʼelu ugwu. Mgbe ọ nọdụrụ ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya,
- Jisọs rigoro nʼugwu naanị ya ikpe ekpereMat 14:23, Luk 6:12
- E mere ka ọdịdị Jisọs gbanwee nʼelu ugwu dị eluMat 17:1–2
Amaokwu ndị ahụ
Mat 17:1–2Mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita, na Jemis na Jọn nwanne ya, rigoro nʼugwu dị elu ebe naanị ha nọdụrụ. Nʼebe ahụ a gbanwere ọdịdị ya nʼihu ha, ihu ya na-enwupụ dị ka anyanwụ, uwe ya chapụkwara dị ka ìhè.
- Nazaret dị nʼelu ugwu nwere mkputamkpuLuk 4:29
Amaokwu ndị ahụ
Luk 4:29Ha biliri, kwapụ ya site nʼobodo ahụ, dọkpụrụ ya gaa nʼelu ugwu nke e wukwasịrị obodo ahụ ka ha nwee ike tụpụ ya site nʼugwu ahụ.
- Jisọs na-anọ abalị ya nʼUgwu OlivLuk 21:37
Amaokwu ndị ahụ
Luk 21:37Kwa ụbọchị, ọ na-ezi ihe nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ma nʼuhuruchi, ọ na-arịgoro nʼelu Ugwu Oliv ị ga nọọ ọnọdụ abalị.
- Ugwu Oliv: njem otu ụbọchị izuike site na JerusalemỌrụ 1:12
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 1:12Ha sitere nʼUgwu a na-akpọ Oliv nke dị Jerusalem nso, njem nke otu ụbọchị izuike, laghachi na Jerusalem.
Okwu
- “dịka ugwu Taboa si dị ukwuu nʼebe ugwu ndị ọzọ dị, na dịka Kamel si dịrị nʼakụkụ osimiri”Jer 46:18
Amaokwu ndị ahụ
Jer 46:18“Dịka mụ onwe m na-adị ndụ,” ka Eze ahụ kwupụtara, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, “otu onye ga-abịa, onye dị ukwuu dịka ugwu Taboa si dị ukwuu nʼebe ugwu ndị ọzọ dị, na dịka Kamel si dịrị nʼakụkụ osimiri.
- Okwukwe nwere ike ịgwa ugwu a ka o si nʼebe ọ nọ pụọMat 17:20, Mat 21:21
Amaokwu ndị ahụ
Mat 17:20Ọ sịrị ha, “Ọ bụ nʼihi na okwukwe unu nwere esighị ike. Nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na unu e nwee okwukwe nke dị nta ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike ị sị ugwu a, ‘Site nʼebe a wezuga onwe gị,’ ọ ga-apụtakwa. Ọ dịghị ihe unu na-agaghị enwe ike ime.
Mat 21:21Jisọs zara sị ha, “Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na unu e nwee okwukwe, gharakwa inwe obi abụọ, ọ bụghị naanị na unu ga-eme ihe e mere osisi fiig ahụ. Unu pụrụ inye ugwu a iwu sị ya, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa danye nʼoke osimiri.’ Ọ ga-emezukwa.
- “Aga m eweli anya m abụọ elu, lee ha nʼelu ugwu niile”Abụ 121:1
Amaokwu ndị ahụ
Abụ 121:1Abụ nrigo. Aga m eweli anya m abụọ elu, lee ha nʼelu ugwu niile, olee ebe inyeaka ga-esi bịara m?
Isi mmalite
Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.