Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Ọkọchị na oge oyi

Okike

Ọkọchị na oge oyi nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (40), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

  • Oge ịkụ mkpụrụ na oge owuwe ihe ubi, oyi na okpomọkụ, ọkọchị na udu mmiri agaghị akwụsịJen 8:22
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 8:22“Ogologo oge niile ụwa ga-anọgide, oge ịkụ mkpụrụ na oge iwe ihe ubi, oge oyi na oge okpomọkụ, ọkọchị na udu mmiri, ehihie na abalị, agaghị ebi.”
  • Ìhè nʼeluigwe iji gosi oge, ụbọchị na afọJen 1:14, Abụ 104:19
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 1:14Chineke kwuru sị, “Ka ìhè nke na-enye ìhè dịrị na mbara eluigwe, ikewapụ ehihie site nʼabalị. Ka ha bụrụ ihe ama igosi oge dị iche iche, ụbọchị dị iche iche, na afọ dị iche iche.
    Abụ 104:19I mere ọnwa ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-agụ oge na mgbe dị iche iche; anyanwụ makwaara mgbe ọ ga-eji daa.
  • Abụ ọma: “Ọ bụ gị mere ka ọkọchị na udu mmiri dị”Abụ 74:17
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 74:17Ọ bụ gị kewapụtara oke ala niile nke ụwa. Ọ bụ gị mere ka ọkọchị na udu mmiri dị.
  • Mmiri ozuzo nʼoge ya: mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụDit 11:14, Jul 2:23, Jer 5:24
    Amaokwu ndị ahụ
    Dit 11:14ọ ga na-ezite mmiri ozuzo nʼoge ya, mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ, nke ga-eme ka ọka unu mịa mkpụrụ hiri nne, ka unu nwee ọtụtụ vaịnị, nweekwa mmanụ oliv.
    Jul 2:23Ụmụ Zayọn, ka obi tọọ unu ụtọ, ṅụrịanụ ọṅụ nʼime ịdị mma Onyenwe anyị, bụ Chineke unu. Nʼihi na o nyela unu mmiri ozuzo mbụ nke ọkọchị, nʼihi ịdị mma ya. Ọ na-ezite ọtụtụ mmiri ozuzo, nke ọkọchị, na nke udu mmiri, dịka ọ dị na mbụ.
    Jer 5:24Ha adịghị asị onwe ha, ‘Ka anyị tụọ egwu Onyenwe anyị Chineke anyị, onye na-enye anyị mmiri ozuzo nʼoge ya, ọ bụkwa ya na-eme ka anyị na-ewebata ihe ubi anyị nʼoge ya.’
  • Nʼoge ndị eze na-apụ ibu agha2Sa 11:1
    Amaokwu ndị ahụ
    2Sa 11:1Nʼoge ọkọchị, mgbe ndị eze na-apụ ibu agha, Devid zipụrụ Joab ọchịagha ya, na ndị agha Izrel. Ha bibiri ndị Amọn, nọchibidokwa Raba. Ma Devid nọdụrụ na Jerusalem.
  • Ịzọcha ọka ruo oge owuwe mkpụrụ vaịnị, owuwe mkpụrụ vaịnị ruo oge ịkụ mkpụrụLev 26:5
    Amaokwu ndị ahụ
    Lev 26:5Unu ga-anọgide na-azọcha ọka tutu ruo mgbe unu ga-aghọ mkpụrụ vaịnị unu, owuwe ihe ubi mkpụrụ vaịnị unu ga-adịgidekwa ruo oge ịkụ mkpụrụ nʼubi. Nʼụzọ dị otu a, unu ga-enwe nri ga-ezuru unu, unu ga-ebikwa nʼudo nʼala unu.
  • Rut bịara na mmalite owuwe ọka balị, tụtụkọta ruo mgbe e wechara ọka wiitiRut 1:22, Rut 2:23
    Amaokwu ndị ahụ
    Rut 1:22Otu a ka Naomi na Rut onye Moab bụ nwunye nwa ya si laghachi nʼala Juda. Oge ha ji lọbata nʼobodo Betlehem bụ oge a na-amalite ịghọ ọka balị.
    Rut 2:23Ya mere, Rut sogidere ụmụ agbọghọ Boaz na-atụtụ ọka, tutu ruo ọgwụgwụ ịghọ ọka balị na wiiti. Ya na nne di ya bigidekwara.
  • Samuel kpọkuru egbe eluigwe na mmiri ozuzo nʼoge owuwe ọka wiiti1Sa 12:17–18
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 12:17–18Unu maara na ugbu a bụ oge a na-aghọ mkpụrụ ọka wiiti, ma aga m ekpe ekpere ka Onyenwe anyị zite egbe eluigwe na mmiri ozuzo taa, ka unu ghọta ụdị ihe ọjọọ unu mere nʼanya Onyenwe anyị mgbe unu rịọrọ ya sị ya nye unu eze.” Mgbe ahụ Samuel kpọkuru Onyenwe anyị, Onyenwe anyị zidatakwara egbe eluigwe na mmiri ozuzo nʼụbọchị ahụ. Nke a mere ka mmadụ niile tụọ Onyenwe anyị na Samuel egwu.
  • Afọ Jekọb: okpomọkụ nʼehihie, oyi nʼabalịJen 31:40
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 31:40Nʼime oke anwụ nke ehihie ka m rụụrụ gị ọrụ. Rụọkwara gị ọrụ nʼoge oyi na-atụ, nʼabalị ụra sikwa nʼanya m pụọ.

Ọkọchị

  • Eglọn nọdụrụ nʼọnụụlọ ya dị jụụ nʼelu ụlọNkp 3:20, Nkp 3:24
    Amaokwu ndị ahụ
    Nkp 3:20Ehud bịakwutere ya mgbe ọ nọ naanị ya nʼọnụụlọ dị nʼime nʼelu ụlọeze ya, sị, “Enwere m ozi Chineke sị m zie gị.” Dịka eze ahụ si nʼoche ya bilite ọtọ,
    Nkp 3:24Mgbe ọ pụchara, ndị na-ejere eze ozi bịara chọọ ịbanye nʼụlọ ahụ. Ma mgbe ha hụrụ na a kpọchiri ọnụ ụzọ ụlọ ahụ akpọchi, ha kwuru nʼonwe ha sị, “Ọ ga-abụ na ọ na-anyụ nsị nʼụlọ mposi.”
  • Ụlọ oge oyi na ụlọ oge okpomọkụEms 3:15
    Amaokwu ndị ahụ
    Ems 3:15Aga m etida ụlọ ndị niile ha wuru maka oge oyi, na nke ha wuru maka oge okpomọkụ; aga m ebibikwa ụlọ ndị ahụ niile ha ji ọdụ enyi wuo. Ọtụtụ ebe obibi ha niile ka a ga-etitukwa.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
  • Ziba wetaara Devid narị ụyọkọ mkpụrụ osisi2Sa 16:1–2
    Amaokwu ndị ahụ
    2Sa 16:1–2Mgbe Devid gafechara elu ugwu ahụ na-agbada nʼakụkụ nke ọzọ ya, Ziba, onye na-elekọta akụ Mefiboshet, guzo na-eche ya. Ọ chị ịnyịnya ibu bu narị ogbe achịcha abụọ, na otu narị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na narị ụyọkọ mkpụrụ osisi ndị ọzọ, na karama akpụkpọ buru ibu mmanya juru nʼime ya. Eze jụrụ Ziba sị, “Gịnị mere i ji bute ihe ndị a?” Ziba zara sị, “Ịnyịnya ibu ndị a bụ nke ndị ụlọeze ga-anọkwasị. Achịcha na mkpụrụ osisi ndị a bụ nke ndị ikom gị ga-eri. Mmanya a bụ nke ndị na-ada mba nʼọzara ga-aṅụ.”
  • Gedaliya: chịkọtanụ mkpụrụ vaịnị, mkpụrụ osisi oge okpomọkụ na mmanụ nʼiteJer 40:10, Jer 40:12
    Amaokwu ndị ahụ
    Jer 40:10Mụ onwe m ga-ebi na Mizpa ịnọchite anya unu nʼihu ndị Babilọn ga-abịakwute anyị, ma gaanụ chịkọtaa mkpụrụ vaịnị niile, na mkpụrụ niile e kwesiri ịghọkọta nʼoge okpomọkụ, na mmanụ niile. Chikọtanụ ha tinye ha nʼime ite ichebe nri unu. Birikwanụ nʼobodo ahụ niile unu nwetara.”
    Jer 40:12ha niile si nʼebe ahụ ha nọ lọghachikwa nʼala Juda. Ha lọkwutere Gedaliya na Mizpa, site na mba ndị ahụ niile a chụgara ha. Ha chịkọtakwara mmanya vaịnị, na mkpụrụ dị ukwuu, bụ mkpụrụ nke na-acha nʼoge okpomọkụ.
  • Ndanda na-akpakọta nri ya nʼoge ọkọchịIlu 6:6–8, Ilu 30:25
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 6:6–8Gaa mụta ihe site nʼaka ndanda, gị onye umengwụ. Mụta ihe site nʼụzọ ya niile. Ọ bụ ezie na o nweghị eze na-achịkọta ha, maọbụ onyendu, maọbụ ọchịagha, ma ọ na-akpakọta nri ya nʼoge ọkọchị ma na-ewebata nri ya nʼoge owuwe ihe ubi.
    Ilu 30:25Ndanda bụ ndị na-enweghị ume, ma ha na-akpakọta nri ha, dozie nke ha ga-eri nʼoge oyi.
  • Igbugbo ọka nʼebe a na-azọcha ọka nʼoge okpomọkụ, ifufe bufuo yaDan 2:35
    Amaokwu ndị ahụ
    Dan 2:35Mgbe ahụ, e tijisịrị igwe ahụ na ụrọ ahụ, bronz ahụ na ọlaọcha ahụ nakwa ọlaedo ahụ niile. Ha dịka igbugbo ọka nke na-adị nʼebe a na-azọcha ọka nʼoge okpomọkụ. Ifufe fechapụsịrị ha na-ahapụghị ihe ngosi ọbụla. Ma nkume ahụ dakwasịrị ihe ahụ awuru awu mechara ghọọ ugwu dị ukwuu, nke jupụtara ụwa niile.
  • Mgbe osisi fiig na-epupụta akwụkwọ, ọkọchị abịala nsoMat 24:32
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 24:32“Ugbu a mụtanụ ihe site nʼosisi fiig. Mgbe ọbụla alaka ya malitere iwepụta ome dị nro, na-epupụtakwa akwụkwọ ndụ maranụ na ọkọchị na-abịa nso.
  • “ume dị m nʼobi gwụchara, dịka mgbe okpomọkụ nke ọkọchị”Abụ 32:4
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 32:4Ehihie niile na abalị niile, ị tara m ahụhụ, ume dị m nʼobi gwụchara, dịka mgbe okpomọkụ nke ọkọchị. Sela

Oge oyi

  • “Lee, oge oyi agafeela, udu mmiri agabigakwala”Abụk 2:11–13
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụk 2:11–13Lee, oge oyi agafeela, udu mmiri agabigakwala. Okoko osisi epupụtala nʼala; oge eji agụ egwu eruokwala, a na-anụ abụ nduru nʼala anyị niile. Mkpụrụ osisi fiig ebidola ịmịpụta mkpụrụ ya nke mbụ, isi osisi vaịnị na-amịpụta okoko na-esiju ebe niile. Bilie, ma bịa, ọmasịrị m. Onye nke m mara mma! Bịa ka i sooro m.”
  • Nʼọnwa nke itoolu, eze nọdụrụ nʼụlọ oyi ya nʼihu ọkụJer 36:22
    Amaokwu ndị ahụ
    Jer 36:22Nʼọnwa nke itoolu ahụ, mgbe eze nọ nʼụlọ oyi ya, ọkụ na-enwukwa nʼime ite ọkụ dị nʼihu ya.
  • Nʼoge udu mmiri, ndị mmadụ nọ na-ama jijiji nʼama nʼime oke mmiri ozuzoEzr 10:9, Ezr 10:13
    Amaokwu ndị ahụ
    Ezr 10:9Mgbe ụbọchị atọ ahụ zuru, ndị ikom Juda na Benjamin niile zukọrọ na Jerusalem. Nʼụbọchị nke iri abụọ nke ọnwa itoolu, mmadụ niile zukọrọ nọdụ nʼama dị nʼihu ụlọnsọ Chineke. Mmiri dị ukwuu zoro nʼụbọchị ahụ. Ụjọ tụkwara ndị ahụ niile zukọrọ nʼihi oke mmiri ozuzo ahụ na nʼihi okwu ahụ.
    Ezr 10:13Ma ha zakwara sị, “Nke a abụghị ihe anyị ga-eme nʼotu ụbọchị maọbụ nʼụbọchị abụọ, nʼihi na aka ọtụtụ mmadụ nʼime anyị dị na mmehie ahụ. Mmiri na-ezosikwa ike, anyị enwekwaghị ike ịnọgide ruo oge dị anya.
  • Mmemme Ido Ụlọnsọ Nsọ nʼoge oyi; Jisọs jegharịrị nʼịba SolomọnJọn 10:22–23
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 10:22–23Nʼoge ahụ, mmemme icheta mgbe e doro ụlọnsọ ukwu ahụ nsọ ruru na Jerusalem. Ọ bụ oge oke oyi, ma Jisọs nọ na-ejegharị nʼụlọnsọ ukwu, nʼịba Solomọn.
  • “Kpesienụ ekpere ike ka unu ghara ịgba ọsọ a nʼoge oke oyi”Mat 24:20
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 24:20Kpesienụ ekpere ike ka unu ghara ịgba ọsọ a nʼoge oke oyi, maọbụ nʼụbọchị izuike.
  • Ije ụgbọ mmiri ghọrọ ihe ize ndụ mgbe Obubu ọnụ gafere; ha chọrọ ọdụ ụgbọ ha ga-anọ nʼoge oyiỌrụ 27:9, Ọrụ 27:12
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 27:9Anyị tufuru oge nʼebe ahụ. Ije ụgbọ mmiri abụrụkwala nke jupụtakwara nʼihe ize ndụ ugbu a, nʼihi na mmemme Obubu ọnụ nke ndị Juu agafeela. Nʼihi nke a, Pọl dụrụ mmadụ niile ọdụ,
    Ọrụ 27:12Ma ebe ọnụ mmiri a abụghị ebe dị mma ịnọ nʼoge oyi, ndị ka nʼọnụọgụgụ họọrọ ka ụgbọ ahụ gaa nʼihu, nʼolileanya na a ga-eru Fonikisi ebe ha ga-anọdụ nʼoge oyi. Nke a bụ ọnụ mmiri dị na Kriit, nke chere ihu nʼọwụwa anyanwụ nʼakụkụ ugwu na akụkụ ndịda.
  • Ụgbọ mmiri ndị Alegzandria nọrọ nʼoge oyi nʼagwa etiti ahụỌrụ 28:11
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 28:11Anyị nọrọ ihe dịka ọnwa atọ nʼoge oyi, nʼagwa etiti ahụ tutu anyị anyalie ụgbọ. Ọ bụ ụgbọ ndị Alegzandria nke bu ihe a tụrụ atụ a na-akpọ ejima, bụ chi Kastọ na Polụkus.
  • Pọl kpebiri ịnọ na Nikopolis nʼoge oyiTaị 3:12
    Amaokwu ndị ahụ
    Taị 3:12Ana m akwado izitere gị Atemas maọbụ Taịkikọs. Gbalịa bịakwute m na Nikopolis, maka nʼebe ahụ ka m kpebiri ịnọ nʼoge oyi.
  • Pọl gwara Timoti: “Jisie ike bịarute nʼebe a tupu oge oyi eruo”2Tm 4:21
    Amaokwu ndị ahụ
    2Tm 4:21Jisie ike bịarute nʼebe a tupu oge oyi eruo. Yubulọs na-ekele gị, ya na Pudins, na Lainọs na Klọdia na ụmụnna anyị niile.
  • Snoo a tụsara dịka ajị anụ, igirigi snoo a fesasịrị dịka ntụAbụ 147:16
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 147:16Ọ na-atụsa snoo nʼala dịka ajị anụ, na-efesasị igirigi snoo dịka ntụ.

Okwu nʼIlu

  • “Onye na-ekpokọta nʼoge ọkọchị bụ nwa maara ihe”Ilu 10:5
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 10:5Onye na-ekpokọta nʼoge ọkọchị bụ nwa maara ihe, ma nwa ahụ nke na-arahụ ụra nʼoge ọrụ bụ nwa na-eweta ihere.
  • “mkpụrụ mmiri ka ọ na-ada nʼoge ọkọchị maọbụ mmiri na-ezo nʼoge owuwe ihe ubi”Ilu 26:1
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 26:1Ịhụ onye nzuzu a na-enye nsọpụrụ dịka ịhụ mkpụrụ mmiri ka ọ na-ada nʼoge ọkọchị maọbụ mmiri na-ezo nʼoge owuwe ihe ubi.
  • “dịka mmiri oyi si eme ka ahụ dị jụụ nʼoge okpomọkụ owuwe ihe ubi”Ilu 25:13
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 25:13Onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ntute na ndụ, dịka mmiri oyi si eme ka ahụ dị jụụ nʼoge okpomọkụ owuwe ihe ubi.
  • Onye umengwụ adịghị akọ ubi nʼoge yaIlu 20:4
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 20:4Onye umengwụ adịghị arụ ọrụ ubi nʼoge ya. Nʼoge owuwe ihe ubi ọ pụghị ịchọta ihe oriri.

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.