Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Ifufe

Okike

Ifufe nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (32), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

Ifufe ọwụwa anyanwụ

  • Nrọ Fero: ogbe ọka ifufe ọwụwa anyanwụ mere ka ha kpọnwụọJen 41:6, Jen 41:23
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 41:6Emesịa, ọ hụkwara ogbe ọka asaa ọzọ ka ha mịkwara nʼotu ukwu ọka ahụ. Ma ndị a ọ hụrụ kpọnwụsịrị akpọnwụ, fịkpọkwa afịkpọ. Ọ bụ ikuku si nʼọwụwa anyanwụ mere ka ha kpọnwụọ.
    Jen 41:23Ogbe ọka asaa ọzọ mịkwara nʼelu ukwu ọka ahụ, ma ndị a kpọnwụrụ akpọnwụ, fịkpọkwa afịkpọ nʼihi nʼikuku si nʼọwụwa anyanwụ chakpọrọ ha.
  • Ifufe ọwụwa anyanwụ fere ehihie na abalị, bute igurubeỌpụ 10:13
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 10:13Ya mere, Mosis setịpụrụ mkpanaka ya nʼelu ala Ijipt, Onyenwe anyị mere ka ifufe nke si nʼebe anyanwụ si awa fee nʼụbọchị ahụ niile na abalị ahụ niile. Nʼụtụtụ ya, ifufe ahụ si nʼebe anyanwụ si awa bubatara igurube ndị ahụ.
  • Oke ifufe ọwụwa anyanwụ nughachiri osimiri ahụ abalị niileỌpụ 14:21
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 14:21Mgbe ahụ, Mosis setịpụrụ aka ya nʼelu Osimiri Uhie ahụ. Onyenwe anyị ji oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke fere nʼabalị ahụ niile, nughachi osimiri ahụ, mee ka osimiri ahụ kebie ụzọ abụọ, ka ụzọ pụta nʼala osimiri ahụ.
  • Ifufe na-ekpo ọkụ si nʼọwụwa anyanwụ na anwụ mere ka ike gwụ JonaJona 4:8
    Amaokwu ndị ahụ
    Jona 4:8O ruo, mgbe anyanwụ wara, Chineke mere ka ifufe na-ekpo ọkụ site nʼọwụwa anyanwụ, anyanwụ a chara Jona nʼisi nke ukwuu nke mere nʼike gwụsịrị ya. Ọ rịọrọ ka ọnwụ gbuo ya, na-asị, “ọ ga a kaara m mma na m nwụrụ anwụ, karịa na m dị ndụ.”
  • Ifufe ọwụwa anyanwụ na-etiwa ụgbọ mmiri nʼoke osimiriAbụ 48:7, Izk 27:26
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 48:7Ị lara ha nʼiyi dịka oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ si ala ụgbọ mmiri ukwuu nke Tashish nʼiyi.
    Izk 27:26Ndị na-anyagharị ụgbọ mmiri gị na-ebuba gị nʼosimiri. Ma ifufe siri ike nke si nʼọwụwa anyanwụ ga-etiwasị gị nʼetiti osimiri.

Ifufe ndị ọzọ

  • Oke ifufe ọdịda anyanwụ bubara igurube nʼOsimiri UhieỌpụ 10:19
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 10:19Ngwangwa, Onyenwe anyị zitere ikuku nke si nʼebe anyanwụ na-ada bịa, nke bupụrụ igurube ndị ahụ site nʼala Ijipt, buba ha nʼOsimiri Uhie. Ọ dịkwaghị otu igurube fọdụrụ nʼala Ijipt niile.
  • “ifufe si nʼugwu si eweta mmiri ozuzo”Ilu 25:23
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 25:23Dịka ifufe si nʼugwu si eweta mmiri ozuzo, otu a ka ikwu mmadụ okwu azụ si eweta iwe.
  • Oyi na-esite nʼifufe na-agbasa agbasaJob 37:9
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 37:9Oke ifufe na-esite nʼụlọ ya na-abịa, oyi na-esitekwa nʼikuku na-agbasa agbasa.
  • Uwe na-ekpo ọkụ mgbe ụwa dere jii nʼihi ifufe na-esite na ndịdaJob 37:17
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 37:17Gị onye uwe i yi nʼahụ na-ekpo gị ọkụ mgbe ụwa dere jii nʼihi ifufe na-esite na ndịda na-abịa,
  • “Mgbe unu hụrụ na ifufe na-esite na ndịda na-efe, unu na-asị, Oke okpomọkụ ga-adị”Luk 12:55
    Amaokwu ndị ahụ
    Luk 12:55Mgbe unu hụrụ na ifufe na-esite na ndịda na-efe, unu na-asị, Oke okpomọkụ ga-adị, ọ na-emekwa otu ahụ.
  • Mgbe ifufe kpochachara mbara igwe, ọ dịghị onye pụrụ ilekwasị anyanwụ anyaJob 37:21
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 37:21Ugbu a, ọ dịghị mmadụ ọbụla pụrụ ilekwasị anyanwụ anya ka ọ na-achake na mbara igwe, mgbe ifufe ji ngwangwa gabiga mee ka o nwuo ọcha.

Nʼime akụkọ ndị ahụ

  • Ifufe fere nʼelu ụwa, mmiri iju mmiri bido ịtaJen 8:1
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 8:1Ma Chineke chetara Noa na ụmụ anụ ọhịa niile, na ụmụ anụ ụlọ niile so ya nọdụ nʼụgbọ mmiri ahụ. O zitere ifufe, mee ka o fee nʼelu mmiri ahụ ime ka mmiri ahụ bido ịta.
  • Ifufe si nʼosimiri bute nnụnụ kweelỌnụ 11:31
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọnụ 11:31Otu oke ifufe sitere nʼebe Onyenwe anyị nọ bịa si nʼosimiri bute ọtụtụ nnụnụ a na-akpọ kweel. O mere ka nnụnụ ndị a daa nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha, nʼime ogige ya niile. Nnụnụ ndị a fere ihe dịka otu mita site nʼelu ala, nʼakụkụ niile, ruo nʼebe mmadụ pụrụ iji ụkwụ jeruo nʼotu ụbọchị. Ha jupụtakwara ebe niile.
  • Ifufe si nʼọzara tiri akụkụ anọ nke ụlọ ụmụ JobJob 1:18–19
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 1:18–19Mgbe ọ kpụ okwu ya nʼọnụ, onyeozi ọzọ batakwara kwuo sị, “Ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom nọ nʼụlọ nwanne ha nke okenye na-eri na-aṅụ, na mberede, oke ifufe dị ukwuu nke si nʼọzara feere tie akụkụ anọ nke ụlọ ahụ, mee ka ọ dakwasị ha. Ha niile nwụrụ, ma ọ bụkwa naanị m gbapụtara ịgwa gị ihe mere.”
  • Na Horeb, oke ifufe gbawara nkume, emesịa ala ọma jijiji1Ez 19:11
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 19:11Onyenwe anyị sịrị ya, “Pụọ gaa guzo nʼelu ugwu, nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na Onyenwe anyị na-aga isite nʼebe ahụ gafee.” Mgbe ahụ, oke ifufe dị ike gbawara ugwu ahụ, tipịasịa nkume ndị ahụ nʼihu Onyenwe anyị, ma Onyenwe anyị anọghị nʼime ifufe ahụ. Mgbe ifufe ahụ gasịrị, e nwere oke ala ọma jijiji nʼugwu ahụ, ma Onyenwe anyị anọkwaghị nʼala ọma jijiji ahụ.
  • Oke ifufe nʼosimiri fọrọ obere ka o tiwasịa ụgbọ JonaJona 1:4
    Amaokwu ndị ahụ
    Jona 1:4Ma Onyenwe anyị mere ka ifufe dị egwu malite ife nʼelu osimiri ahụ, ebili mmiri bidokwara na-amagharị, chọọ itiwasị ụgbọ mmiri ahụ.
  • Jisọs baara ifufe na osimiri mba, ihe niile dere jụụMat 8:24–27
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 8:24–27Nʼotu ntabi anya, oke ifufe bidoro ife nʼọdọ mmiri ahụ, nke mere na ebili mmiri na-ekpuchi ụgbọ ahụ. Ma ọ nọ na-arahụ ụra mgbe ihe ndị a na-eme. Ndị na-eso ụzọ ya jekwuuru ya, kpọtee ya, sị ya, “Onyenwe anyị, zọpụta anyị! Lee, na anyị nʼala nʼiyi.” Ma ọ zaghachiri, “Unu ndị okwukwe nta, gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu?” Mgbe ahụ o biliri baara ifufe ahụ na ebili mmiri ahụ mba. Ha niile dajụrụ, deere jii. O juru ndị na-eso ụzọ ya anya, mee ka ha jụọ ajụjụ sị, “Ọ bụ ụdị mmadụ dị aṅaa ka nwoke a bụ? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-eme ihe o kwuru.”
  • Ndị na-eso ụzọ ji ike kwọọ ụgbọ, nʼihi na ifufe na-emegide haMak 6:48, Mat 14:24, Jọn 6:18
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 6:48Mgbe ọ hụrụ na ha nọ na nsogbu nʼihi na ikuku na-emegide ha, nʼihe dị ka elekere atọ nke ụtụtụ, o bidoro ịga ije nʼelu mmiri ịbịakwute ha, ma o mere dị ka ọ chọrọ ịgafe ha.
    Mat 14:24Ma nʼoge a ụgbọ mmiri ahụ esitela nʼebe ala dị nso gamie nʼelu osimiri, ebili mmiri na-ebugharịkwa ya, nʼihi na ifufe ahụ na-emegide ya.
    Jọn 6:18Ebili mmiri maliri elu nʼihi nʼoke ifufe bidoro na-efe.
  • Ikuku dị nwayọọ si na ndịda, emesịa oke ifufe a na-akpọ Ifufe Ugwu na Ọwụwa AnyanwụỌrụ 27:13–15
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 27:13–15Mgbe ikuku dị nwayọọ bidoro ifegharị site na ndịda, ha chere na nke a bụ ohere dịrị ha. Nʼihi ya, ha kwọpụrụ ụgbọ nyara ya na-aga nso nso ọnụ mmiri Kriit. Ma mgbe na-adịghị anya, oke ifufe dị egwu nke si nʼagbata ugwu na ọwụwa anyanwụ kuru site nʼagwa etiti ahụ rịdata. Ndị na-anya ụgbọ ahụ gbalịsịrị ike na mbụ ichigharị ihu ụgbọ ahụ ka ọ gaa nʼọnụ mmiri, ma ọ pụghị ime. Anyị hapụrụ ya ka o soro ikuku.
  • Ikuku si na ndịda mere ka ụgbọ Pọl si Rejiọm ruo Pọteọlị nʼụbọchị abụọỌrụ 28:13
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 28:13Site nʼebe ahụ, anyị gara gburugburu tutu rute Rejiọm. Mgbe otu ụbọchị gafere, ikuku bidoro ife site na ndịda. Nʼụbọchị nke abụọ ya, anyị rutere Pọteọlị.

Okwu

  • “Ifufe na-efe gaa na ndịda; feekwa gburugburu gaa nʼugwu, ọ na-efegharị gburugburu ebe niile”Ekl 1:6
    Amaokwu ndị ahụ
    Ekl 1:6Ifufe na-efe gaa na ndịda; feekwa gburugburu gaa nʼugwu, ọ na-efegharị gburugburu ebe niile; na-efe na-enweghịkwa nsọtụ.
  • “Onye na-ele ikuku anya agaghị akụ mkpụrụ ọbụla”Ekl 11:4
    Amaokwu ndị ahụ
    Ekl 11:4Onye na-ele ikuku anya agaghị akụ mkpụrụ ọbụla, onye na-ele igwe ojii anya agaghị ewe ihe ubi.
  • “mmadụ na-apụghị ịmata ụzọ ikuku si aga”Ekl 11:5
    Amaokwu ndị ahụ
    Ekl 11:5Dịka mmadụ na-apụghị ịmata ụzọ ikuku si aga maọbụ otu ndụ ọhụrụ si ebido nʼime afọ nwanyị dị ime, otu a ka o si dịrị ma mmadụ apụghị ịghọta ọrụ Chineke, onye mere ihe niile.
  • “Ifufe na-efe nʼebe ọbụla masịrị ya. I nwere ike nụ ụzụ ya”Jọn 3:8
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 3:8Ifufe na-efe nʼebe ọbụla masịrị ya. I nwere ike nụ ụzụ ya ma ịmataghị ebe o si abịa maọbụ ebe ọ na-aga. Otu a ka ọ dịkwara onye ọbụla a mụrụ site na Mmụọ.”
  • Dịka igbugbo ọka ifufe na-efesasịAbụ 1:4
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 1:4Ma ndị ajọ omume adịghị otu a. Ha dị ka igbugbo ọka nke oke ifufe na-efesasị.
  • “ahịhịa achara nke ikuku na-ebugharị?”Mat 11:7
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 11:7Mgbe ndị ahụ Jọn zitere lara, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ okwu banyere Jọn. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Mgbe unu gara nʼọzara ịhụ Jọn, gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ bụ ahịhịa achara nke ikuku na-ebugharị?
  • E ji ụmara nta na-atụgharị ụgbọ mmiri buru ibu nke oke ifufe na-ebugharịJem 3:4
    Amaokwu ndị ahụ
    Jem 3:4Otu a kwa, ọ bụladị ụgbọ mmiri buru ibu nke ikuku dị ike na-ebugharị nʼosimiri, ka onye na-anya ụgbọ mmiri pụrụ ime ka ọ gaa ebe ọ chọrọ site nʼịtụgharịa ụmara ntakịrị e ji anya ụgbọ.
  • “ebili mmiri oke osimiri mgbe ikuku na-ebugharị ya”Jem 1:6
    Amaokwu ndị ahụ
    Jem 1:6Ma rịọọ nʼokwukwe na-enweghị obi abụọ, nʼihi na onye na-enwe obi abụọ dị ka ebili mmiri oke osimiri mgbe ikuku na-ebugharị ya.

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.