Okike
Agwọ nʼime Baịbụl
Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (28), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.
- Jenesis: agwọ dị aghụghọ karịa anụ ọhịa niileJen 3:1
Amaokwu ndị ahụ
Jen 3:1Agwọ dị aghụghọ karịa ụmụ anụ ọhịa niile Onyenwe anyị Chineke kere. Ọ bịakwutere nwanyị ahụ sị ya, “Ọ bụ ezie na Chineke sị unu erila mkpụrụ si nʼosisi niile dị nʼogige a?”
- Jenesis: agwọ ga-eji afọ ya na-aga, na-eri ajaJen 3:14
Amaokwu ndị ahụ
Jen 3:14Ya mere, Onyenwe anyị Chineke gwara agwọ ahụ sị, “Nʼihi ihe a i mere, “Ihe a bụrụ ọnụ ka ị bụ nʼetiti anụ ụlọ niile na nʼetiti anụ ọhịa niile. Afọ gị ka ị ga-eji na-aga ije, aja ka ị ga na-eri ogologo ụbọchị ndụ gị niile.
- “otu agwọ si akpụ nʼelu nkume” — otu nʼime ihe anọ na-agbagwoju anyaIlu 30:18–19
Amaokwu ndị ahụ
Ilu 30:18–19“Ọ dị ihe atọ na-agbagwoju m anya, apụghị m ịghọta ha; mbaa, ha dị anọ! Otu ugo si efegharị na mbara eluigwe; otu agwọ si akpụ nʼelu nkume, otu ụgbọ mmiri si achọta ụzọ ya nʼoke osimiri; na otu ịhụnanya si eto nʼetiti nwoke na nwaagbọghọ.
- Agwọ nʼime mgbidi: onye na-etida ya maọbụ na-adabere na ya nwere ike ịta yaEkl 10:8, Ems 5:19
- Ndị na-arata agwọ: ọ dịghị uru ma agwọ ahụ ataa tupu a rata yaEkl 10:11
Amaokwu ndị ahụ
Ekl 10:11Ọ bụrụ na agwọ ataa mmadụ tupu e kechie ya ọnụ, ọ dịkwaghị uru ọ bara na e kechiri ya ọnụ.
- Ajụala na-emechi ntị ya nʼolu onye na-arata agwọAbụ 58:4–5
Amaokwu ndị ahụ
Abụ 58:4–5Ha na-agbọpụta nsi nʼọnụ ha dịka agwọ, na-emechi ntị ha dịka ajụala ntị chiri, nke na-adịghị anụ olu onye mgbaasị na-akpọpụta ya, nʼagbanyeghị otu ǹka onye ahụ si dị.
- Ajụala ndị a na-apụghị ịrataJer 8:17
Amaokwu ndị ahụ
Jer 8:17“Lee, ana m ezibata agwọ ọjọọ, ndị na-atagbu atagbu, nʼetiti unu. Ajụala nke ọ dịkwaghị ụra ga-arata ha. Ana m ezibata ha ka ha taa unu.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
- Ajụala dị nʼakụkụ ụzọ na-ata ịnyịnya nʼikiri ụkwụ, onye na-agba ya adalaa azụJen 49:17
Amaokwu ndị ahụ
Jen 49:17Dan ga-adị ka agwọ dị nʼakụkụ okporoụzọ, dịka ajụala dị nʼụzọ ọhịa, nke na-ata ịnyịnya nʼikiri ụkwụ, si otu a mee ka onye na-agba ịnyịnya dalaa azụ.
- Ọzara ahụ nwere agwọ ọjọọ na akpịDit 8:15
Amaokwu ndị ahụ
Dit 8:15Onye duuru gị nʼime ọzara ukwu ahụ dị egwu, ebe agwọ ọjọọ na akpị jupụtara, ebe na-ekpo ọkụ, nke mmiri na-adịghị. O sitere na nkume nye gị mmiri ọṅụṅụ
- Negev: ala ọdụm, ajụala na agwọ na-efe efeAịz 30:6
Amaokwu ndị ahụ
Aịz 30:6Amụma banyere ụmụ anụmanụ bi na Negev. Nʼala ahụhụ na mkpagbu, nke ọdụm na nne ọdụm, nke ajụala na agwọ ọjọọ na-efe ka ọkụ, ndị nnọchite anya obodo na-ebu akụ ha niile nʼelu ịnyịnya ibu, na-ebukwa akụnụba ha dị oke ọnụahịa nʼelu ịnyịnya kamel, na-agakwuru mba ahụ na-abaghị uru,
- Kụwaa akwa ajụala, ajụala apụtaAịz 59:5
Amaokwu ndị ahụ
Aịz 59:5Ha na-avụ akwa ajụala, na-akpakwa akwụ udide. Onye ọbụla riri akwa ha ga-anwụ, mgbe ọbụla otu kụwara, ọ bụ agwọ ajụala na-esi nʼime ya apụta.
Nʼime akụkọ ndị ahụ
- Mkpanaka Mosis ghọrọ agwọ; ọ gbapụrụ ọsọ, emesịa jide ya nʼọdụỌpụ 4:3–4
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 4:3–4Onyenwe anyị sịrị ya, “Tụpụ ya nʼala.” Mosis tụpụrụ ya nʼala. Ma otu mgbe ahụ, ọ ghọrọ agwọ. Mosis sitere nʼebe agwọ ahụ nọ gbapụ ọsọ. Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ọzọ sị ya, “Jide agwọ ahụ aka nʼọdụdụ ya.” Mgbe Mosis mere nke a, agwọ ahụ ghọghachikwara mkpanaka.
- Mkpanaka Erọn ghọrọ agwọ, loo mkpanaka ndị majikiỌpụ 7:10–12
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 7:10–12Mgbe ahụ, Mosis na Erọn jekwuuru Fero mee dịka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu. Erọn tụpụrụ mkpanaka ya nʼala nʼihu Fero na ndị ozi ya. Ọ ghọrọ agwọ. Ma Fero kpọkọtara ndị maara ihe, na ndị mgbaasị, na ndị majiki nọ nʼIjipt. Ha bịara mee ụdị ihe ịrịbama ahụ Mosis na Erọn mere site nʼihe nzuzo nke akaọrụ ha. Onye ọbụla nʼime ha tụpụrụ mkpanaka ya, nke ghọkwara agwọ. Ma mkpanaka ahụ Erọn tụpụrụ, nke ghọrọ agwọ, loro mkpanaka ndị ahụ niile ndị Ijipt tụpụrụ.
- Agwọ ọjọọ tara ụmụ Izrel nʼọzara, ọtụtụ nwụọỌnụ 21:6
Amaokwu ndị ahụ
Ọnụ 21:6Ya mere, Onyenwe anyị zitere agwọ ọjọọ na-ata ata nʼetiti ha. Agwọ ndị a tagbukwara ọtụtụ nʼime ụmụ Izrel.
- Mosis kpụrụ agwọ bronz nʼelu osisi; onye a tara lee ya anya dị ndụỌnụ 21:8–9
Amaokwu ndị ahụ
Ọnụ 21:8–9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Kpụọ otu agwọ yiri agwọ ndị a. Kwụba ya nʼọnụ ogologo osisi nke ị ga-amanye nʼala ebe mmadụ niile ga-ahụ ya anya. Onye ọbụla agwọ ọjọọ a tara ga-adị ndụ ma ọ bụrụ na ọ ga-ewelite anya ya elu lekwasị agwọ ahụ ị kwụbara nʼelu osisi ahụ.” Ya mere, Mosis ji bronz kpụta agwọ yiri otu nʼime agwọ ndị ahụ, tinye ya nʼọnụ osisi dị ogologo. Onye ọbụla kwa agwọ ahụ tara nke welitere anya ya elu lee agwọ bronz ahụ anya, dịkwara ndụ.
- Hezekaya tipịara agwọ bronz ahụ, Nehushtan, nʼihi na a na-esure ihe na-esi isi ụtọ nye ya2Ez 18:4
Amaokwu ndị ahụ
2Ez 18:4O wepụrụ ebe niile dị elu, kurisie ogidi nsọ niile, gbutukwa ogidi Ashera niile. O tipịakwara agwọ bronz ahụ Mosis mere, nʼihi na ruo nʼoge ahụ, ụmụ Izrel na-esure aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ya. (A kpọrọ ya Nehushtan.)
- Na Malta, ajụala okpomọkụ ọkụ chụpụtara tụhịkọrọ onwe ya nʼaka PọlỌrụ 28:3–4
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 28:3–4Nʼoge Pọl na-achịkọta nkụ itinye nʼọkụ a, otu agwọ ajụala sitere nʼime nkụ na-enwu ọkụ mapụta nʼihi okpomọkụ tụhịkọ onwe ya nʼaka ya. Mgbe ndị obodo ahụ hụrụ agwọ ahụ ka ọ tụhịkọtara onwe ya nʼaka ya, ha gwarịtara onwe ha, “nʼezie a, nwoke a bụ ogbu mmadụ, a naghị eji ọkụ enyo ya. Ọ bụ ezie na azọpụtara ya site oke mmiri, ma ikpe ziri ezi ekweghị ka ọ dị ndụ.”
- Pọl fepụrụ ya; ndị agwa etiti ahụ chere ka ahụ ya zaaỌrụ 28:5–6
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 28:5–6Ma Pọl fepụrụ agwọ ahụ nʼaka ya, mee ka ọ daba nʼọkụ, ọ dịghịkwa ihe mere ya. Ha na-ele anya ma aka ya ọ ga-aza, maọbụ na ọ ga-ada nwụọ. Ma mgbe ha chegidere hụ na o nweghị ihe mere ya, ha gbanwere obi ha bido na-ekwu, na ọ bụ chi.
- Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ike ịzọ agwọ na akpị ụkwụLuk 10:17, Luk 10:19
Okwu
- “nweenụ uche dịka agwọ. Burunu ndị a na-apụghị ịta ụta dịka nduru”Mat 10:16
Amaokwu ndị ahụ
Mat 10:16“Ana m ezipu unu dị ka atụrụ nʼetiti agụ. Ya mere, nweenụ uche dịka agwọ. Burunu ndị a na-apụghị ịta ụta dịka nduru.
- Olee nna ga-enye nwa ya agwọ mgbe ọ rịọrọ azụ?Mat 7:10, Luk 11:11
- Mmanya: “ọ na-ata dịka agwọ na-atụkwa dịka ajụala”Ilu 23:31–32
Amaokwu ndị ahụ
Ilu 23:31–32Elekwasịla mmanya anya mgbe ọ na-acha ọbara ọbara, mgbe ọ na-ezipụta ọdịdị ya nʼiko mgbe ọ na-asụgharị nke ọma nʼime iko. Nʼikpeazụ, ọ na-ata dịka agwọ na-atụkwa dịka ajụala.
- “Ha na-eme ire ha ka ha dị nkọ dịka nke agwọ”Abụ 140:3
Amaokwu ndị ahụ
Abụ 140:3Ha na-eme ire ha ka ha dị nkọ dịka nke agwọ; elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha. Sela
- “Ha ga-aracha aja dịka agwọ”Mai 7:17
Amaokwu ndị ahụ
Mai 7:17Ha ga-aracha aja dịka agwọ, na dịka anụ dị iche iche, nke na-akpụ akpụ nʼala. Ha ga-eji ịma jijiji si nʼebe ha e wusiri ike pụta. Nʼihi egwu ha, ha ga-abịakwute Onyenwe anyị bụ Chineke anyị. Ha ga-atụkwa egwu gị.
- “Ijipt ga-eme mkpọtụ, dịka mkpọtụ nke agwọ na-agba ọsọ na-eme”Jer 46:22
Amaokwu ndị ahụ
Jer 46:22Ijipt ga-eme mkpọtụ, dịka mkpọtụ nke agwọ na-agba ọsọ na-eme, mgbe ndị iro ya ji ike na-abịakwasị ya. Ha ga-eji anyụike bịakwasị ya, dịka ndị na-egbutu osisi.
Isi mmalite
Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.