Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Osisi sida nke Lebanọn

Okike

Osisi sida nke Lebanọn nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (32), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

  • Solomọn kwuru banyere osisi, site na sida nke Lebanọn ruo na hisọp na-eto na mgbidi1Ez 4:33
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 4:33O kwuru okwu banyere osisi, site na osisi sida nke Lebanọn ruo nʼahịhịa hisọp nke na-eto na mgbidi aja, na ihe banyere ụmụ anụmanụ na anụ ufe, na anụ na-akpụgharị nʼala nakwa azụ.
  • Abụ ọma: osisi sida nke Lebanọn na-aṅụju mmiriAbụ 104:16
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 104:16A na-agba osisi niile nke Onyenwe anyị mmiri nke ọma, osisi sida nke Lebanọn nke ọ kụrụ.
  • Nʼoge Solomọn, osisi sida dị ọtụtụ dịka osisi sikamọ nʼala ala ugwu1Ez 10:27, 2Ih 1:15
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 10:27Eze mere ka ọlaọcha baa ụba dịka nkume efu na Jerusalem. O mekwara ka osisi sida dị ọtụtụ dịka osisi sikamọ nke dị nʼala ala ugwu dị iche iche.
    2Ih 1:15Eze mere ka ọlaọcha na ọlaedo baa ụba na Jerusalem, dịka nkume efu. O mekwara ka osisi sida dị ọtụtụ dịka osisi sikamọ nke dị nʼala ala ugwu dị iche iche
  • Ndị mmadụ ga-eji osisi sida dochie osisi sikamọ e gbuturuAịz 9:10
    Amaokwu ndị ahụ
    Aịz 9:10“Nkume brik ndị ahụ adakpọsịala ma anyị ga-eji nkume a waziri awazi wughachi ha; ọ bụ ezie na e gbutusịala osisi sikamọ niile anyị ji wuo ụlọ anyị, ma anyị ga-eji osisi ọma sida dochie ha.”
  • Osisi sida si Lebanọn bụ osisi ụgbọ mmiri TaịaIzk 27:5
    Amaokwu ndị ahụ
    Izk 27:5Osisi e ji wuo ahụ ụgbọ gị sitere nʼosisi junipa nke si Senia; ọ bụkwa osisi sida nke si Lebanọn ka e ji jidesie ihu ụgbọ ahụ ike.
  • E ji osisi sida, hisọp na eriri ogho uhie mee mmemme ime ka mmadụ dị ọchaLev 14:4, Ọnụ 19:6
    Amaokwu ndị ahụ
    Lev 14:4onye nchụaja ga-enye iwu ka e weta nnụnụ abụọ dị ndụ, na ụfọdụ osisi sida, na eriri ogho uhie, na hisọp, maka onye ahụ a ga-emere mmemme ịdị ọcha.
    Ọnụ 19:6Onye nchụaja ga-ewere osisi sida, na osisi hisọp, na ogho uhie, tụba ha nʼetiti ebe ahụ a kpọrọ nwa nne ehi ahụ ọkụ.

Iji osisi sida wuo ụlọ

  • Hiram eze Taịa zitere Devid osisi sida, ndị ǹka osisi na ndị na-awa nkume maka ụlọeze ya2Sa 5:11
    Amaokwu ndị ahụ
    2Sa 5:11Hiram bụ Eze Taịa, zitere Devid osisi sida e ji ewu ụlọ, na ndị ǹka osisi, ndị na-ewu ụlọ. Ha wuuru Devid ụlọeze.
  • Devid: “mụ onwe m na-ebi nʼụlọ sida, ma igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị dị nʼokpuru ụlọ ikwu”1Ih 17:1
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ih 17:1Mgbe Devid nọsara ahụ nʼụlọeze ya, ọ sịrị Netan onye amụma, “Lee, mụ onwe m na-ebi nʼụlọ sida, ma igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị dị nʼokpuru ụlọ ikwu.”
  • Solomọn rịọrọ Hiram osisi sida; ọ dịghị onye maara igbutu osisi dịka ndị Saịdọn1Ez 5:6
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 5:6“Ya mere, nye iwu ka e gbutuoro m osisi sida nke Lebanọn. Ndị ọrụ m ga-esoro ndị nke gị nʼọrụ a. Aga m akwụ gị ihe ọbụla i kpebiri bụ ụgwọ ọrụ ha. Ị maara na anyị enweghị ndị ọka igbutu osisi dịka ndị Saịdọn.”
  • E budara osisi ndị ahụ nʼosimiri, kekọta ha ka ha sere nʼelu mmiri1Ez 5:8–9, 2Ih 2:16
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 5:8–9Ya mere, Hiram zigaara Solomọn ozi sị, “Anụla m ozi i ziteere m. Aga m emekwa ihe niile dịka i kwuru banyere i budatara gị osisi sida na osisi junipa. Ndị ohu m ga-esi nʼugwu Lebanọn budaruo ha nʼosimiri Mediterenịa. A ga-ekekọta ha ọnụ, zitere gị ha nʼebe ị chọrọ ịnọ buru ha. Mgbe ha sere nʼelu mmiri rute ebe ị chọrọ, anyị ga-atọsakwara gị ha, ka i buru ha. Ma gị onwe gị ga-eme ihe bụ ọchịchọ m, site na-inye ndị ụlọ m ihe oriri.”
    2Ih 2:16Anyị ga-egbutu osisi niile ị chọrọ site nʼugwu Lebanọn, sitekwa nʼosimiri budata ha obodo Jopa, ebe i nwere ike isite buruo ha Jerusalem.”
  • E ji ọka wiiti, ọka balị, mmanya na mmanụ oliv kwụọ ndị Hiram na-egbutu osisi ụgwọ2Ih 2:10
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ih 2:10Aga m enye ndị ọrụ gị, bụ ndị na-awa osisi, narị puku bushel na iri puku bushel ọka wiiti abụọ a kwọrọ akwọ, na narị puku bushel na iri puku bushel ọka balị abụọ, na narị puku galọọnụ ite mmanya vaịnị na iri galọọnụ abụọ, nakwa narị puku galọọnụ mmanụ na iri galọọnụ mmanụ oliv abụọ.”
  • Ndị Izrel 30,000 rụrụ ọrụ na Lebanọn, 10,000 kwa ọnwa nʼusoro1Ez 5:13–14
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 5:13–14Eze Solomọn, sitere nʼakụkụ Izrel niile kpọbata ndị ọrụ mmanye ọnụọgụgụ ha dị iri puku atọ. Nʼotu ọnwa, ọ na-eziga puku mmadụ iri nʼime ndị a ka ha gaa Lebanọn ịrụ ọrụ. Nʼọnwa ọzọ, ọ na-ezigakwa puku mmadụ iri ka ha gaa gbanwee ndị buuru ụzọ gaa. Nʼụzọ dị otu a, otu ụzọ nʼime iri puku mmadụ atọ ndị a na-anọ na Lebanọn otu ọnwa maka ịrụ ọrụ, ma ha na-alọta zuo ike ọnwa abụọ. Adoniram bụ onyeisi ndị ọrụ mmanye a.
  • Solomọn nyere Hiram obodo iri abụọ na Galili maka osisi sida na junipa1Ez 9:11
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 9:11Eze Solomọn nyere Hiram, eze Taịa, iri obodo abụọ dị na Galili, nʼihi osisi sida, na osisi junipa, na ọlaedo niile Hiram butere ya dịka o si chọọ ya.
  • E ji osisi sida mee ihe mgbachị elu ụlọnsọ1Ez 6:9–10
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 6:9–10Mgbe o wusiri ụlọnsọ ukwu a, Solomọn jiri ibe osisi na osisi dị obosara e si nʼosisi sida mepụta, wuo ihe mgbachị elu ụlọ ahụ. O wuru ọtụtụ ọnụụlọ nta nʼakụkụ mgbidi gbara ụlọnsọ ukwu ahụ gburugburu. Ọ bụkwa osisi sida ka e ji jikọta mgbidi ụlọ ahụ na ọnụụlọ nta ndị ahụ. Ịdị elu nke ọbụla nʼime ha bụ mita abụọ na ọkara.
  • Nʼime ya, osisi sida a pịrị apị nwere ụdịdị ugbo na okoko osisi; ọ dịghị nkume a hụrụ1Ez 6:15, 1Ez 6:18
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 6:15O ji osisi sida dị obosara machie ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ site nʼakụkụ ala ruo nʼelu ya. E jikwa osisi junipa machie ala ụlọ ahụ niile.
    1Ez 6:18Ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ bụ osisi sida, nke a tụrụ ihe ọtụtụ nke oyiyi afụfa ọhịa na okoko osisi wasara awasa nʼelu ya. Ihe niile dị nʼime ụlọ ahụ bụ osisi sida, adịghị ahụ nkume ọbụla anya.
  • Ogige dị nʼime: ahịrị nkume a wara awa atọ na otu ahịrị osisi sida1Ez 6:36
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 6:36O wuru ogige nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ bụ ahịrị nkume atọ e doziri edozi na otu ahịrị osisi sida a kwachara nke ọma ka e ji wuo ogige a.
  • Ụlọ Oke Ọhịa Lebanọn guzoro nʼelu ahịrị anọ nke ogidi sida1Ez 7:2–3
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 7:2–3O wuru ụlọeze ukwu aha ya bụ Oke Ọhịa Lebanọn, nke ogologo ya dị iri mita ise, obosara ya dị iri mita abụọ na ise. Otu a kwa, ịdị elu ya dị mita iri na ise. Osisi sida ukwu e ji rụọ elu ya ka e mere ka ha nọkwasị nʼelu ogidi e doro nʼahịrị nʼahịrị. Ahịrị ogidi ndị a dịkwa anọ. Ọ bụkwa osisi sida ka e ji machie elu ụlọ ahụ. A kụkwasịrị osisi ndị a nʼelu osisi sida ukwu ndị a a wara awa, ndị e mere ka ha nọkwasị nʼogidi ndị ahụ. Ọnụọgụgụ osisi ndị ahụ bụ iri anọ na ise. Ọ bụkwa iri na ise ka e nwere nʼahịrị ọbụla.
  • Ndị a dọtara nʼagha lọtara budatara osisi sida site na Lebanọn ruo JopaEzr 3:7
    Amaokwu ndị ahụ
    Ezr 3:7Ha nyere ndị ọrụ na-edo nkume na ndị ọkpọ ǹtu ego, nyekwa ndị Saịdọn na ndị Taịa ihe oriri, na ihe ọṅụṅụ na mmanụ oliv, ka ha nwee ike isite nʼosimiri Lebanọn budata osisi sida ndị ahụ rute Jopa, dịka ikike Sairọs bụ eze Peshịa si kwadoo ya.
  • Otu eze ji osisi sida machie ụlọeze ya, tee ya ọbara ọbaraJer 22:14
    Amaokwu ndị ahụ
    Jer 22:14Onye na-asị, ‘Aga m ewuru onwe m ụlọeze buru ibu, nke ọnụụlọ dị nʼụlọ elu ya sara ezi mbara.’ Ya mere, ọ tinyere oghereikuku sara mbara nʼụlọ ahụ, jirikwa osisi sida machie elu ya, werekwa penti na-acha uhie uhie chọọ ya mma.
  • “Ogidi nke ụlọ anyị bụ osisi sida”Abụk 1:17
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụk 1:17Ogidi nke ụlọ anyị bụ osisi sida, ntuhie ya bụkwa osisi fịa.

Okwu na akụkọ ifo

  • Akụkọ ifo Jehoash: uke rịọrọ sida ka o nye nwa ya nwoke nwa ya nwanyị2Ez 14:9
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 14:9Ma Jehoash eze Izrel zighachiri ozi nye Amazaya eze Juda sị ya, “Uke dị na Lebanọn zigaara osisi sida nke dị na Lebanọn ozi, sị ya, ‘Nye nwa m nwoke nwa gị nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, anụ ọhịa nke dị na Lebanọn gafetere ebe ahụ, zọpịa uke ahụ.
  • Akụkọ ifo Jotam: ọkụ si nʼogwu ọhịa rechapụrụ osisi sidaNkp 9:15
    Amaokwu ndị ahụ
    Nkp 9:15“Ogwu ọhịa sịrị osisi niile, ‘Ọ bụrụ nʼezie na unu chọrọ ite m mmanụ ka m bụrụ eze unu, bịanụ zere ndụ nʼokpuru ndo m kpọkwanụ isiala nye m. Ọ bụrụ na unu ajụ ime nke a, ka ọkụ si nʼogwu ọhịa pụta rechapụ sida niile dị na Lebanọn!’
  • Ndị Amọrait, ogologo ha dịka osisi sida, ike ha dịka osisi ookEms 2:9
    Amaokwu ndị ahụ
    Ems 2:9“Ma a lara m ndị Amọrait nʼiyi nʼihu ha, ndị ahụ dị ogologo dịka osisi sida, ndị sikwara ike dịka osisi ook. Alara m mkpụrụ ha dị nʼelu, na mgbọrọgwụ ha niile dị nʼokpuru nʼiyi.
  • Abụ ọma: “ha ga-ebukwa ibu dịka osisi ukwu sida nke Lebanọn”Abụ 92:12
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 92:12Ma ndị ezi omume ga-awa igu dịka osisi nkwụ; ha ga-ebukwa ibu dịka osisi ukwu sida nke Lebanọn,
  • “Olu Onyenwe anyị na-etiwa osisi ukwu sida”Abụ 29:5
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 29:5Olu Onyenwe anyị na-etiwa osisi ukwu sida; Onyenwe anyị na-etiwasị osisi ukwu sida nke Lebanọn.
  • “dịkwa oke ọnụ dịka osisi sida ya”Abụk 5:15
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụk 5:15Ogwe ụkwụ ya abụọ dị ka ogidi e ji nkume mabụl kpụọ, nke e ji ọlaedo a ṅụchara anụcha tọọ ntọala ha. Ụdịdị ya dị ka Lebanọn, dịkwa oke ọnụ dịka osisi sida ya.
  • Osisi sida na-aṅụrị: “ugbu a ọ dịkwaghị onye ga-esogbu anyị ọzọ”Aịz 14:8
    Amaokwu ndị ahụ
    Aịz 14:8Ọ bụladị osisi junipa na osisi sida niile nke Lebanọn na-aṅụrị ọṅụ megide gị na-asị, “Agbajiela ike gị; ugbu a ọ dịkwaghị onye ga-esogbu anyị ọzọ.”
  • “Kwasie akwa ike, gị osisi junipa, nʼihi na osisi sida adaala”Zek 11:2
    Amaokwu ndị ahụ
    Zek 11:2Kwasie akwa ike, gị osisi junipa, nʼihi na osisi sida adaala, nʼihi na e mebiela osisi ukwu ndị niile ahụ mabigara mma oke. Kwasienụ akwa ike, unu osisi ook nke Bashan, nʼihi na e gbudachala oke ọhịa ahụ!

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.