Okike
Ewu nʼime Baịbụl
Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (34), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.
- Ewu so nʼanụmanụ Izrel nwere ike iriDit 14:4
Amaokwu ndị ahụ
Dit 14:4Ndị a bụ anụmanụ unu ga-eri: ehi, atụrụ, na ewu,
- Ribeka ji ụmụ ewu abụọ sie nri Aịzik kacha amasịJen 27:9
Amaokwu ndị ahụ
Jen 27:9Gaa ugbu a nʼigwe anụ ụlọ wetara m ụmụ nwa ewu abụọ dị mma ka m jiri ha siere nna gị nri dị ụtọ, ụdị ahụ na-amasị ya.
- Akpụkpọ ewu nʼaka na nʼolu Jekọb, ka ọ dị ka ỊsọJen 27:16
Amaokwu ndị ahụ
Jen 27:16O jikwa akpụkpọ anụ ụmụ ewu nwere ajị ajị kee Jekọb nʼaka na nʼakụkụ olu ya na-akwọ mụrụmụrụ.
- Ụmụnne Josef bịanyere uwe ya nʼọbara nwa ewuJen 37:31
Amaokwu ndị ahụ
Jen 37:31Ụmụnne ya gburu otu ewu were uwe Josef bịanye nʼime ọbara ya.
- Juda kwere nkwa inye otu nwa ewu site nʼigwe ya dịka ụgwọJen 38:17, Jen 38:20
- Onyinye Jekọb nyere Ịsọ gụnyere nne ewu 200 na mkpi 20Jen 32:14
Amaokwu ndị ahụ
Jen 32:14Ọ kwadoro inye ya: narị nne ewu abụọ (200), iri mkpi abụọ (20), narị nne atụrụ abụọ (200), iri ebule abụọ (20)
- Gidiọn sie nwa ewu: anụ ya nʼime nkata, mmiri ofe ya nʼiteNkp 6:19
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 6:19Gidiọn mere ngwangwa laa nʼụlọ ya, gbuo otu nwa ewu, sie ya. O jikwa ụtụ ọka mee achịcha, nke ihe na-eko achịcha na-adịghị nʼime ya. Emesịa, o tinyere anụ ahụ nʼime nkata, wụnyekwa ofe nʼime ite, buru ha jekwuru Mmụọ ozi ahụ, ebe ọ nọ na-eche ya nʼokpuru osisi ook ahụ.
- Manoa chụrụ nwa ewu nʼelu nkumeNkp 13:19
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 13:19Mgbe ahụ, Manoa weere nwa ewu, ya na ụfọdụ mkpụrụ ọka, jiri ha chụọrọ Onyenwe anyị aja nʼelu nkume. Mgbe ahụ kwa, Onyenwe anyị mere ihe dị ebube nke ukwuu mgbe Manoa na nwunye ya guzo na-ele anya:
- Jesi ji Devid ziga Sọl achịcha, karama akpụkpọ mmanya na nwa ewu1Sa 16:20
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 16:20Ya mere Jesi zipụrụ Devid ka o jekwuru Sọl. O mekwara ka Devid duru otu ịnyịnya ibu nke o bukwasịrị achịcha, na otu karama akpụkpọ mmanya, na otu nwa ewu, onyinye a na-enye Sọl.
- Nebal onye Kamel nwere otu puku ewu1Sa 25:2
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 25:2Otu nwoke dị, onye obodo Maon, onye ikwu Kaleb, nke nwere akụnụba. O nwere igwe atụrụ dị puku atọ, na otu puku ewu, ndị ọ nọ nʼubi nʼoge a na-akpụchapụ ajị ha nʼobodo Kamel.
- Nwanne okenye ahụ: “o nweghị oge i nyere m ọ bụladị nwa ewu”Luk 15:29
Amaokwu ndị ahụ
Luk 15:29Ma ọ zara nna ya sị, ‘Lee ọtụtụ afọ niile ndị a ka m nọọ na-ejere gị ozi, enupukwaghị m isi nʼiwu gị nʼụzọ ọbụla. Ma o nweghị oge i nyere m ọ bụladị nwa ewu sị mụ na ndị enyi m jiri ya mee oriri.
- Mmiri ara ewu zuru ezu iji zụọ ezinaụlọIlu 27:27
Amaokwu ndị ahụ
Ilu 27:27Ị ga-enwe mmiri ara ewu nke ga-ezuru gị na ndị ezinaụlọ gị nri, na nke ga-edozi ahụ ndị odibo nwanyị gị.
- Ewu na-ewetara mmadụ ego ọnụahịa ubiIlu 27:26
Amaokwu ndị ahụ
Ilu 27:26Ụmụ atụrụ ga-enye gị uwe ị ga-eyi, ụmụ ewu ga-enyekwa gị ego ọnụahịa ala ubi gị.
Ajị ewu
- Akwa mgbochi iri na otu e ji ajị ewu mee kpuchiri elu ụlọ nzuteỌpụ 26:7, Ọpụ 36:14
- Ndị inyom nwere ǹka kpara ajị ewuỌpụ 35:26
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 35:26Ụfọdụ ụmụ nwanyị kwa ji onyinye ǹka pụrụ iche ha nwere kpaa ajị ewu dịka akwa pụrụ iche.
- Mikal tinyere ajị ewu nʼebe isi ihe a kpụrụ akpụ ọ tọgbọrọ nʼihe ndina Devid1Sa 19:13
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 19:13Emesịa, Mikal kwagharịrị ihe ndina Devid, were ihe a kpụrụ akpụ tụkwasị nʼelu ya, werekwa akwa kpuchie ya, tinye ihe ajị ewu nʼebe isi ya.
- E mere ka ihe niile e ji ajị ewu mee dị ọcha mgbe agha Midia gasịrịỌnụ 31:20
Amaokwu ndị ahụ
Ọnụ 31:20Debekwanụ uwe niile ọcha, ya na ihe niile e ji akpụkpọ anụ na ajị ewu, maọbụ osisi, mee.”
Nʼime Iwu
- E nwere ike isite nʼatụrụ maọbụ nʼewu wepụta nwa atụrụ NgabigaỌpụ 12:5
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 12:5Nwa atụrụ a ga-eweta ga-abụ oke gbara naanị otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ ọbụla nʼahụ ya. Unu nwere ike họrọ atụrụ maọbụ ewu.
- Josaya nyere ụmụ atụrụ na ewu 30,000 maka Ngabiga2Ih 35:7
Amaokwu ndị ahụ
2Ih 35:7Josaya nyere ndị niile nọ nʼebe ahụ onyinye igwe ewu na atụrụ ọnụọgụgụ ya dị iri puku atọ, nke ha ga-eji chụọ aja Mmemme Ngabiga. O nyekwara ha puku oke ehi atọ site nʼakụ eze.
- Nwa ewu a mụrụ ọhụrụ na-anọnyere nne ya ụbọchị asaaLev 22:27
Amaokwu ndị ahụ
Lev 22:27“Mgbe a mụrụ nwa ehi, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ ewu ọhụrụ, a ga-ahapụ ya na nne ya ụbọchị asaa. Site nʼụbọchị nke asatọ gaa nʼihu a ga-anabata ya dịka onyinye ihe oriri i ji chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
- “Unu esikwala nwa ewu nʼime mmiri ara nne ya”Ọpụ 23:19
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 23:19“Wetanụ mkpụrụ mbụ niile nke ala ubi unu, bụ ndị kachasị mma, nʼụlọ Onyenwe anyị bụ Chineke unu. “Unu esikwala nwa ewu nʼime mmiri ara nne ya.
- Ụbọchị Mkpuchi Mmehie: a na-efe nza nʼisi mkpi abụọ; a na-ahapụ otu ka ọ gaa nʼọzaraLev 16:8–10, Lev 16:21–22
Amaokwu ndị ahụ
Lev 16:8–10Ọ ga-efe nza nʼisi mkpi abụọ ahụ, ịchọpụta nke dịrị Onyenwe anyị nke ọzọ abụrụ nke ọ ga-ahapụ. Mkpi ahụ nza mara ga-abụ nke Onyenwe anyị, ya ka Erọn ga-egbu dịka aja mmehie. Ma mkpi ahụ nke nza mara dịka ewu na-ewere ọnọdụ iburu mmehie ka a ga-eche na ndụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi iji ya mee mmemme mkpuchi mmehie, a ga-ahapụ ya ka o buru mmehie niile kpafuo nʼọzara.
Lev 16:21–22Ọ ga-ebikwasị aka ya abụọ nʼisi ya, kwupụta ajọ omume na nnupu isi ụmụ Izrel niile, mmehie ha niile, bokwasị ha mkpi ahụ nʼisi. Ọ ga-ezipụ mkpi ahụ pụọ nʼime ọzara site nʼaka onye ahụ a họpụtara ime nke a. Nʼụzọ dị otu a, mkpi ahụ ga-eburu mmehie ndị ahụ niile baa nʼebe mmadụ ọbụla na-ebighị. Nwoke ahụ ga-ahapụkwa ya nʼọzara.
Ewu ọhịa
- “Ugwu niile dị elu dịịrị ewu ọhịa”Abụ 104:18
Amaokwu ndị ahụ
Abụ 104:18Ugwu niile dị elu dịịrị ewu ọhịa; nʼọgba dị na nkume ka ewi nkume na-ezo onwe ha.
- Sọl chọrọ Devid nʼetiti ọgba nkume nke Ewu Ọhịa1Sa 24:2
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 24:2Sọl chịịrị puku ndị agha atọ a zụrụ nke ọma site nʼIzrel niile, pụọ ịchọ Devid na ndị ikom ya nʼetiti ọgba nkume, na nʼakụkụ ụzọ dị warawara nke Ewu Ọhịa.
- “Ị maara mgbe ewu ọhịa bi nʼelu ugwu ji amụ nwa?”Job 39:1
Amaokwu ndị ahụ
Job 39:1“Ị maara mgbe ewu ọhịa bi nʼelu ugwu ji amụ nwa? O nweela mgbe ị ji hụ nne ele ka ọ na-amụpụta nwa ya?
- E nwere ike iri ewu ọhịa na anịgọDit 14:5
Amaokwu ndị ahụ
Dit 14:5na ele nta, na mgbada, na atụrụ ọhịa, na ewu ọhịa, ele ukwu, na anịgọ bi nʼelu ugwu.
Okwu
- “Agịrị isi gị dị ka igwe ewu nke na-arịda nʼakụkụ ugwu Gilead”Abụk 4:1, Abụk 6:5
Amaokwu ndị ahụ
Abụk 4:1Leenụ ka i si maa mma, onye m hụrụ nʼanya, e, ị mara mma! Anya gị abụọ nke dị nʼazụ akwa mkpuchi ihu gị dị ka nduru. Agịrị isi gị dị ka igwe ewu nke na-arịda nʼakụkụ ugwu Gilead.
Abụk 6:5Wepụ anya gị nʼebe m nọ, nʼihi na i jirila anya gị dọta m. Agịrị isi gị dị ka igwe ewu nke na-arịdata site nʼugwu Gilead.
- Mkpi, nʼetiti ihe ndị na-eje ije nʼọnọdụ ebubeIlu 30:29–31
Amaokwu ndị ahụ
Ilu 30:29–31“Ha dị ihe atọ na-ejegharị nʼụwa nʼọnọdụ ịdị oke ebube, mbaa, ha dị anọ: Ọdụm, eze ụmụ anụmanụ. Ọ naghị atụ onye ọbụla egwu, na oke ọkụkọ na-ejegharị ejegharị, na mkpi, na eze ndị agha ya gbara gburugburu.
- “dị ka onye ọzụzụ atụrụ sị ekewapụta ụmụ atụrụ site nʼụmụ ewu”Mat 25:32
Amaokwu ndị ahụ
Mat 25:32Mba niile nke ụwa ga-ezukọtakwa nʼihu ya. Ọ ga-ekewapụta ha, otu obodo site nʼibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ sị ekewapụta ụmụ atụrụ site nʼụmụ ewu.
- Samsin dọwara ọdụm ahụ dịka a ga-asị na ọ bụ nwa ewuNkp 14:6
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 14:6Nʼotu oge ahụ, Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Samsin nʼike. O jekwuuru ọdụm ahụ, were aka ya abụọ dọwaa ya ọnụ, dịka a ga-asị na ọ bụ nwa ewu. Ma Samsin agwaghị nne na nna ya ihe mere.
Isi mmalite
Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.