Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Oke osimiri

Okike

Oke osimiri nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (32), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

  • A kpọrọ mmiri ndị ahụ chịkọtara onwe ha “osimiri”Jen 1:9–10
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 1:9–10Chineke kwuru sị, “Ka mmiri dị nʼokpuru mbara eluigwe chịkọta onwe ha ọnụ nʼotu ebe, ka ala akọrọ pụta.” O sikwa otu a dịrị. Chineke kpọrọ ala akọrọ ahụ “ala,” kpọọ mmiri ahụ chịkọtara onwe ha ọnụ “osimiri.” Chineke lere anya hụ na ha dị mma.
  • E kere anụ ukwu bi na mmiri nʼụbọchị nke iseJen 1:21–23
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 1:21–23Ya mere Chineke kere anụ ukwu niile bi na mmiri, na anụ niile nwere ndụ bi na mmiri, na ụdị ihe ọbụla nwere ndụ na-akpụgharị akpụgharị ndị jupụtara na mmiri, dịka ụdịdị ha si dị, na anụ ufe niile dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma. Chineke gọziri ha, sị ha, “Mụbaanụ, dịkwanụ ukwuu nʼọnụọgụgụ, jupụtanụ osimiri niile. Ka anụ ufe dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ nʼelu ụwa.” Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke ise.
  • Osimiri buru ibu, sara mbara, jupụtara nʼihe dị ndụ, ebe ụgbọ mmiri na-agafeAbụ 104:25–26
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 104:25–26Leenụ osimiri nke buru ibu saakwa mbara; jupụtara nʼihe e kere eke na-akpụ akpụ nke a na-apụghị ịgụta ọnụ bi, anụ dị ndụ ma ndị ukwu ma ndị nta. Nʼebe ahụ ka ụgbọ mmiri niile na-ejegharị, nʼime ya kwa ka leviatan, nke gị onwe gị kere, na-anọ egwuri egwu.
  • Iyi niile na-asọba nʼoke osimiri, ma oke osimiri adịghị ejuEkl 1:7
    Amaokwu ndị ahụ
    Ekl 1:7Mmiri dị nʼiyi niile na-asọbanye nʼoke osimiri ma oke osimiri ejughị eju. Emesịakwa, mmiri ndị a na-alọghachi nʼiyi ndị a, malitekwa ịsọkwa na-aga nʼosimiri.
  • Aja bụ oke ebili mmiri apụghị ịgafeJer 5:22, Job 38:8–11
    Amaokwu ndị ahụ
    Jer 5:22Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, na-ajụ sị, o kwesighị ka unu tụọ m egwu?” “O kwesighị ka unu maa jijiji nʼihu m? Emeela m ka uzuzu bụrụ oke osimiri nwere. Ọ bụkwa ụkpụrụ ebighị ebi nke ọ na-enweghị ike ịgafe. Ebili mmiri nwere ike magharịa, ma nke a apụghị ime ka osimiri si nʼọnọdụ ya wezuga onwe ya. Osimiri nwere ike bigbọọ, ma ọ pụghị ịgafe oke ahụ.
    Job 38:8–11“Onye kara akara nye osimiri iwu ebe ọ ga-ejedebe mgbe o nupụtara dịka a ga-asị na o si nʼakpanwa pụta, mgbe m yikwasịrị ha igwe ojii dịka uwe, werekwa ọchịchịrị meere ya akwa okike, mgbe m kpaara ya oke ebe ọ ga-akwụsị, tinye ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ya, mgbe m sịrị, ‘Ruo ebe a ka ị ga-asọrute, ị gaghị agabiga ya, nʼebe a ka a ga-akwụsị ebili mmiri mpako gị’?
  • Ndị ọkwọ ụgbọ nʼelu ebili mmiri na-arị ruo eluigwe, na-ada ruo nʼomimiAbụ 107:23–27
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 107:23–27Ụfọdụ ji ụgbọ mmiri na-ejegharị nʼelu oke osimiri; ha bụ ndị na-azụ ahịa ma na-ebugharịkwa ngwa ahịa nʼelu oke osimiri. Ha hụrụ ọrụ niile nke Onyenwe anyị, ọtụtụ ọrụ ebube ya nʼogbu mmiri. Nʼihi na o kwuru okwu mere ka oke ifufe kuo nke buliri ebili mmiri elu. Ha bụ ndị e buliri nnọọ ezigbo elu, ma budatakwa ruo ogbu mmiri niile; nʼọnọdụ ihe egwu ahụ, obi lọrọ ha mmiri. Ha na-adagharị, na-aṅagharịkwa dịka ndị ṅụbigara mmanya oke. Mmụta ha banyere ịnya ụgbọ mmiri adịghị enyekwara ha aka nʼoge dị otu a.

Osimiri nke ala ahụ

  • Osimiri Mediterenịa bụ oke ala ọdịda anyanwụỌnụ 34:6, Jos 1:4
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọnụ 34:6Oke ala unu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ga-abụ ọnụ mmiri osimiri Mediterenịa. Nke a ga-abụ oke ala unu.
    Jos 1:4Oke ala unu ga-abụ site nʼọzara dị na ndịda ruo Lebanọn, ma site nʼiyi ukwu Yufretis, tinyere ala niile nke ndị Het, ruo nʼosimiri ukwu ahụ dị nʼọdịda anyanwụ.
  • Osimiri Nnu, ebe Ndagwurugwu Sidim dị na mbụJen 14:3
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 14:3Ndị eze obodo ndị a: Sọdọm, Gọmọra, Adma, Zeboiim na Bela, jikọtara ndị agha ha ọnụ na Ndagwurugwu Sidim (ya bụ, ndagwurugwu osimiri nnu ahụ).
  • Mmiri Jọdan na-asọ gaa nʼOsimiri Nnu kwụsịrị mgbe Izrel gafereJos 3:16
    Amaokwu ndị ahụ
    Jos 3:16mmiri si nʼelu elu osimiri ahụ kwụsịrị ịsọ, ọ gara elu tụkọta onwe ya dịka mgbidi nʼebe dị anya, nʼobodo a na-akpọ Adam, nke dị nso obodo Zaretan. Ebe mmiri nke na-eruda na-asọbanye osimiri Araba, ya bụ, osimiri Nnu kwụsịrị ịsọ kpamkpam. Ya mere, ndị Izrel gabigara na ncherita ihu Jeriko.
  • Oke ala site nʼOsimiri Uhie ruo nʼosimiri MediterenịaỌpụ 23:31
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 23:31“Aga m etinye oke ala unu site nʼOsimiri Uhie ruo nʼosimiri Mediterenịa, sitekwa nʼọzara ruo nʼosimiri Yufretis. Aga m enyefe ndị niile bi nʼala ahụ nʼaka unu. Unu ga-achụpụkwa ha.
  • Solomọn wuru ọtụtụ ụgbọ mmiri nʼEziọn Geba nʼọnụ mmiri Osimiri Uhie1Ez 9:26
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 9:26Eze Solomọn wukwara ọtụtụ ụgbọ mmiri nʼEziọn Geba, bụ nke dị nʼakụkụ Elat, nʼọnụ mmiri Oke osimiri Uhie nʼala Edọm.
  • Pita na Andru tụbara ụgbụ nʼosimiri GaliliMat 4:18
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 4:18Ma mgbe Jisọs na-agafe nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saimọn onye a na-akpọ Pita, na Andru nwanne ya, ndị ọrụ ha bụ ịkụ azụ, ebe ha nọ nʼụgbọ mmiri na-akụ azụ.

Nʼime akụkọ ndị ahụ

  • Ifufe ọwụwa anyanwụ nughachiri osimiri; Izrel gafere nʼala akọrọỌpụ 14:21–22
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 14:21–22Mgbe ahụ, Mosis setịpụrụ aka ya nʼelu Osimiri Uhie ahụ. Onyenwe anyị ji oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke fere nʼabalị ahụ niile, nughachi osimiri ahụ, mee ka osimiri ahụ kebie ụzọ abụọ, ka ụzọ pụta nʼala osimiri ahụ. Ụmụ Izrel sitere nʼetiti osimiri ahụ gafee. Mmiri osimiri ahụ ghọọrọ mgbidi nʼaka nri ha ma nʼaka ekpe ha.
  • Nʼisi ụtụtụ, osimiri lọghachiri, kpuchie ụgbọ agha FeroỌpụ 14:27–28
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 14:27–28Mosis setịpụrụ aka nʼelu osimiri ahụ. Nʼụtụtụ ya, mmiri osimiri ahụ sọghachiri gaa ebe ọ nọ na mbụ. Ndị Ijipt chọsịrị ụzọ ha si agbapụ ike, ma Onyenwe anyị mere ka osimiri ahụ kpuchie ha. Osimiri ahụ kpuchigidere ụgbọ agha ha niile, na ndị na-agba ịnyịnya, na ndị agha Fero niile ndị chụụrụ ụmụ Izrel baa nʼime osimiri ahụ. O nweghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ.
  • Ndị ọkwọ ụgbọ Jona tụbara ngwongwo nʼosimiri ime ka ụgbọ gbaa mfeJona 1:4–5
    Amaokwu ndị ahụ
    Jona 1:4–5Ma Onyenwe anyị mere ka ifufe dị egwu malite ife nʼelu osimiri ahụ, ebili mmiri bidokwara na-amagharị, chọọ itiwasị ụgbọ mmiri ahụ. Mgbe ahụ, ndị niile na-arụ ọrụ nʼụgbọ ahụ tụrụ oke egwu, malite itiku chi ha. Ha malitekwara itufu ihe niile dị nʼụgbọ mmiri ahụ, ime ka ụgbọ ahụ dị mfe. Ma nʼoge ihe ndị a na-eme, Jona nọrịị nʼala ala ụgbọ mmiri ahụ ebe o dinara ala na-arahụ ụra.
  • Mgbe a tụbara Jona nʼosimiri, ebili mmiri ahụ dajụrụJona 1:15
    Amaokwu ndị ahụ
    Jona 1:15Ya mere, ha buliri Jona elu tụnye ya nʼime osimiri ahụ, ebili mmiri ahụ dajụkwara.
  • Azụ buru ibu loro JonaJona 1:17
    Amaokwu ndị ahụ
    Jona 1:17Ma Onyenwe anyị akwadolarị otu azụ buru ibu ka o loo Jona. Ya mere, Jona nọrọ nʼafọ azụ ahụ ụbọchị atọ, ehihie na abalị.
  • Jisọs rahụrụ ụra nʼelu ohiri isi nʼazụ ụgbọ mgbe ebili mmiri na-awụba nʼụgbọMak 4:37–39
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 4:37–39Oke ifufe dị ike bidoro ife, ebili mmiri na-awụbakwa nʼụgbọ ahụ ruo na ụgbọ ha fọdụrụ ntakịrị ka mmiri mie ya. Ma Jisọs nọ nʼazụ azụ ụgbọ ahụ na-arahụ ụra nʼelu ohiri isi. Ndị na-eso ụzọ ya kpọtere ya sị ya, “Onye ozizi, o metụghị gị nʼobi na anyị nʼala nʼiyi?” Ọ biliri ọtọ, baara ifufe ahụ mba sịkwa osimiri ahụ, “Kwụsị! Dere jii!” Ifufe ahụ kwụsịrị, ebe niile dajụrụ deere jii.
  • Ihe dị ka site nʼelekere atọ ruo elekere isii nke ụtụtụ, Jisọs jere ije nʼelu osimiriMat 14:25–26
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 14:25–26Ma ihe dị ka site nʼelekere atọ ruo elekere isii nke ụtụtụ, Jisọs bịakwutere ha, na-aga ije nʼelu osimiri. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka ọ na-aga ije nʼelu osimiri ahụ, obi lọrọ ha mmiri, ha sị, “Ọ bụkwanụ mmụọ o!” Ha tiri mkpu nʼihi egwu.
  • Pita si nʼụgbọ rịda, jee ije nʼelu mmiriMat 14:28–29
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 14:28–29Pita zara ya, “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ bụ gị, sị m bịakwute gị nʼelu mmiri.” Ọ sịrị ya, “Bịa!” Pita sitere nʼụgbọ ahụ pụta, bido ịga ije nʼelu mmiri ijekwuru Jisọs.
  • Mkpụrụ ego nʼọnụ azụ mbụ e gbutereMat 17:27
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 17:27Ma otu ọ dị, achọghị m ka anyị mee ka iwe wee ha. Gaa nʼosimiri ahụ tụnye nko azụ gị nʼime ya. Meghe ọnụ azụ mbụ ị ga-egbute. Ị ga-ahụ otu mkpụrụ ego nʼime ọnụ ya. Were ya nye ha, ka ọ bụrụ ụtụ nke mụ na gị.”
  • Azụ ukwu 153, ma ụgbụ ahụ adọwaghịJọn 21:11
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 21:11Saimọn Pita pụrụ gaa dọgota ụgbụ azụ ahụ nʼelu ala. Ihe juru ya bụ azụ ndị ukwuu nke ọnụọgụgụ ya dị narị na iri ise na atọ. Ma ụgbụ ahụ adọwaghị nʼagbanyeghị na azụ juru nʼime ya.
  • Ihe dị ka ezi puku abụọ gbadara nʼosimiriMak 5:13
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 5:13Ọ hapụrụ ha; mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha pụtara baa nʼime igwe ezi ndị ahụ. Igwe ezi ahụ niile, ọnụọgụgụ ha ruru puku abụọ, gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri dakpuo nʼime osimiri ebe mmiri riri ha niile.
  • Ịtụ omimi nʼosimiri Adratik: mmiri na-adịwanye nʼelu nʼeluỌrụ 27:27–28
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 27:27–28Ihe dịka nʼetiti abalị nʼụbọchị nke iri na anọ ebili mmiri a, mgbe anyị na-erugharị nʼosimiri a na-akpọ Adratik, ndị na-anya ụgbọ chere na ala dị nso. Ha tụnyere ụdọ e kenyere igwe nʼọnụ ya nʼime osimiri chọpụta na omimi osimiri ahụ dị narị nzọ ụkwụ na iri abụọ nʼebe ahụ ha nọ. Ha gakwara nʼihu tụọkwa ụdọ ahụ ọzọ chọpụta na omimi osimiri ahụ dị iri nzọ ụkwụ itoolu.

Oke Osimiri nke ụlọnsọ

  • Oke Osimiri Solomọn e ji ọla awụrụ awụ mee: nnukwu efere gburugburu1Ez 7:23
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 7:23O mekwara Oke osimiri nke ọla awụrụ awụ, nke dị gburugburu nʼụdịdị. Ọtụtụ ya bụ mita abụọ na ụma atọ nʼogologo, dịkwa mita ise na ụma atọ, site nʼotu ọnụ ruo nʼọnụ nke ọzọ. Ọ bụ eriri e ji atụ ihe ruru ihe dịka mita iri na anọ ka e ji tụọ ya gburugburu.
  • O guzoro nʼelu ehi iri na abụọ, atọ na-eche ihu nʼakụkụ ọbụla1Ez 7:25
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 7:25E mekwara ka Oke osimiri ahụ guzo nʼelu ehi iri na abụọ. Atọ na-eche ihu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ; atọ na-eche ihu nʼọdịda anyanwụ; atọ na-eche ihu nʼakụkụ ndịda, atọ na-eche ihu nʼakụkụ ugwu. Oke osimiri ahụ dịkwasịrị ha nʼelu, ebe azụ ha niile dị nʼime nʼetiti.

Okwu

  • Ụmụ ụmụ “dịka aja dị nʼọnụ mmiri osimiri”Jen 22:17, Jen 32:12
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 22:17aga m agọzi gị nʼezie, mekwa ka ụmụ ụmụ gị mụbaa nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando nke mbara eluigwe na dịka aja dị nʼọnụ mmiri osimiri. Ụmụ ụmụ gị ga-enwetara onwe ha ọnụ ụzọ ama ndị iro ha.
    Jen 32:12Ọ bụ gị kwuru sị, ‘Aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma, meekwa ka ụmụ ụmụ gị dịrị ka aja nke dị nʼọnụ osimiri, nke mmadụ na-apụghị ịgụta ọnụ.’ ”
  • Nghọta Solomọn “dịka aja dị nʼakụkụ osimiri”1Ez 4:29
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 4:29Chineke nyere Solomọn amamihe, na uche nghọta, na mmụọ ịmụta ọtụtụ ihe nke bara ụba dịka aja dị nʼakụkụ osimiri.
  • Oke osimiri na-amagharị enweghị ike idere jụụ; ọ na-amapụta ụrọ na apịtịAịz 57:20
    Amaokwu ndị ahụ
    Aịz 57:20Ma ndị niile na-emebi iwu dị ka oke osimiri na-amagharị amagharị, nke na-adịghị ezu ike mgbe ọbụla. Ọ na-amapụtakwa ụrọ na apịtị.

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.