Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Nla na ikpuru

Okike

Nla na ikpuru nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (18), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

Nla

  • Mkpu na-eri uweJem 5:2
    Amaokwu ndị ahụ
    Jem 5:2Akụnụba unu ebidola ịta nchara, mkpu eripịakwala uwe unu.
  • Nchara na akịka na-emebi akụ nʼụwaMat 6:19–20
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 6:19–20“Unu akpadola akụ nʼụwa nye onwe unu, ebe ọ ga-agba nchara, akịka atakwa ya, ebe ndị ohi ga-etiwa ma zukwaa ha. Kama kwadoonụ akụ nʼeluigwe nye onwe unu, ebe ha na-agaghị agba nchara, ebe akịka na-agaghị eri ha, ebe ndị ohi na-adịghị etiwa maọbụ zuo ihe.
  • Akụ nʼeluigwe, ebe nla adịghị emebiLuk 12:33
    Amaokwu ndị ahụ
    Luk 12:33Reenụ ihe unu nwere nyekwanụ ndị ogbenye. Meerenụ onwe unu akpa na-agaghị aka nka, nʼọba akụ nʼeluigwe, ebe onye ohi na-adịghị abịa nso, nla adịghị erichapụkwa ya.
  • “dịka akwa nke nla riri”Job 13:28
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 13:28“Ya mere, mmadụ nʼala nʼiyi dịka ihe rere ere, na dịka akwa nke nla riri.
  • “nla ga-eri ha dịka o si eri akwa”Aịz 50:9, Aịz 51:8
    Amaokwu ndị ahụ
    Aịz 50:9Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Onye pụrụ ịma m ikpe? Lee, ha niile ga-aka nka dịrị ka uwe, nla ga-erichapụkwa ha.
    Aịz 51:8Nʼihi na nla ga-eri ha dịka o si eri akwa. Ikpuru ga-erichapụ ha dịka o si eri ajị anụ. Ma ezi omume m, na obi ebere, ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Nzọpụta m ga-adịkwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
  • “Ụlọ o wuru dị ka ụlọ nla”Job 27:18
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 27:18Ụlọ o wuru dị ka ụlọ nla, dịkwa ka ụlọ ntu nke onye nche wuru.
  • Ndị bi nʼụlọ ụrọ, a na-azọpịa ha dịka nlaJob 4:19
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 4:19ọ ga-esi aṅaa ghara ibo ndị bi nʼụlọ ụrọ ebubo karịa, bụ ndị ntọala ha dị nʼaja, ndị nke a na-azọpịa ngwangwa dịka nla.

Ikpuru

  • Mánà e debere ruo echi jupụtara nʼikpuru, malite isi ísì ọjọọỌpụ 16:20
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 16:20Ma ụfọdụ nʼime ha egeghị Mosis ntị. Ha rifọrọ nri ahụ debe ya. Ma mgbe chi echi ya bọrọ, ha chọpụtara na ha ereela ure jupụta nʼikpuru, ma na-esikwa isi dị njọ. Mosis were iwe dị ukwuu megide ụmụ Izrel nʼihi ya.
  • Òkè e debere maka Ụbọchị Izuike enweghị ikpuruỌpụ 16:24
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 16:24Ha mere dịka Mosis gwara ha. Mgbe chi echi bọrọ, ha chọpụtara na nri ha dị mma dịkwa ụtọ, ikpuru adịghịkwa nʼime ya.
  • Nʼisi ụtụtụ, otu ikpuru riri osisi Jona, ọ kpọnwụọJona 4:7
    Amaokwu ndị ahụ
    Jona 4:7Ma nʼisi ụtụtụ echi ya, Chineke mere ka otu ikpuru pụta nke riri osisi ahụ site nʼogwe ya, si otu a mee ka ọ kpọnwụọ.
  • Ikpuru riri Herọd, ọ nwụọỌrụ 12:21–23
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 12:21–23Nʼụbọchị nzukọ ahụ, Herọd gbokwasịrị uwe ndị eze ya nọkwasị nʼocheeze ya. O weere oke olu dị iche gwa nzukọ ahụ niile okwu. Igwe mmadụ ahụ nọ na-eti mkpu, “Nke a abụghị olu mmadụ, ọ bụ olu chi!” Nʼotu oge ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị tiri ya ihe otiti dị egwu nʼihi na o nyeghị Chineke otuto ma otu. Ikpuru ripịara ya ahụ, nke mere ka ọ nwụọ.
  • Ikpuru na-eri mkpụrụ vaịnị, ọ dịghị onye na-aghọ haDit 28:39
    Amaokwu ndị ahụ
    Dit 28:39Ị ga-akọ ubi vaịnị lekọtakwa ya anya, ma ị gaghị aracha mkpụrụ ya maọbụ ṅụọ mmanya si na ya, nʼihi na ikpuru ga-eri ha.
  • Job: “anụ ahụ m jupụtara nʼikpuru”Job 7:5
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 7:5Lee na anụ ahụ m jupụtara nʼikpuru, na akpụkpọ; anụ ahụ m etiwasịala jupụta nʼọnya.
  • Nʼili, ikpuru na-ekpuchi onye ọganihu na onye obi iluJob 21:23–26
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 21:23–26Otu onye na-anwụ mgbe o jupụtara nʼike na ume, mgbe ọ nọ na nchekwa na udo, mgbe ahụ ya bụ nke eji ezi nri zụọ nke ọma, ọkpụkpụ ya jupụtakwara nʼụmị. Onye ọzọ na-anwụ nʼihe ilu nke mkpụrụobi, nʼihi na o nweghị mgbe o riri ezi ihe ọbụla. Nke ọbụla nʼime ha dina nʼakụkụ ibe ya nʼime aja, ikpuru kpuchikwara ha abụọ.
  • “Ikpuru ga-erichapụ ha dịka o si eri ajị anụ”Aịz 51:8
    Amaokwu ndị ahụ
    Aịz 51:8Nʼihi na nla ga-eri ha dịka o si eri akwa. Ikpuru ga-erichapụ ha dịka o si eri ajị anụ. Ma ezi omume m, na obi ebere, ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Nzọpụta m ga-adịkwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
  • “Ikpuru ga-aghọrọ anụ ahụ gị ebe ndina; ọ bụkwa ikpuru ga-aghọ ihe mkpuchi ahụ gị”Aịz 14:11
    Amaokwu ndị ahụ
    Aịz 14:11Nganga ịbụ eze gị niile, na oke ụzụ ụbọ akwara gị, ka a na-elikọta nʼaja. Ikpuru ga-aghọrọ anụ ahụ gị ebe ndina; ọ bụkwa ikpuru ga-aghọ ihe mkpuchi ahụ gị.
  • Abụ ọma: “Abụ m idide, abụghị m mmadụ”Abụ 22:6
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 22:6Abụ m idide, abụghị m mmadụ; onye ndị ọzọ na-akwa emo, onye ndị mmadụ na-eleda anya.

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.