Bible Explorer

Baịbụl › Job › 7

IGCB · Isi 7 / 42

Job 7

1“Ndụ mmadụ nʼụwa ọ bụghị ọgụ na mgba? Ụbọchị ya ọ dịghị ka ụbọchị onye e goro ọrụ?

2Dịka ọhụ na-eche mgbe anyanwụ ga-ada, maọbụ dịka onye e goro ọrụ si ele anya ụgwọ ọrụ ya,

3otu a ka e si kenye m ọtụtụ ọnwa nke obi ụtọ na-adịghị nʼime ya, nakwa abalị nhụju anya dị nʼime ya.

4Mgbe m na-edina ala, ana m asị, ‘Olee mgbe m ga-ebili?’ Abalị na-eseti onwe ya, nʼihi ya, m na-anọ na-atụgharị onwe m tutu chi abọọ.

5Lee na anụ ahụ m jupụtara nʼikpuru, na akpụkpọ; anụ ahụ m etiwasịala jupụta nʼọnya.

6“Ụbọchị nke ndụ m na-agabiga ngwangwa karịa ihe eji akpa akwa nke ọkpa akwa, ha na-agwụcha na-enweghị olileanya ọbụla.

7O Chineke cheta na ndụ m bụ naanị otu nkuume; anya m abụọ agaghị ahụkwa ọṅụ ọzọ.

8Anya na-ahụ m ugbu a agaghị ahụkwa m ọzọ; unu ga-achọ m ma unu agaghị a hụ m ọzọ.

9Dịka igwe ojii si efefusi ma na-agbasa, otu a ka ọ dịrị onye na-arịda nʼime ili ọ naghị arịpụtakwa.

10E, ọ naghị alọghachikwa nʼụlọ ya ọzọ; ebe ya agaghị amakwa ya ọzọ.

11“Ya mere agaghị m emechi ọnụ; aga m ekwupụta nʼihi ihe mgbu dị m nʼime mmụọ. Aga m eme mkpesa nʼihi ihe ilu dị m nʼobi.

12A bụ m oke osimiri, maọbụ anụ ukwu dị nʼogbu osimiri, nke mere i ji eche m nche?

13Mgbe m chere na ihe ndina m ga-akasị m obi, maọbụ na oche izuike m ga-ewepụ ntamu m,

14nʼagbanyeghị na ị na-eji nrọ menye m egwu werekwa ịhụ ọhụ mee ka m maa jijiji,

15ya mere, ahọrọ m ị bụ onye a tọgburu atọgbu na ọnwụ, karịa inwe ụdị ahụ m nke a.

16Ana m asọ ndụ m oyi; agaghị m adị ndụ ruo ebighị ebi. Nʼihi ya, hapụ m ka m nọọrọ onwe m, nʼihi na ụbọchị ndụ m enweghị isi.

17“Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-agụ ya dịka ihe, i ji na-elenye anya nʼihe gbasara ya,

18i ji na-enyocha ya ụtụtụ niile, ma na-anwale ya mgbe mgbe?

19Ị gaghị elepụ anya gị site nʼebe m nọ, maọbụ hapụ m ka m nọọrọ onwe m loda asụ mmiri?

20Ọ bụrụ na m emehiela, gịnị ka m mere megide gị, gị onye na-ahụ ihe niile anyị na-eme? Gịnị mere i ji elekwasị m anya? Abụrụla m ibu arọ nye gị?

21Ọ bụ na i nweghị ike ịgbaghara m njehie m, ma bupụ mmehie m? Nʼihi na oge ọnwụ m eruola nso, e, oge a ga-eliba m nʼaja, ma m nwụọ. Mgbe ahụ ị ga-achọ m, ma ị gaghị ahụkwa m anya ọzọ, nʼihi na agaghị m adịkwa.”

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org