IGCB · Isi 4 / 42
Job 4
1Mgbe ahụ, Elifaz onye obodo Teman zara Job sị:
2“Iwe ọ ga-ewe gị ma ọ bụrụ na mmadụ agwa gị okwu? Onye kwanụ nwere ike ịnọ nʼebe a hapụ ikwu okwu?
3Lee ka i siri nye ọtụtụ mmadụ ndụmọdụ, na ka i si mee ka ndị na-ada mba nwee ume.
4Okwu ọnụ gị abụrụla ihe ịgbaume nye ọtụtụ mmadụ, ị bụrụla ịgbaume nye ndị ikpere ha na-ama jijiji.
5Ma leenụ ugbu a, nsogbu abịakwasịla gị, ị bụrụla onye na-ada mba; nsogbu etiela gị aka, i na-ama jijiji.
6Egwu ị na-atụ Chineke ọ gaghị abụ ihe ịgbaume nye gị, izi ezi nke ndụ gị abụrụkwa olileanya gị?
7“Chee echiche ugbu a! Onye, bụ onye aka ya dị ọcha, nke a larala nʼiyi? Ebee ka i hụrụ ka e bibiri ndị na-eme ihe ziri ezi?
8Dịka m si hụ ya, ndị na-agha ajọ ihe dịka mkpụrụ na ndị na-akụ okwu na ụka na-aghọta ya dịka ihe ubi.
9Chineke na-ala ha nʼiyi site nʼume ọ na-ekupụta. Ọ na-esitekwa nʼoke iwe ya repịa ha.
10Ọdụm nwere ike gbọọ ụja, maọbụ bigbọọ, ma eze ọdụm dị ike ka a gbajisiri.
11Oke ọdụm na-ala nʼiyi site na-enweghị ihe ọ dọgbutara, ụmụ nne ọdụm niile ka a na-achụsa.
12“E mere ka okwu rute m nʼụzọ nzuzo, ntị m nụrụ ya nʼịgba izu.
13Nʼime nkụja nke oke nrọ nke abalị, mgbe oke ụra na-adakwasị ụmụ mmadụ,
14oke ụjọ na ahụ ịma jijiji dakwasịrị m, meekwa ka ọkpụkpụ niile dị nʼahụ m maa jijiji.
15Otu mmụọ sitere nʼihu m gafee. Ọ bụladị ajị dị m nʼahụ guzochara ọtọ nʼihi ụjọ.
16Ọ kwụsịrị; ma apụghị m ịkọ ihe ọ bụ. Onyinyo guzooro nʼanya m, anụrụ m olu dị nro, nke kwuru sị:
17‘Mmadụ efu ọ nwere ike bụrụ onye ezi omume karịa Chineke? Ọ bụladị nwoke dị ike, ọ pụrụ ịdị ọcha nʼobi karịa Onye kere ya?
18Ọ bụrụ na Chineke adịghị atụkwasị ndị ozi ya obi, ọ bụrụ na ọ na-ebo ndị mmụọ ozi ya ebubo imejọ ihe,
19ọ ga-esi aṅaa ghara ibo ndị bi nʼụlọ ụrọ ebubo karịa, bụ ndị ntọala ha dị nʼaja, ndị nke a na-azọpịa ngwangwa dịka nla.
20Site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, a na-etipịasị ha: ha na-ala nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi, ihe niile a na-agakwa dịka o si aga.
21Ọ bụ na-eholiteghị eriri ụlọ ikwu ha elu, mee ka ha nwụọ na-enweghị amamihe?’
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org