Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Abụ Ọma 150

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Abụ Ọma 150

1Toonu Onyenwe anyị. Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya. Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya.

2Toonu ya, nʼihi ọrụ niile ọ rụrụ site nʼike ya. Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile.

3Werenụ opi ike too ya, werekwanụ ụbọ akwara na une too ya,

4jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya, jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya,

5werenụ ogene too ya, werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya.

6Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị. Toonu Onyenwe anyị.

Gụọ isi ahụ dum: Abụ Ọma 150

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BiblePsalm 150Hallelujah! Praise God in His sanctuary. Praise Him in His mighty heavens. Praise Him for His mighty acts; praise Him for His excellent greatness. Praise Him with the sound of the horn; praise Him with the harp and lyre. Praise Him with tambourine and dancing; praise Him with strings and flute. Praise Him with clashing cymbals; praise Him with resounding cymbals. Let everything that has breath praise the LORD! Hallelujah!

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Abụ 145:21Ọnụ m ga-ekwupụta otuto Onyenwe anyị; ka ihe niile e kere eke too aha nsọ ya ruo mgbe ebighị ebi.
Mkp 5:13Mgbe ahụ, anụrụ m ka ihe niile nọ nʼeluigwe na ndị nọ nʼụwa na ndị nọ nʼokpuru ụwa, na ndị nọ nʼokpuru oke osimiri na-eti mkpu abụ na-asị, “Ka ngọzị, na nsọpụrụ niile, na otuto niile, na ike niile dịrị onye ahụ na-anọkwasị nʼocheeze ahụ, na Nwa Atụrụ ahụ ruo mgbe niile ebighị ebi!”
Abụ 103:22Toonu Onyenwe anyị, ọrụ aka ya niile nʼebe ọbụla ọ na-achị. Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.
Abụ 145:10O Onyenwe anyị, ihe niile i kere eke ga-eto gị; ndị nsọ gị na-aja gị mma.
Abụ 148:7–11Toonu Onyenwe anyị, site nʼụwa, unu oke anụ mmiri niile na ogbu mmiri niile, na amụma, na mkpụrụ mmiri, na snoo na igwe ojii niile, na oke ifufe niile na-eme ihe o nyere nʼiwu, unu ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile na-amị mkpụrụ na osisi sida niile na anụ ọhịa, na anụ ụlọ niile, na ihe niile na-akpụ akpụ nʼala na nnụnụ niile, ndị eze niile nke ụwa na mba niile dị iche iche, unu ụmụ eze na ndị niile na-achị achị nʼụwa,
Abụ 149:1Toonu Onyenwe anyị! Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ. Bụọnụ abụ ito ya nʼetiti ndị nsọ ya.
Abụ 134:2Chilienụ aka unu abụọ elu nʼime ụlọnsọ ya ma toonu Onyenwe anyị.
Dit 3:24“Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ị malitela igosi mụ bụ ohu gị ịdị ukwuu gị na ike gị. O nweghị chi ọzọ dị nʼeluigwe maọbụ nʼụwa pụrụ ịrụ ọrụ ebube niile ị rụrụ.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike