Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 2 Ndị Tesalonaịka 3:10

Amaokwu Baịbụl · IGCB

2 Ndị Tesalonaịka 3:10

Ọ bụladị mgbe anyị na unu nọ, anyị nyere unu iwu a sị, “Onye ọbụla na-agaghị ọrụ ya erila nri.”

Gụọ isi ahụ dum: 2 Ndị Tesalonaịka 3

N’ọnọdụ ya

7Nʼihi na unu maara nke ọma nʼime onwe unu na unu kwesiri ịgbaso omume anyị. O nweghị mgbe ọbụla unu hụrụ anyị ka anyị na-agagharị hapụ ọrụ anyị kwesiri ịrụ.

8O nweghị onye ọbụla anyị riri nri ya nke anyị na-ebughị ụzọ kwụọ ya ụgwọ. Kama anyị rụsịrị ọrụ ike, dọgbukwaa onwe anyị nʼọrụ ehihie na abalị, ka anyị ghara ịbụ ibu arọ nye onye ọbụla.

9Ọ bụghị na anyị enweghị ikike ịnara unu ihe oriri, kama ọ bụ ka anyị kuziere unu site nʼomume anyị ihe unu ga na-eṅomi.

10Ọ bụladị mgbe anyị na unu nọ, anyị nyere unu iwu a sị, “Onye ọbụla na-agaghị ọrụ ya erila nri.”

11Ma anyị anụla na ụfọdụ nʼetiti unu na-anọ nkịtị na-arụghị ọrụ ọbụla, kama ndị dị otu a na-agagharị, na-etinye anya nʼihe na-agbasaghị ha. Ha anaghị arụ ọrụ ọbụla.

12Anyị na-enye ndị a iwu, na-adụsịkwa ha ọdụ ike site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, si ha wetuo obi ha ala rụsie ọrụ ha ike. Ka ha riekwa nri ha ji aka ha rụpụta.

13Otu ọ dị ụmụnna, unu ekwela ka ike ịrụ ọrụ ọma gwụ unu.

2 Ndị Tesalonaịka 3

N’asụsụ Bekee

Berean Standard Bible2 Thessalonians 3:10For even while we were with you, we gave you this command: “If anyone is unwilling to work, he shall not eat.”

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Jen 3:19Site nʼọsụsọ nke ga-agbapụta gị nʼihu ka ị ga-eri nri gị tutu ruo mgbe ị lọghachiri nʼala ebe ọ bụ site nʼala ka e si mepụta gị nʼihi na aja ka ị bụ, nʼaja ka ị ga-alaghachikwa.”
1Te 4:11Nweenụ agụụ ibi ndụ nwayọọ, na-arụkwanụ ọrụ dịịrị unu. Jirikwanụ aka unu na-arụ ọrụ dịka anyị gwara unu,
Ilu 13:4Ndị umengwụ na-achọ ọtụtụ ihe ma ọ dịghị ihe ha na-enweta; ma onye na-arụsị ọrụ ike na-enweta ihe niile ọ chọrọ.
Ilu 20:4Onye umengwụ adịghị arụ ọrụ ubi nʼoge ya. Nʼoge owuwe ihe ubi ọ pụghị ịchọta ihe oriri.
Ilu 21:25Oke ọchịchọ nke onye umengwụ na-ewetara ya ọnwụ nʼihi na ọ jụrụ ịrụ ọrụ.
Ilu 24:30–34Esitere m nʼubi otu onye umengwụ gafee, bụ ubi vaịnị nke onye na-enweghị uche, hụ na ogwu etochiela ya, ahịhịa etochiekwala ya; mgbidi dị ya gburugburu adaakwala. Elegharịrị m ya anya site na ya mụta otu ihe a: Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịchịkọba aka nta zuo ike ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi, ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike