Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Abụ Ọma 1
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Abụ Ọma 1
1Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ, onye na-adịghị aga ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu; onye na-adịghị eguzokwa nʼụzọ ndị mmehie maọbụ soro nʼotu ndị nkwutọ.
2Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu Onyenwe anyị. Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu Onyenwe anyị ehihie na abalị,
3Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke na-amịpụta mkpụrụ ya nʼoge ya, nke ahịhịa ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ. Ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma.
4Ma ndị ajọ omume adịghị otu a. Ha dị ka igbugbo ọka nke oke ifufe na-efesasị.
5Ya mere, ndị ajọ omume agaghị eguzosi ike nʼụbọchị ikpe; ndị mmehie agaghị eguzokwa na nzukọ ndị ezi omume.
6Nʼihi na Onyenwe anyị na-eche ụzọ ndị ezi omume nche. Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-eduba ha nʼịla nʼiyi.
N’asụsụ Bekee
Blessed is the man who does not walk in the counsel of the wicked, or set foot on the path of sinners, or sit in the seat of mockers. But his delight is in the Law of the LORD, and on His law he meditates day and night. He is like a tree planted by streams of water, yielding its fruit in season, whose leaf does not wither, and who prospers in all he does. Not so the wicked! For they are like chaff driven off by the wind. Therefore the wicked will not stand in the judgment, nor sinners in the assembly of the righteous. For the LORD guards the path of the righteous, but the way of the wicked will perish.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Mụ na ndị na-aghọ aghụghọ adịghị enwe mmekọ ọbụla. Otu a kwa, nnwekọ ọbụla adịghịkwa nʼetiti mụ na ndị ihu abụọ. Akpọrọ m otu ndị na-emebi iwu asị. Mụ na ndị ajọ omume agaghị anọkọkwa.Emela dịka ndị na-emebi iwu. Esokwala ụzọ ha. Zeere ha, ejekwala nʼụzọ ha; chepu ihu gị nʼụzọ ahụ,Onye dị otu a ga-adị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke mgbọrọgwụ ya na-awasa banye nʼiyi ahụ. Ụjọ adịghị atụ ya nʼoge okpomọkụ, akwụkwọ ndụ na-adịgidekwa nʼelu ya. Ọ dịghị echegbu onwe ya nʼafọ ụnwụ dị. Ọ dịkwaghị mgbe ọ na-akwụsị ịmị mkpụrụ.”Na-eso ndị maara ihe ka ị ghọọ onye mara ihe, nʼihi na onye na-eso ndị nzuzu na-aba na nsogbu.Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta ọbụla, ndị na-ejegharị dịka iwu Onyenwe anyị si dị. Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike.O nwebeghị oge mụ na ndị na-achị ọchị nke ukwuu ji nọkọọ. Esokwaghị m ha ṅụrịkọọ ọṅụ. A nọdụụrụ m onwe m nʼihi na aka gị dịkwasịrị m. I mekwara ka iwe jupụta m nʼobi nʼihi ajọ omume ha.“Sitenụ nʼọnụ ụzọ dị warawara banye. Nʼihi na ọnụ ụzọ ahụ dị obosara. Mbara ka ụzọ ahụ dịkwa na-eduba nʼịla nʼiyi. Ọtụtụ na-esoro ya. Ole na ole na-achọta ụzọ ahụ na-eduba na ndụ, nʼihi na ọ dị warawara, dịkwa nkpagide.Ma ọ sịrị, kama, “Ngọzị na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke, na-emekwa ha.”Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike