Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Filipai 2:3
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ndị Filipai 2:3
Emela ihe ọbụla nʼihi naanị ọdịmma nke gị, maọbụ bie ndụ nʼụzọ ịdọtara onwe gị otuto efu. Kama bụrụ onye wedara onwe ya ala, onye na-ahụ ndị ọzọ dị ka ndị ka ya mma.
Gụọ isi ahụ dum: Ndị Filipai 2
N’ọnọdụ ya
1Ya mere, ọ bụrụ na e nwere nkasiobi ọbụla dịrị anyị nʼihi njikọta e jikọtara anyị na Kraịst, ọ bụrụkwa na e nwere inyeaka ọbụla site nʼịhụnanya ya, ọ bụrụkwa na ọ dị nnwekọ ọbụla anyị na Mmụọ na-enwekọ, ọ bụrụ na unu nwere obi nro na ọmịiko,
2meenụ ka ọṅụ m zuo oke, site nʼinwe nkwekọta nʼihe ọbụla, site nʼịhụrịta onwe unu nʼanya, sitekwa nʼinwekọ otu mmụọ, na otu uche.
3Emela ihe ọbụla nʼihi naanị ọdịmma nke gị, maọbụ bie ndụ nʼụzọ ịdọtara onwe gị otuto efu. Kama bụrụ onye wedara onwe ya ala, onye na-ahụ ndị ọzọ dị ka ndị ka ya mma.
4Echela echiche banyere naanị ihe metụtara gị, kama, na-eleba anya nʼihe banyere ndị ọzọ.
5Na mmekọrịta unu na ibe unu, nweenụ ụdị uche ahụ nke dị nʼime Jisọs Kraịst:
6Onye ọ bụ ezie na o nwere ụdịdị Chineke site na mmalite ma ọ gụghị ụdịdị ya dị ka Chineke dị ka ihe ọ ga-ejidesi aka ike.
N’asụsụ Bekee
Do nothing out of selfish ambition or empty pride, but in humility consider others more important than yourselves.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Hụrịtanụ onwe unu nʼanya, dịka ụmụ nke otu nna. Ka ihe ibe unu na-eme na-atọ unu ụtọ. Na-asọpụkwaranụ ibe unu karịa otu ha si asọpụrụ unu.Ka anyị ghara ịbụ ndị mpako si otu a na-akpali iwe na ekworo nʼetiti anyị.Na-edonụ onwe unu nʼokpuru ibe unu site nʼegwu Kraịst.Werekwanụ obi dị umeala niile na ịdị nwayọọ, na ndidi na-anagide ibe unu nʼịhụnanya.Nʼotu aka ahụ, unu ụmụ okorobịa, doonụ onwe unu nʼokpuru ndị bụ okenye. Unu niile werenụ obi umeala na-ejeritara onwe unu ozi, nʼihi na, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”Ma ọ bụrụ na obi unu ejupụta nʼihe ilu na ekworo na ịchọ naanị ihe nke onwe unu, mgbe ahụ, unu ekwesighị ịnya isi sị otu a na-agọnarị eziokwu. Ụdị amamihe dị otu ahụ esiteghị nʼeluigwe bịa. Ọ bụ amamihe nke ụwa. Ọ bụghị nke mmụọ nsọ. Ọ bụ nke mmụọ ọjọọ. Nʼihi nʼebe ọbụla obi ilu na ekworo dị, ebe ahụ ka ọgbaaghara na omume ọjọọ niile dị.Unu chere na ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ na-ekwu nʼefu mgbe ọ na-asị, “Chineke na-ekwosi ekworo ike nʼihi Mmụọ Nsọ ya nke o mere ka o biri nʼime anyị.” Ma ọ na-enye anyị amara karịa. Ya mere, Akwụkwọ nsọ ji sị, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”Nʼihe ọbụla unu na-eme, wezuganụ ntamu na ịrụ ụka nʼetiti unu.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike