Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Abụ Ọma 37:4
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Abụ Ọma 37:4
Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ. Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị.
N’ọnọdụ ya
1Abụ Ọma Devid. Echegbula onwe gị nʼihi ndị na-eme ihe ọjọọ, maọbụ kwosa ndị na-eme ihe ọjọọ ekworo;
2nʼihi na mgbe na-adịghị anya, ha ga-akpọnwụ dịka ahịhịa, dịka ahịhịa ndụ, ha ga-anwụkwa.
3Tụkwasị Onyenwe anyị obi meekwa ihe ziri ezi; biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ.
4Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ. Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị.
5Nyefee onwe gị nʼaka Onyenwe anyị; tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a:
6Ọ ga-eme ka ezi omume gị pụta ìhè dịka ihe nke chị ọbụbọ, meekwa ka izi ezi nke ikpe gị dịka ihe nke anyanwụ nʼehihie.
7Dere duu nʼihu Onyenwe anyị, were ndidi chere ya; echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu, mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile.
N’asụsụ Bekee
Delight yourself in the LORD, and He will give you the desires of your heart.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ọ bụrụ na unu anọgide nʼime m, okwu m anọgidekwa nʼime unu, rịọọnụ ihe ọbụla unu chọrọ, a ga-emere unu ya.Ọ na-emezu ọchịchọ niile nke ndị na-atụ egwu ya; ọ na-anụ akwa ha na-azọpụtakwa ha.Ọ bụkwaghị unu onwe unu họọrọ m. Ọ bụ m họọrọ unu, wepụtakwa unu iche ka unu gaa mịa ọtụtụ mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-adịgidekwa. Ya mere, Nna m ga-enye unu ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼaha m.mgbe ahụ, ị ga-achọta ọṅụ gị nʼime Onyenwe anyị, m ga-emekwa ka ịnọkwasị nʼebe dị elu niile nke ala ahụ, meekwa ka irie oriri na ihe nketa nke nna gị Jekọb.” Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwuola ya.Nkwuwa okwu anyị nwere na ya bụ, na ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọbụla dịka ọchịchọ obi ya siri dị, ọ na-anụ olu anyị. Ọ bụrụkwanụ na anyị matara na ọ na-anụ olu anyị mgbe ọbụla anyị rịọrọ ya ihe, anyị na-amatakwa na anyị anatala ihe ọbụla anyị rịọrọ ya.Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, lee na eze na-aṅụrị ọṅụ nʼike gị. Obi na-atọkwa ya ụtọ nke ukwuu nʼihi mmeri niile i nyere ya! I nyela ya ihe obi ya chọrọ; i mekwaara ya ihe niile ọ rịọrọ gị! SelaNʼezie, mgbe ahụ kwa, ihe nke Onye pụrụ ime ihe niile ga-atọ mkpụrụobi gị ụtọ, ị ga-ewelikwa ihu gị nye Chineke.Ọ bụ ezie na unu ejibeghị anya unu hụ ya mgbe ọbụla, ma unu hụrụ ya nʼanya, ọ bụkwa ezie na unu adịghị ahụ ya anya ugbu a, ma unu kwere na ya. Unu jupụtakwara nʼọṅụ ahụ dị ebube nke ọnụ na-apụghị ịkọwa.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike