Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jọn 16:33

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Jọn 16:33

“Agwala m unu ihe ndị a niile ka unu nwee udo nʼime m. Nʼime ụwa, unu ga-enwe nsogbu. Ma ka obi sie unu ike, nʼihi na emeriela m ụwa.”

Gụọ isi ahụ dum: Jọn 16

N’ọnọdụ ya

30Ugbu a ka o doro anyị anya na ị maara ihe niile. Ọ bakwaghị uru ka onye ọbụla jụọ gị ihe ọbụla. Nʼihi nke a, anyị kwere na i si nʼebe Chineke nọ bịa.”

31Jisọs zara ha, “Unu ekwerela ugbu a?

32Lee! Oge na-abịa, oge ahụ eruola, mgbe unu ga-agbasacha. Onye ọbụla nʼụlọ nke ya. Mgbe ahụ, unu ga-ahapụ naanị m, ma ọ bụghị naanị m nọ nʼihi na mụ na Nna m nọ.

33“Agwala m unu ihe ndị a niile ka unu nwee udo nʼime m. Nʼime ụwa, unu ga-enwe nsogbu. Ma ka obi sie unu ike, nʼihi na emeriela m ụwa.”

Jọn 16

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleJohn 16:33I have told you these things so that in Me you may have peace. In the world you will have tribulation. But take courage; I have overcome the world!”

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Jọn 14:27Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo m ka m na-enyekwa unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye ka m na-enye unu. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri, ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu.
1Jọn 5:4Nʼihi na onye ọbụla amụrụ site na Chineke na-emeri ụwa. Nke a bụkwa mmeri ahụ na-emeri ụwa, ọ bụladị okwukwe anyị.
2Te 3:16Ugbu a, ka Onyenwe anyị, onye udo na-esi nʼaka ya abịa tụkwasịrị unu udo ya mgbe niile, nʼime ọnọdụ ọbụla unu nọ nʼime ya. Onyenwe anyị nọnyekwara unu.
1Jọn 4:4Ụmụntakịrị m, unu bụ ndị sitere na Chineke, unu emeriekwala ha nʼihi na onye ahụ nke bi nʼime unu dị ukwuu karịa onye ahụ nọ nʼime ụwa.
Fil 4:7Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọbụla mmadụ nwere ike ịghọta, ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nʼime Kraịst Jisọs.
Jọn 14:1“Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Kwerenụ na Chineke; kwerekwanụ na m.
1Pt 5:9Guzosienụ ike nʼokwukwe unu. Unu ekwela ka o merie unu, kama tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Chetanụ na e nwere ọtụtụ ndị kwere ekwe dị ka unu ndị nọkwa nʼụdị ahụhụ a unu na-ahụ nʼụwa niile.
2Tm 3:12Nʼezie, ndị niile chọrọ ibi ndụ ịsọpụrụ Chineke nʼime Kraịst Jisọs ga-agabiga mkpagbu.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike