Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Abụ Ọma 147:3
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Abụ Ọma 147:3
Ọ na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa na-ekechikọtakwa ebe niile ha merụrụ ahụ.
N’ọnọdụ ya
1Toonu Onyenwe anyị! Ọ bụ ihe dị mma ịbụku Chineke anyị abụ otuto. Ọ bụ ihe na-eweta mmasị, bụrụkwa ihe ziri ezi ito ya!
2Onyenwe anyị na-ewu Jerusalem: ọ na-akpọghachita ụmụ Izrel ndị a dọọrọ nʼagha gaa nʼala ọzọ.
3Ọ na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa na-ekechikọtakwa ebe niile ha merụrụ ahụ.
4Ọ bụ ya na-ekpebi ọnụọgụgụ kpakpando niile na-akpọkwa ha nʼotu na otu.
5Onyenwe anyị dị ukwuu, ike ya dịkwa ukwuu; nghọta ya enweghị nsọtụ.
6Onyenwe anyị na-agba ndị dị umeala nʼobi ume ma ọ na-atụda ndị ajọ omume nʼala.
N’asụsụ Bekee
Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso, ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ.Nʼihi na ọ na-etihịa mmadụ ahụ ma na-ekechikwa ọnya ha; Ọ na-eti mmadụ ihe, ma aka ya na-agwọkwa.“ ‘Ma otu ọ dị, aga m agwọ ya, mee ka ahụ sie ya ike. Aga m agwọ ndị m, meekwa ka ha nwe udo nʼebe ọ bara ụba. Ha ga-ebikwa nʼudo na-enweghị egwu ọbụla.Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dị nʼahụ m, nʼihi na Onyenwe anyị eteela m mmanụ ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye. O zitela m ịkasị ndị obi ha tiwara etiwa obi, ikwupụta inwere onwe nye ndị a dọtara nʼagha, na ntọghapụ site nʼọchịchịrị nye ndị mkpọrọ.“Mmụọ nke Onyenwe anyị dị nʼahụ m, nʼihi na o teela m mmanụ ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye. O zitela m ikwupụta inwere onwe nye ndị mkpọrọ, ya na ịhụ ụzọ nye ndị kpuru ìsì, ime ka ndị a na-emegbu emegbu nwere onwe ha.“Bịanụ ka anyị laghachikwuru Onyenwe anyị. Ya onwe ya adọkaala anyị, ọ ga-agwọkwa anyị; o tipụla anyị ọnya, ma ọ ga ekechikwa ọnya anyị. Ọ ga-eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ mgbe ụbọchị abụọ gasịrị. Nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-eme ka anyị bilie guzokwa nʼụkwụ anyị, meekwa ka anyị dịrị ndụ nʼihu ya.Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa, O Chineke, ị naghị elefu anya, nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị.Nʼihi ihe a ka onye dị elu, onye e mere ka ọ dị ukwuu, onye dị mgbe ebighị ebi, onye aha ya dị nsọ kwuru: “Ebi m nʼebe dị elu nke dịkwa nsọ, ibinyere onye dị umeala nʼobi, na onye wedara mmụọ ya nʼala, itute mmụọ nke onye e wedara nʼala, na ịkpọlite mmụọ nke onye dị umeala nʼobi.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike