Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Abụ Ọma 127:3–5
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Abụ Ọma 127:3–5
3Ụmụntakịrị bụ ihe nketa si nʼaka Onyenwe anyị, ụmụntakịrị bụ ụgwọ ọrụ ọ na-enye.
4Dịka àkụ nʼaka dike nʼagha, otu a, ka ụmụ a mụtaara na mgbe okorobịa dị.
5Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye kpojuru àkụ ndị a nʼakpa àkụ ya. Ihere agaghị eme ha mgbe ha na ndị iro na-arụrịta ụka nʼama.
N’ọnọdụ ya
1Abụ nrigo, nke Solomọn. Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ewughị ụlọ, ndị na-ewu ya na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu. Ọ bụrụ na Onyenwe anyị echeghị obodo, nʼefu ka ndị nche na-amụ anya.
2Ọ bụ nʼefu ka ị na-ebili nʼisi ụtụtụ na-adọgbu onwe gị nʼọrụ ịchọta ihe ị ga-eri ruo nʼabalị, nʼihi na ọ na-eme ka ndị niile ọ hụrụ nʼanya hie ụra nʼudo.
3Ụmụntakịrị bụ ihe nketa si nʼaka Onyenwe anyị, ụmụntakịrị bụ ụgwọ ọrụ ọ na-enye.
4Dịka àkụ nʼaka dike nʼagha, otu a, ka ụmụ a mụtaara na mgbe okorobịa dị.
5Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye kpojuru àkụ ndị a nʼakpa àkụ ya. Ihere agaghị eme ha mgbe ha na ndị iro na-arụrịta ụka nʼama.
N’asụsụ Bekee
Children are indeed a heritage from the LORD, and the fruit of the womb is His reward. Like arrows in the hand of a warrior, so are children born in one’s youth. Blessed is the man whose quiver is full of them. He will not be put to shame when he confronts the enemies at the gate.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị; ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv gburugburu tebul gị. Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị.Ihe a gọziri agọzi ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ na mkpụrụ nke ala ubi gị na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, ụmụ ehi gị mụrụ na ụmụ igwe ewu na atụrụ gị.Nʼihi nwa a ka m kpere ekpere, Onyenwe anyị emelara m ihe m rịọrọ nʼaka ya.Ọ sịrị m, ‘Lee, aga m eme ka ị mịa mkpụrụ, baakwa ụba nʼọnụọgụgụ. Aga m eme ka ị ghọọ ọgbakọ ọtụtụ mba. Aga m enye gị ala a ka ọ bụrụ ihe nketa ebighị ebi maka agbụrụ gị ndị ga-esote gị.’Mgbe Ịsọ lelitere anya hụ ndị inyom ndị a na ụmụntakịrị ndị ahụ. Ọ sịrị, “Ndị ole bụ ndị a gị na ha so?” Jekọb sịrị, “Ha bụ ụmụ Chineke sitere nʼamara ya nye ohu gị.”Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị Onyenwe anyị nyere m. Anyị bụ ihe ịrịbama na ihe iji cheta ihe nye ndị Izrel site na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-ebi nʼugwu Zayọn.Chineke gọziri ha sị ha, “Mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ nʼụwa, meenụ ka ihe niile dịrị nʼokpuru unu. Chịanụ azụ niile nke osimiri na anụ ufe niile nke eluigwe na ihe niile e kere dị ndụ nke na-akpụgharị akpụgharị nʼala.”Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri kpọọ isiala nʼihu Onyenwe anyị, mgbe ahụ, ha laghachiri nʼụlọ ha dị na Rema. Mgbe ha laruru, Elkena bakwuru nwunye ya Hana, Onyenwe anyị chetakwara ya. Mgbe oge ruru, o mere ka Hana tụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ gụrụ ya Samuel, nʼihi na ọ sịrị, “Arịrịọ m Onyenwe anyị maka ya.”Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike