Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Matiu 7:12

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Matiu 7:12

Ya mere, nʼime ihe niile, na-emeso ndị mmadụ dị ka i si chọọ ka ha mesoo gị. Nke a bụ nchịkọta ihe iwu na ndị amụma ziri.

Gụọ isi ahụ dum: Matiu 7

N’ọnọdụ ya

9“Ọ dị onye nʼime unu, ma ọ bụrụ na nwa ya arịọọ ya achịcha, ga-enye ya okwute?

10Maọbụ, nwata ahụ arịọọ azụ, o nye ya agwọ?

11Ya mere, ebe unu ndị ọjọọ maara otu e si enye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu bi nʼeluigwe ọ gaghị enye unu karịa, ma ọ bụrụ na unu arịọọ ya!

12Ya mere, nʼime ihe niile, na-emeso ndị mmadụ dị ka i si chọọ ka ha mesoo gị. Nke a bụ nchịkọta ihe iwu na ndị amụma ziri.

13“Sitenụ nʼọnụ ụzọ dị warawara banye. Nʼihi na ọnụ ụzọ ahụ dị obosara. Mbara ka ụzọ ahụ dịkwa na-eduba nʼịla nʼiyi. Ọtụtụ na-esoro ya.

14Ole na ole na-achọta ụzọ ahụ na-eduba na ndụ, nʼihi na ọ dị warawara, dịkwa nkpagide.

15“Kpachapụnụ anya! Nʼihi na ndị amụma ụgha dị. Ha na-abịakwute unu nʼụdịdị atụrụ, ma ha bụ agụ.

Matiu 7

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleMatthew 7:12In everything, then, do to others as you would have them do to you. For this is the essence of the Law and the Prophets.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Luk 6:31Dịka unu si chọọ ka ndị mmadụ mesoo unu, sitekwanụ otu a na-emeso ha.
Rom 13:8–10Kwụọnụ ụgwọ niile unu ji. Ka ụgwọ unu ga-ejide ndị mmadụ bụrụ ụgwọ ịhụ ha nʼanya. Nʼihi na mgbe ị na-ahụ ndị mmadụ nʼanya, ị na-emezu ihe niile iwu chọrọ. Iwu niile e nyere, “Gị akwala iko,” “Egbula mmadụ,” “Ezula ohi,” “Enwela anya ukwu nʼihe mmadụ ibe gị nwere,” nakwa iwu ndị ọzọ niile e nyere ka a chịkọtara nʼotu nke a sịrị: “Hụ mmadụ ibe gị nʼanya dịka onwe gị.” Ịhụnanya adịghị echere onye agbataobi ya echiche ọjọọ, ya mere ịhụnanya bụ idebezu iwu niile.
Gal 5:13–14Nʼihi na e meela ka unu nwere onwe unu, ụmụnna m, ma unu ekwela ka mnwere onwe unu bụrụ ohere nye anụ ahụ unu, kama werenụ ịhụnanya na-agbara ibe unu odibo. Nʼihi na ọ bụrụ na a chịkọta iwu niile nʼotu, ihe iwu niile na-ekwu bụ nke a, “Na-ahụnụ ndị ọzọ nʼanya dịka unu si hụ onwe unu nʼanya.”
Lev 19:18“ ‘Abọla ọbọ, ebukwala iro nʼobi megide onye ọbụla nʼetiti ndị gị. Kama hụ onye agbataobi gị nʼanya dịka i si hụ onwe gị nʼanya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị unu.
Mak 12:29–34Jisọs zara ya sị, “Nke kachasị mkpa bụ nke a, ‘Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu. Were obi gị niile na mkpụrụobi gị niile na uche gị niile na ike gị niile hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya.’ Nke abụọ ya bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’ Ọ dịghị iwu ọzọ dị nke karịrị ndị a.” Onye ode akwụkwọ ahụ sịrị ya, “Onye ozizi, nʼezie, ị zara nke ọma na Chineke bụ otu, na enweghịkwa chi ọzọ dị karịa ya. Ịhụ ya nʼanya site nʼiji obi gị niile, na nghọta gị niile, nakwa iji ike gị niile, nʼịhụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị, kachasị onyinye aja nsure ọkụ na ịchụ aja niile.” Mgbe Jisọs hụrụ na ọ zara nke ọma, ọ gwara ya sị, “Ị nọ alaeze Chineke nso.” Site na mgbe ahụ ọ dịkwaghị onye ọbụla nwere obi ike ịjụ ya ajụjụ ọzọ.
Mat 22:39–40Iwu ọzọ na-eso nke a nʼịdị mkpa bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka i si hụ onwe gị nʼanya.’ Iwu ndị ọzọ niile na ihe niile ndị amụma kwuru dabeere nʼebe iwu abụọ ndị a nọ.”
Mai 6:8Nʼihi na o gosila gị, gị mmadụ, ihe dị mma. Gịnịkwa bụ ihe ahụ Onyenwe anyị na-achọ nʼaka gị, Ọ bụ na ọ bụghị ikpe ziri ezi, na ịhụ ime ebere nʼanya, na iji obi dị umeala soro Chineke gị na-eje ije?
Zek 8:16–17Ihe ndị a ka unu ga-eme: Kwuonụ eziokwu nye ibe unu, kpeenụ ikpe eziokwu nʼụlọikpe unu, nke a na-eweta udo. Unu echela echiche ọjọọ megide ibe unu; unu ahụla ịṅụ iyi ụgha nʼanya. Ihe ndị a niile ka m kpọrọ asị,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike