Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Abụ Ọma 34:17–20

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Abụ Ọma 34:17–20

17Onyenwe anyị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka; ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile.

18Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso, ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ.

19Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu, ma Onyenwe anyị na-anapụta ha site na nsogbu ndị ahụ niile.

20Ọ na-anapụtakwa ha kpamkpam. Ọ gaghị ekwe ka ọ bụladị otu ọkpụkpụ dị ha nʼahụ gbajie.

Gụọ isi ahụ dum: Abụ Ọma 34

N’ọnọdụ ya

14Site nʼihe ọjọọ wezuga onwe gị ma mee ezi ihe, chọọ udo ma gbasookwa ya.

15Anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume, ntị ya gheekwa oghe nye mkpu akwa ha;

16ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ, ime ka a hapụ ichetakwa ihe banyere ha nʼụwa.

17Onyenwe anyị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka; ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile.

18Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso, ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ.

19Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu, ma Onyenwe anyị na-anapụta ha site na nsogbu ndị ahụ niile.

20Ọ na-anapụtakwa ha kpamkpam. Ọ gaghị ekwe ka ọ bụladị otu ọkpụkpụ dị ha nʼahụ gbajie.

21Ihe ọjọọ ga-eme ka onye ajọ omume nwụọ; ndị na-akpọ onye ezi omume asị ka a ga-ama ikpe ọnwụ.

22Onyenwe anyị na-agbapụta ndị ohu ya; ọ dịghị onye ọbụla nke na-agbaba nʼime ya a ga-ama ikpe ọnwụ.

Abụ Ọma 34

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BiblePsalm 34:17–20The righteous cry out, and the LORD hears; He delivers them from all their troubles. The LORD is near to the brokenhearted; He saves the contrite in spirit. Many are the afflictions of the righteous, but the LORD delivers him from them all. He protects all his bones; not one of them will be broken.

E hotara ya n’Agba Ọhụrụ

Jọn 19:36Ihe ndị a niile mere ka e mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, “Ọ dịghị ọkpụkpụ ya ọbụla nke a ga-agbaji.”

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Abụ 147:3Ọ na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa na-ekechikọtakwa ebe niile ha merụrụ ahụ.
Abụ 145:18Onyenwe anyị na-anọ nso ndị niile na-akpọku ya, bụ ndị niile na-akpọku ya nʼeziokwu.
Aịz 57:15Nʼihi ihe a ka onye dị elu, onye e mere ka ọ dị ukwuu, onye dị mgbe ebighị ebi, onye aha ya dị nsọ kwuru: “Ebi m nʼebe dị elu nke dịkwa nsọ, ibinyere onye dị umeala nʼobi, na onye wedara mmụọ ya nʼala, itute mmụọ nke onye e wedara nʼala, na ịkpọlite mmụọ nke onye dị umeala nʼobi.
Aịz 61:1Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dị nʼahụ m, nʼihi na Onyenwe anyị eteela m mmanụ ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye. O zitela m ịkasị ndị obi ha tiwara etiwa obi, ikwupụta inwere onwe nye ndị a dọtara nʼagha, na ntọghapụ site nʼọchịchịrị nye ndị mkpọrọ.
Abụ 51:17Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa, O Chineke, ị naghị elefu anya, nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị.
1Pt 4:12–13Ụmụnna m, ka ọ hapụ iju unu anya mgbe ọnwụnwa dị iche iche na-abịara unu nʼihi na ihe dị otu a abụghị ihe ọhụrụ nʼebe unu nọ. Kama ṅụrịanụ ọṅụ nʼihi na unu so Kraịst na-eketa oke nʼahụhụ ya, ka e sikwa otu a mee ka obi unu jupụta nʼọṅụ, unu ga-etikwa mkpu ọṅụ mgbe a ga-eme ka ebube ya pụta ìhè.
Izk 36:26Aga m enye unu obi ọhụrụ, kenyekwa unu mmụọ ọhụrụ. Aga m ewepụ obi nkume nke mmehie dị nʼime unu, nye unu mkpụrụobi nke anụ ahụ.
Abụ 34:6Onye ogbenye a kpọkuru Onyenwe anyị, ọ zakwara ya; ọ zọpụtara ya site na nsogbu ya niile.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike