Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Abụ Ọma 23
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Abụ Ọma 23
1Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m.
2Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto, ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ,
3ọ na-atụte mkpụrụobi m. Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume nʼihi aha ya.
4A sịkwarị na m na-aga ije, na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ, agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla; nʼihi na ị nọnyeere m, mkpọrọ gị na mkpanaka gị na-akasị m obi.
5Ị na-akwado tebul nʼihu m, nʼanya ndị iro m. I tere isi m mmanụ iko m na-ejubiga oke.
6Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m ogologo ụbọchị niile nke ndụ m, m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị mgbe niile ebighị ebi.
N’asụsụ Bekee
A Psalm of David. The LORD is my shepherd; I shall not want. He makes me lie down in green pastures; He leads me beside quiet waters. He restores my soul; He guides me in the paths of righteousness for the sake of His name. Even though I walk through the valley of the shadow of death, I will fear no evil, for You are with me; Your rod and Your staff, they comfort me. You prepare a table before me in the presence of my enemies. You anoint my head with oil; my cup overflows. Surely goodness and mercy will follow me all the days of my life, and I will dwell in the house of the LORD forever.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ọ bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu niile, site nʼụlọakụ ebube ya nke eluigwe, nʼihi Kraịst Jisọs.“Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma. Ezi onye ọzụzụ atụrụ na-atọgbọ ndụ ya nʼihi atụrụ ya.Ọ ga-azụ igwe atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ. Ọ na-achịkọta ụmụ atụrụ. Nʼaka ya abụọ ka ọ ga-ekuru ụmụ atụrụ nʼobi ya. Ọ ga-eji nwayọọ duo ndị na-enye ụmụ ara.Atụrụ m na-anụ olu m. Amaara m ha, ha na-esokwa m. Ana m enye ha ndụ ebighị ebi. Ha agaghị ala nʼiyi. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike ịpụnarị ha nʼaka m. Nna m onye nyere m ha dị ukwuu karịa ihe niile. O nweghị onye nwere ike ịnapụ ha site nʼaka Nna m. Mụ na nna m bụ otu.”“Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma; amaara m atụrụ m, atụrụ nke m makwaara m.Nʼihi na Nwa Atụrụ ahụ nke nọ nʼetiti ocheeze ahụ ga-abụ onye ọzụzụ atụrụ ha; ‘ọ ga-edurukwa ha jee nʼisi mmiri nke ndụ ahụ.’ ‘Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri ọbụla site nʼanya ha.’”Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu. Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka; aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu.Ma burunu ụzọ chọọ alaeze ya na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike