Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Abụ Ọma 139:13–16

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Abụ Ọma 139:13–16

13Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ. Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m.

14Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee; ọrụ gị niile dị ebube; amaara m nke a nke ọma.

15Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ, mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa.

16Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla. E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị tupu otu nʼime ha adịrị.

Gụọ isi ahụ dum: Abụ Ọma 139

N’ọnọdụ ya

10ọ bụladị nʼebe ahụ ka aka gị ga na-edu m aka nri gị ga-ejidesi m ike.

11Ọ bụrụ na m asị, “Nʼezie, ọchịchịrị ga-ekpuchi m ìhè ga-aghọ abalị gbaa m gburugburu.”

12Ọ bụladị ọchịchịrị agaghị abụ ọchịchịrị nʼebe ị nọ; abalị ga-enye ìhè dịka ehihie, nʼihi na ọchịchịrị dị ka ìhè nʼebe ị nọ.

13Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ. Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m.

14Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee; ọrụ gị niile dị ebube; amaara m nke a nke ọma.

15Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ, mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa.

16Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla. E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị tupu otu nʼime ha adịrị.

17Lee ka echiche ị na-eche banyere m si dị oke ọnụahịa, o Chineke! Leekwa ka ha si dị ukwuu.

18Ọ bụrụ na m agụọ ha ọnụ, ha ga-adị ukwuu karịa ọnụọgụgụ aja dị nʼala. Mgbe m tetara, mụ na gị ka nọ.

19O Chineke, a sịkwarị na ị ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi! Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-akwafu ọbara!

Abụ Ọma 139

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BiblePsalm 139:13–16For You formed my inmost being; You knit me together in my mother’s womb. I praise You, for I am fearfully and wonderfully made. Marvelous are Your works, and I know this very well. My frame was not hidden from You when I was made in secret, when I was woven together in the depths of the earth. Your eyes saw my unformed body; all my days were written in Your book and ordained for me before one of them came to be.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Jen 1:26–27Mgbe ahụ, Chineke kwuru sị, “Ka anyị mee mmadụ nʼoyiyi anyị, dịka ụdịdị anyị si dị, ka ha chịa azụ niile nke osimiri, na anụ ufe niile nke eluigwe, na anụ ụlọ niile, na anụ ọhịa niile, na ihe niile e kere eke nwere ndụ nke na-akpụ akpụ nʼala.” Ya mere, Chineke kere mmadụ nʼoyiyi nke ya, nʼoyiyi Chineke ka o kere ha, nwoke na nwanyị ka o kere ha.
Jer 1:5“Amaara m gị tupu a tụrụ ime gị, tupu a mụọ gị, edoro m gị nsọ, ahọpụtakwara m gị dịka onye amụma nye mba niile.”
Abụ 111:2Ọrụ niile Onyenwe anyị na-arụ dị ukwuu; ndị niile na-enwe mmasị na ha na-atụgharị uche nʼime ha.
Abụ 104:24Onyenwe anyị, ọrụ aka gị dị ọtụtụ. Ọ bụ site nʼamamihe ka i ji kee ha. Elu ụwa niile jupụtara nʼihe niile i kere eke.
Abụ 119:73Aka gị kere m, kpụọkwa m; nye m nghọta ka m mụta iwu gị niile.
Aịz 44:2Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu, bụ onye kere unu, onye kpụrụ unu nʼime nʼafọ, na onye ga-enyere unu aka: Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m, atụkwala egwu gị Jeshurun, onye nke m họpụtara.
Abụ 92:4–5Nʼihi na ị na-eme ka obi dị m ụtọ, site nʼọrụ gị niile, o Onyenwe anyị, Ọ bụ ya mere m ji na-abụ abụ ọṅụ. Lee ka ọrụ gị si dị ukwuu, Onyenwe anyị. Leekwa ụdị echiche miri emi ị na-eche.
Job 31:15Ọ bụ na ọ bụghị onye kpụrụ m nʼafọ nne m mekwara ha? Ọ bụghị ya kpụrụ anyị abụọ nʼafọ nne anyị?

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike