Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Ndị Kọrint 15:33
Amaokwu Baịbụl · IGCB
1 Ndị Kọrint 15:33
Unu ekwela ka e duhie unu. Nʼihi na mkparịkọta agwa ọjọọ na-emebi ezi agwa.
Gụọ isi ahụ dum: 1 Ndị Kọrint 15
N’ọnọdụ ya
30Gịnị mere anyị ji nọrọ nʼize ndụ nʼoge awa ọbụla?
31Nʼịgwa unu eziokwu, ụmụnna m, ana m ezute ọnwụ kwa ụbọchị. Ihe m ji kwupụta nke a bụ nʼihi ịnya isi nke m ji unu anya nʼime Jisọs Kraịst, Onyenwe anyị.
32Ọ bụrụ na ndụ anyị na-agwụ nʼụwa a, dịka ndị mmadụ na-ekwu, gịnị bụkwanụ uru m nwere nʼihi ọgụ m na-alụso anụ ọhịa, bụ ndị ikom Efesọs? Ọ bụrụ na a gaghị eme ka ndị nwụrụ anwụ bilie, “Ka anyị rienụ, ṅụọkwanụ, nʼihi na echi anyị ga-anwụ.”
33Unu ekwela ka e duhie unu. Nʼihi na mkparịkọta agwa ọjọọ na-emebi ezi agwa.
34Sitenụ na ndụ enweghị nghọta unu lọghachita dịka unu kwesiri, unu emehiekwala ọzọ. Nʼihi na-enwere ụfọdụ bụ ndị na-amaghị Chineke. Ana m ekwu nke a ka ihere mee unu.
35Ma ụfọdụ ga-ajụ, “Olee otu a ga-esi mee ka onye nwụrụ anwụ bilie? Olee ụdị ahụ ha ga-enwe mgbe ha ga-apụta?”
36Onye nzuzu! Mkpụrụ ọka i tinyere nʼala agaghị epu ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ nwụọ.
N’asụsụ Bekee
Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Na-eso ndị maara ihe ka ị ghọọ onye mara ihe, nʼihi na onye na-eso ndị nzuzu na-aba na nsogbu.Jisọs zara ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie unu ụzọ.Ịnya isi unu ezighị ezi. Ọ bụ unu amaghị na nwantakịrị yiist a gwakọrọ nʼụtụ ọka na-eme ka o koo?Hapụnụ ụzọ enweghị uche unu, ka unu were dị ndụ; gbasokwanụ ụzọ mmụọ ịghọta ihe.”Unu ekwela ka onye ọbụla jiri okwu efu duhie unu. Ọ bụ nʼihi omume ọjọọ ndị a ka iwe Chineke ji abịakwasị ndị na-anaghị erubere ya isi.Unu ekwela ka e duhie unu, nʼihi na mmadụ ọbụla apụghị ịkwa Chineke emo. Mkpụrụ ọbụla mmadụ kụrụ ka ọ na-aghọrọ.Zere onwe gị nʼokwu nzuzu nke rụrụ arụ, nʼihi na ọ na-aga nʼihu iduba ndị mmadụ nʼọnọdụ amaghị Chineke karịa. Ozizi ha ga-agbasa dị ka nsị, Haimeniọs na Filetus soo na ndị dị otu a. Ha ahapụla ịgbaso ụzọ eziokwu ahụ bido na-ekwusa okwu ụgha, na-asị na oge mbilite nʼọnwụ agafeela. Site nʼokwu ha, ha na-ekpu okwukwe mmadụ ụfọdụ ihu nʼala.Ọ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ajọ omume dị otu a enweghị oke ọbụla nʼalaeze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu. Nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla na-akwa iko, na ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwunye na-akwa iko, na ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko,Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike