Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Abụ Ọma 119:105

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Abụ Ọma 119:105

Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m bụrụkwa ìhè nʼụzọ m.

Gụọ isi ahụ dum: Abụ Ọma 119

N’ọnọdụ ya

102Ewezugaghị m onwe m nʼiwu gị niile, nʼihi na ọ bụ gị onwe gị ziri m ha.

103Lee ka okwu gị niile si atọ m ụtọ, ha dị ụtọ nʼọnụ m karịa mmanụ aṅụ!

104A na-enweta nghọta site nʼụkpụrụ gị niile; ya mere ana m akpọ ụzọ ọjọọ ọbụla asị.

105Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m bụrụkwa ìhè nʼụzọ m.

106Aṅụọla m iyi, mee ka o guzosie ike, na aga m agbaso iwu ezi omume gị niile.

107Ataala m ahụhụ nke ukwuu; chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka okwu gị si dị.

108O Onyenwe anyị, nabata otuto afọ ofufu niile nke si nʼọnụ m, kuziekwara m iwu gị niile.

Abụ Ọma 119

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BiblePsalm 119:105Your word is a lamp to my feet and a light to my path.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Ilu 6:23Nʼihi na iwu a bụ oriọna, Ihe ozizi a bụkwa ìhè, otu a kwa ịdọ aka na ntị na ịba mba bụ ụzọ ezi ndụ,
Abụ 43:3Zipụ ìhè gị na eziokwu gị, ka ha duo m; ka ha kpọbata m nʼugwu nsọ gị, bụ ebe i bi.
Abụ 18:28Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, na-eme ka oriọna m na-enwu, Chineke m na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè.
2Pt 1:19Anyị nwapụtara na okwu ndị amụma ahụ bụ ihe mezuru emezu. Unu onwe unu kwesikwara ilezi anya nʼokwu ndị ahụ, dịka a ga-asị na ha bụ ìhè na-enwu nʼebe ọchịchịrị gbara nke na-adị ruo mgbe chi bọrọ, mgbe e mere ka kpakpando ọtụtụ walie nʼobi unu.
Job 29:3mgbe oriọna ya na-achakwasị m nʼisi ìhè ya ka m ji jee ije nʼọchịchịrị.
Abụ 19:8Iwu Onyenwe anyị ziri ezi, ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ. Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke, ọ na-enye anya ìhè.
Efe 5:13Mgbe a gbara ihe ọbụla nʼanwụ, ọ na-apụta ìhè nke ọma. Nʼihi na ihe ọbụla e mere ka ọ pụta ìhè nke ọma bụ ìhè.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike