Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jọn 1:1

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Jọn 1:1

Na mbụ okwu ahụ dịrịị, okwu ahụ na Chineke nọ, okwu ahụ bụkwa Chineke.

Gụọ isi ahụ dum: Jọn 1

N’ọnọdụ ya

1Na mbụ okwu ahụ dịrịị, okwu ahụ na Chineke nọ, okwu ahụ bụkwa Chineke.

2Ya na Chineke nọ site na mbụ.

3E sitere na ya kee ihe niile, ọ dịghịkwa ihe ọbụla e kere eke nke a na-ekeghị site na ya.

4Nʼime ya ka ndụ dịrịị, ndụ ahụ bụkwa ìhè nye mmadụ niile,

Jọn 1

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleJohn 1:1In the beginning was the Word, and the Word was with God, and the Word was God.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Jen 1:1Na mmalite Chineke kere eluigwe na ụwa.
Jọn 17:5Ma ugbu a, Nna, nye m otuto nʼihu gị, ụdị otuto ahụ m nwere nʼihu gị tupu e kee ụwa.
Mkp 19:13E gbokwasịrị ya uwe mwụda e denyere nʼọbara. Aha a na-akpọ ya bụ Okwu Chineke.
Kọl 1:17Ya onwe ya nọ tupu ekee ihe niile, ọ bụkwa nʼime ya ka ejikọtara ihe niile nʼotu.
Jọn 1:14Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ birikwa nʼetiti anyị. Anyị ahụla ebube ya, ebube nke onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ, onye si nʼebe Nna nọ bịa, onye jupụtara nʼamara na eziokwu.
1Jọn 1:1–2Ihe anyị na-edere unu banyere ya bụ ihe ahụ na-adịrị site na mmalite, nke anyị nụrụ, nke anyị jikwa anya anyị hụ, nke anyị lekwasịrị anya, na nke aka anyị metụrụ. Anyị na-ekwu ihe banyere Okwu nke ndụ ahụ. Ndụ ahụ pụtara ihe. Anyị ahụla ya ma gbaakwa ama banyere ya. Ya mere, ihe anyị na-ekwu okwu ya, na ihe anyị na-akọrọ unu bụ banyere ndụ ebighị ebi ahụ nke ya na Nna nọ na mbụ; nke e mere ka ọ pụta ìhè nye anyị.
Mkp 22:13Abụ m Alfa na Omega. Onye mbụ na Onye ikpeazụ, Mmalite na Ọgwụgwụ.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike