Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jọn 4:24
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Jọn 4:24
Chineke bụ mmụọ ndị niile na-efe ya ga-eferịrị ya nʼime mmụọ na eziokwu.”
N’ọnọdụ ya
21Jisọs sịrị ya, “Nwanyị kwere okwu m, oge na-abịa mgbe ị na-agaghị akpọ isiala nye Nna, maọbụ nʼugwu a ma ọ bụkwanụ na Jerusalem.
22Unu na-efe ihe unu na-amaghị ma anyị na-efe ihe anyị matara, nʼihi na nzọpụta sitere nʼaka ndị Juu.
23Ma oge na-abịa, ugbu a ọ bịala, mgbe ndị na-efe Nna ahụ nʼeziokwu ga-efe ya nʼime mmụọ na nʼeziokwu. Nʼihi na ọ bụ ndị dị otu a ka Nna chọrọ ka ha na-efe ya.
24Chineke bụ mmụọ ndị niile na-efe ya ga-eferịrị ya nʼime mmụọ na eziokwu.”
25Nwanyị ahụ sịrị ya, “Amaara m na Mezaya” (onye a na-akpọ Kraịst) “na-abịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-akọwaziri anyị ihe niile.”
26Jisọs sịrị ya, “Mụ, onye na-agwa gị okwu, abụ m ya.”
27Nʼoge ahụ ndị na-eso ụzọ ya lọghachitara. Ọ gbagwojukwara ha anya nke ukwuu ịhụ na ya na nwanyị na-ekwurịta okwu. Ma o nweghị onye nʼime ha jụrụ nwanyị ahụ sị, “Gịnị ka ị chọrọ?” ma ọ bụkwanụ, “Gịnị kpatara gị na ya ji na-ekwurịta okwu?”
N’asụsụ Bekee
God is Spirit, and His worshipers must worship Him in spirit and in truth.”Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Mmụọ, ma ebe ọbụla kwa Mmụọ Onyenwe anyị nọ, nʼebe ahụ ka mmadụ pụrụ inwere onwe ya.“ ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ. Ofufe ha na-efe m bụ ihe efu, ozizi ha bụkwa ihe mmadụ nyere nʼiwu.’ ”Nʼihi na ọ bụ anyị bụ ndị ezi obibi ugwu ahụ, ọ bụghị ha, nʼihi na anyị bụ ndị na-efe Chineke site na Mmụọ ya. Anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime Kraịst Jisọs. Anyị adịghị atụkwasị obi nʼihe e mere nʼanụ ahụ.Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa, O Chineke, ị naghị elefu anya, nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị.Nʼihi ihe a ka onye dị elu, onye e mere ka ọ dị ukwuu, onye dị mgbe ebighị ebi, onye aha ya dị nsọ kwuru: “Ebi m nʼebe dị elu nke dịkwa nsọ, ibinyere onye dị umeala nʼobi, na onye wedara mmụọ ya nʼala, itute mmụọ nke onye e wedara nʼala, na ịkpọlite mmụọ nke onye dị umeala nʼobi.Ma Onyenwe anyị zara Samuel sị ya, “Ejila ihu mmadụ maọbụ ito ogologo ya ekpebi, nʼihi na onye a abụghị ya. Onyenwe anyị adịghị ahụ ihe dịka mmadụ si ahụ. Mmadụ na-ele anya nʼelu ahụ, ma Onyenwe anyị na-ele anya nʼobi.”Ugbu a, ka enye Eze ahụ na-adị ruo mgbe niile, Onye na-adịghị anwụ anwụ, Onye a na-adịghị ahụ anya, Onye naanị ya bụ Chineke, nsọpụrụ na otuto ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.Ọ bụrụ na mmehie na-amasị m nʼime obi m, Onyenwe anyị agaraghị ege m ntị;Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike