Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Levitikọs 20:6
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Levitikọs 20:6
“ ‘Aga m edo ihu m megide onye ọbụla gara jụọ ase site nʼaka mmụọ ọjọọ, maọbụ onye gara na dibịa afa gbaa afa, site nʼiso ha kwaa iko. Aga m ekewapụ onye ahụ site nʼetiti ndị ya.
N’ọnọdụ ya
3Mụ onwe m ga-emegide onye ahụ, bipụ ya site nʼetiti ndị ya, nʼihi na o merụọla ebe nsọ m, mee ka aha m gharakwa ịdị nsọ, site nʼiji ụmụ ya chụọrọ Molek aja.
4Ọ bụrụ na ndị obodo elezie anya mee omume dịka a ga-asị na ha amaghị ihe onye ahụ mere, hapụkwa igbu ya, mgbe o were otu nʼime ụmụ ya nye Molek,
5mụ onwe m ga-emegide onye ahụ na ezinaụlọ ya bipụ ha site nʼetiti ndị ya. Otu a kwa ka m ga-eme ya na ndị niile so ya merụọ onwe ha site nʼife arụsị Molek.
6“ ‘Aga m edo ihu m megide onye ọbụla gara jụọ ase site nʼaka mmụọ ọjọọ, maọbụ onye gara na dibịa afa gbaa afa, site nʼiso ha kwaa iko. Aga m ekewapụ onye ahụ site nʼetiti ndị ya.
7“ ‘Doonụ onwe unu nsọ, ma dịkwanụ nsọ nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
8Debenụ ụkpụrụ m niile, ma gbasoonụ ha nʼihi na abụ m Onyenwe anyị onye na-edo unu nsọ.
9“ ‘Onye ọbụla kọchara nne ya maọbụ nna ya ka a ga-egbu nʼihi na ọ kọchara nne na nna ya. Ọbara onye dị otu a ga-adịkwa ya nʼisi.
N’asụsụ Bekee
Whoever turns to mediums or spiritists to prostitute himself with them, I will also set My face against that person and cut him off from his people.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
“ ‘Unu ejekwurula ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase maọbụ chọgaa ndị dibịa afa, nʼihi na unu ga-emerụ onwe site na ha. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike