Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jọn 14:6
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Jọn 14:6
Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m.
N’ọnọdụ ya
3Ọ bụrụ na m agaa dozichara unu ebe obibi, aga m alọghachi bịa kpọrọ unu, ka ebe m nọ bụrụkwa ebe unu ga-anọ.
4Unu maara ụzọ ebe m na-aga.”
5Tọmọs sịrị ya, “Onyenwe anyị, anyị amaghị ebe ị na-aga, olee otu anyị ga-esi mata ụzọ ya?”
6Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m.
7Ọ bụrụ na unu maara onye m bụ, unu gaara amatakwa Nna m. Site ugbu a, unu amatala ya. Ma hụkwa ya.”
8Filip sịrị ya, “Onyenwe anyị, zi anyị Nna ahụ, afọ ga-ejukwa anyị.”
9Jisọs sịrị ya, “Ọtụtụ oge ndị a mụ na unu nọrọ ọ bụ na ị matabeghị onye m bụ, Filip? Onye ọbụla hụrụ m ahụla Nna. Olee otu i si asị, ‘zi anyị Nna ahụ?’
N’asụsụ Bekee
Jesus answered, “I am the way and the truth and the life. No one comes to the Father except through Me.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Nzọpụta adịghị nʼime onye ọbụla ọzọ, nʼihi na o nweghị aha ọzọ e nyere nʼetiti mmadụ nʼokpuru eluigwe nke e nwere ike isite na ya zọpụta anyị.”Mụ onwe m bụ ụzọ. Onye ọbụla sitere na m banye, a ga-azọpụta ya. Ọ ga na-apụ na-abata na-achọtakwa nri.Nʼihi na anyị abụọ sitere nʼaka ya nweta nnabata anyị ịbịa nʼihu Nna site nʼotu Mmụọ ahụ.Jisọs gwara ya, “Mụ onwe m bụ mbilite nʼọnwụ na ndụ. Onye ọbụla kwere na m, a sịkwarị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ. Ma onye ọbụla dị ndụ nke na-ekwere na m agaghị anwụ. Ị kwere nke a?”Nʼime ya ka ndụ dịrịị, ndụ ahụ bụkwa ìhè nye mmadụ niile,Anyị matakwara na Ọkpara Chineke abịala, nyekwa anyị nghọta ka anyị mara ya, onye bụ eziokwu. Anyị nọ nʼime onye ahụ bụ eziokwu, ọ bụladị nʼime Ọkpara ya, bụ Jisọs Kraịst. Ya onwe ya bụ ezi Chineke bụrụkwa ndụ ebighị ebi.Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ birikwa nʼetiti anyị. Anyị ahụla ebube ya, ebube nke onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ, onye si nʼebe Nna nọ bịa, onye jupụtara nʼamara na eziokwu.Ama ahụ bụkwa nke a, na Chineke enyela anyị ndụ ebighị ebi, ndụ a dịkwa nʼime Ọkpara ya. Onye ọbụla nwere Ọkpara ahụ nwere ndụ ma onye ọbụla na-enweghị Ọkpara Chineke enweghị ndụ.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike