Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ilu 18:22

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ilu 18:22

Nwoke ahụ chọtara nwunye chọtara ezi ihe. Ọ na-anatakwa ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị.

Gụọ isi ahụ dum: Ilu 18

N’ọnọdụ ya

19Ọ dị mfe ịlụgbụ obodo karịa ime ka obi nwanne e mehiere tụgharịa. Iwe ya na-adị ike dịka ọnụ ụzọ e jiri igodo tụchie.

20Site na mkpụrụ nke okwu ọnụ mmadụ mịpụtara ka afọ ga-eji ju ya. Sitekwa nʼihe owuwe ubi nke egbugbere ọnụ ha ka ha ga-eji rijuo afọ.

21Ike ọnwụ na ndụ dị ire nʼaka. Ndị hụrụ ya nʼanya ga-eri mkpụrụ ya.

22Nwoke ahụ chọtara nwunye chọtara ezi ihe. Ọ na-anatakwa ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị.

23Onye ogbenye na-arịọ arịrịọ maka ebere; ma ọgaranya na-asa okwu ike ike.

24Onye nwere ọtụtụ ndị enyi ndị na-ekwesighị ga-abịa nʼịla nʼiyi mgbe na-adịghị anya, ma ọ dị enyi nke na-arapara nso karịa nwanne.

Ilu 18

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleProverbs 18:22He who finds a wife finds a good thing and obtains favor from the LORD.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Ilu 19:14Ụlọ dị iche iche na akụ bụ ihe nketa a na-anata nʼaka ndị nne na nna, ma nwunye nwere uche na nghọta na-esite naanị nʼaka Onyenwe anyị.
Ilu 12:4Ezi nwanyị bụ ọṅụ na okpueze di ya, ma nwanyị na-eweta ihere dịka ire ure nʼọkpụkpụ di ya.
Ekl 9:9Bie ndụ obi ụtọ, gị na nwunye gị ị hụrụ nʼanya, ụbọchị niile nke ndụ ihe efu gị nke Chineke nyere gị nʼokpuru anyanwụ, nʼihi na nke a bụ oke dịịrị gị na ndụ ndọgbu onwe gị nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ.
1Kọ 7:2Ma nʼihi ọtụtụ ihe omume banyere ịkwa iko, ka nwoke ọbụla nwee nwunye nke aka ya, nwanyị ọbụla di nke aka ya.
Jen 2:18Onyenwe anyị Chineke kwuru sị, “Ọ dịghị mma ka nwoke nọrọ naanị ya. Aga m emere ya onye inyeaka nke kwesiri ya.”
Hos 12:12Jekọb gbalagara nʼala Aram; Izrel fere ofufe nʼihi inweta nwunye, nʼihi ịkwụ ụgwọ ya, o lekọtara atụrụ.
Ilu 8:35nʼihi na onye ọbụla chọtara m chọtara ndụ; ọ natakwala ihuọma nʼebe Onyenwe anyị nọ.
Jen 29:20–21Ya mere Jekọb gbara odibo afọ asaa maka Rechel. Ma afọ asaa ndị a dịka abalị ole na ole nʼanya Jekọb nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe Rechel nọ. Jekọb gwara Leban, okwu sị ya, “Kpọnye m nwunye m nʼihi nʼụbọchị m ezuola. Achọrọ m ịbakwuru ya.”

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike